text target Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Joseph Achuzie, Dike Biafra alala Joseph Achuzie, Dike Biafra alala Dapchi: Goomenti emeribeghi Boko Haram - Massob Dapchi: Gọọmenti emeribeghị Boko Haram - Massob Tottenham na-ele anya iburu iko FA na mmeri Rochadale Tottenham na-ele anya iburu iko FA na mmeri Rochadale Son Heung-min, Fernando Llorente na Kyle Walter-Peters nke Tottenham bu ndi mmechiri onu Rochadale n'asompi unyaahu. Son Heung-min, Fernando Llorente na Kyle Walter-Peters nke Tottenham bụ ndị mmechiri ọnụ Rochadale n'asọmpị ụnyaahụ. Son Heung-min onye Tottenham na ndi otu ya na-nwe anuri mgbe o nyere goolu n'asompi iko FA. Son Heung-min onye Tottenham na ndị otu ya na-nwe anụrị mgbe o nyere goolu n'asọmpị iko FA. Tottenham emerila n'asompi iko FA ugboro asato Tottenham emerila n'asọmpị iko FA ugboro asatọ N'egwuregwu, ndi otu Tottenham gbara ndi Rochadale okpu goolu isii asatara otu n'asompi FA. N'egwuregwu, ndị otu Tottenham gbara ndị Rochadale ọkpụ goolu isii asatara otu n'asọmpi FA. Mmeri a putara na Tottenham na otu Swansea ga-aso mpi Quarter Final n'iko FA a ga-agba n'ubochi 17 nke onwa Maachi. Mmeri a pụtara na Tottenham na otu Swansea ga-asọ mpi Quarter Final n'iko FA a ga-agba n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị. Son Heung-min nyere goolu nke mbu na nke ise. Fernando Llorente nyere goolu ato n'ime nkeji iri na abuo n'okara nke abuo, ebe Kyle Walter-Peters nyere goolu nke isi. Son Heung-min nyere goolu nke mbụ na nke ise. Fernando Llorente nyere goolu atọ n'ime nkeji iri na abụọ n'okara nke abụọ, ebe Kyle Walter-Peters nyere goolu nke isi. Son Heung-min kwusi boolu otu Rochadale Son Heung-min kwụsị bọọlụ otu Rochadale Gini ga-eme n'ihu? Gịnị ga-eme n'ihu? Tottenham ga-aga ogbo egwuregwu Wembley n'ubochi ato nke onwa Maachi. Ha na Huddersfield ga-aso mpi n'iko Premier League, tupu ha na Juventus ga-asompi nke ha n'iko Champions League n'ubochi asaa n'onwa Maachi. Tottenham ga-aga ọgbọ egwuregwu Wembley n'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị. Ha na Huddersfield ga-asọ mpi n'iko Premier League, tupu ha na Juventus ga-asọmpị nke ha n'iko Champions League n'ụbọchị asaa n'ọnwa Maachị. Otu egwuregwu Rochdale nwere asompi 16 izoputa onwe ha tupu ha baa relegation na league otu. Otu egwuregwu Rochdale nwere asọmpị 16 ịzọpụta onwe ha tụpụ ha baa relegation na league otu. Asompi ha nke mbu ga-abu ha na Plymouth n'ubochi ato n'onwa Maachi. Asompị ha nke mbụ ga-abụ ha na Plymouth n'ụbọchị atọ n'ọnwa Maachị. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Guardiola ebuliela iko ya nke mbu n'England Guardiola ebuliela iko ya nke mbụ n'England Champions League: Neymar arojiela ukwu Champions League: Neymar arọjiela ụkwụ Onyeisi ndi uweojii: Mepe odo ehi tupu i machie ichighari ha Onyeisi ndị uweojii: Mepe ọdọ ehi tupu ị machie ịchịgharị ha Onyeisi ndi uweojii agwala ndi Govano ka buru uzo mepe ebe a na-azu ehi tupu ha machie ichighari ehi n'steeti ha. Onyeisi ndị uweojii agwala ndị Gọvanọ ka bụrụ ụzọ mepe ebe a na-azụ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi n'steeti ha. Ibrahim Idris Ibrahim Idris Onyeisi ndi uweojii bu Ibrahim Idris ekwuola ka steeti buru uzo waputa ala ebemaka ozuzu ehi tupu ha amachie ichighari ehi Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ekwuola ka steeti bụrụ ụzo wapụta ala ebemaka ọzụzụ ehi tupu ha amachie ịchigharị ehi Onyeisi ndi uweojii kwuru nke a unyaahu na kaduna na nzuko ndi nchekwa obodo metutara siri na o ga-enye aka igbara nsogbu na adaputa n'etiti ndi oru ugbo na ndi na-achi ehi. Onyeisi ndị uweojii kwuru nke a ụnyaahụ na kaduna na nzukọ ndị nchekwa obodo metụtara sịrị na ọ ga-enye aka igbara nsogbu na adapụta n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi. O gara n'ihu kwuo na nsogbu daputara na Benue bu maka na goomenti steeti ahu ehibeghi odo ehi tupu ha machie ichighari ehi Ọ gara n'ihu kwuo na nsogbu dapụtara na Benue bụ maka na gọọmenti steeti ahụ ehibeghị ọdọ ehi tupu ha machie ịchịgharị ehi Na nzuko ahu nke isi okwu ya bu, 'Nkwalite obodo: Nsogbu nchekwa na mkpa o di ichota uzo zuru oke ikwusi ya,'nsogbu di n'etiti ndi oru ugbo na ndi na-achi ehi ebidoghi n'oge ochichi onyeisiala bu Muhammdu Buhari. Na nzukọ ahụ nke isi okwu ya bụ, 'Nkwalite obodo: Nsogbu nchekwa na mkpa ọ dị ịchọta ụzọ zuru oke ịkwụsị ya,'nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi ebidoghị n'oge ọchịchị onyeisiala bụ Muhammdu Buhari. Idris kwuru si:'N'uche m, iji belata ogbaaghara di n'etiti ndi oru ugbo na ndi na-achi ehi, goomenti steeti ga-agba mbo wuo ebe ozuzu ehi na steeti ha tupu ha eme iwu ikwusi ichighari ehi. Idris kwuru sị:'N'uche m, iji belata ọgbaaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi, gọọmenti steeti ga-agba mbọ wuo ebe ọzụzụ ehi na steeti ha tupu ha eme iwu ikwụsị ịchịgharị ehi. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ngwa ahia agbaala oku n'Alaba International Ngwa ahịa agbaala ọkụ n'Alaba International Maka Achuzia, anyi ga-ahu na Biafra mezuru' Maka Achuzia, anyị ga-ahụ na Biafra mezuru' N' Imo steeti, ogige umuanumanu nwere otutu anu ohia N' Imo steeti, ogige ụmụanụmanụ nwere ọtụtụ anụ ọhịa Ogige umu anumanu di n'Imo steeti nwere umu anu ohia di icheiche. Ogige ụmụ anụmanụ dị n'Imo steeti nwere ụmụ anụ ọhịa dị icheiche. Umuanumanu di icheiche no n'ogige ha di n' Imo steeti. Ụmụanụmanụ dị icheiche nọ n'ogige ha dị n' Imo steeti. E wukwara umuanumanu ndi a ulo ziri ezi ka ha wee bie ofuma. E wukwara ụmụanụmanụ ndị a ụlọ ziri ezi ka ha wee bie ọfụma. Timothy nwa George Weah ebidola isompi na PSG Timothy nwa George Weah ebidola ịsompi na PSG Timothy Weah agaala PSG ebe nna ya George Weah bu ezigbo onye egwu ama ofuma site na 1992 ruo 1995. Timothy Weah agaala PSG ebe nna ya George Weah bụ ezigbo onye egwu ama ọfụma site na 1992 ruo 1995. Timothy Weah Timothy Weah Timothy Weah o ga-emenwu ofuma ka nna ya dika ndi mmadu si eche? Timothy Weah ọ ga-emenwu ọfụma ka nna ya dịka ndị mmadụ si eche? Nwa onyeisiala Liberia bu George Weah a na-akpo Timothy Weah ebidola igba boolu n'otu egwuruegwu PSG, ebe nna ya gbaburu boolu na mbu. Nwa onyeisiala Liberia bụ George Weah a na-akpọ Timothy Weah ebidola ịgba bọọlụ n'otu egwuruegwu PSG, ebe nna ya gbaburu bọọlụ na mbụ. Timothy putara n'ogbo unyahu ka PSG na Troyes sooro mpi. Timothy pụtara n'ọgbọ ụnyahụ ka PSG na Troyes sọọrọ mpi. Ka Neymar na Kylian Mbappe anoghi n'ogbo maka ahu ha meruru, Angel di Maria na Christopher Nkunku bu ndi nyere goolu PSG ji nwete mmeri n'asompi a. Ka Neymar na Kylian Mbappe anọghị n'ọgbọ maka ahụ ha merụrụ, Angel di Maria na Christopher Nkunku bụ ndị nyere goolu PSG ji nwete mmeri n'asọmpi a. Neymar na Mbappe n'anoghi ya so nye Weah ohere igba n'asompi a. Neymar na Mbappe n'anọghị ya so nye Weah ohere ịgba n'asọmpi a. George Weah nyere goolu 55 oge ogbara boolu na PSG George Weah nyere goolu 55 oge ọgbara bọọlụ na PSG Nna Timothy bu George Weah gbaara ndi PSG boolu tupu n'afo 23 gara aga, tupu o gawa AC Milan. Nna Timothy bụ George Weah gbaara ndị PSG bọọlụ tupu n'afọ 23 gara aga, tupu ọ gawa AC Milan. PSG nwere asompi 10 n'ihu, n'ime nke ha kwesiri inweta onuogugu 17 ma o buru na ha ga-ebuli iko 'French League' nke afo a. PSG nwere asọmpi 10 n'ihu, n'ime nke ha kwesịrị inweta ọnụọgụgụ 17 ma ọ bụrụ na ha ga-ebuli iko 'French League' nke afọ a. Ha na Real Madrid ga-ezuko na Tusde igba agba Champions League nke abuo ha. N'agba nke mbu, Real Madrid ji 3-1 merie ha. Ha na Real Madrid ga-ezukọ na Tusde ịgba agba Champions League nke abụọ ha. N'agba nke mbụ, Real Madrid ji 3-1 merie ha. Onye egwu ha bu Neymar agaghi asompi ozo n'ime 'season' a maka ahu o meruru. Onye egwu ha bụ Neymar agaghị asọmpi ọzọ n'ime 'season' a maka ahụ ọ merụrụ. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Goomenti Naijiria ezipula ugboelu icho umu Dapchi Gọọmenti Naịjirịa ezipụla ụgbọelu ịchọ ụmụ Dapchi Otu nwoke egbuola umuaka ya n'Awada Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Egwu ndi Fulani na-achi ehi ejidela otutu Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ Charly Boy ekwuola na o choro ndi ntoroobia puruiche maka ichi Naijiria Charly Boy ekwuola na ọ chọrọ ndị ntoroọbịa pụrụiche maka ịchị Naịjiria Charles Oputa bu onye ejiri 'Charly Boy' mara kwuputara iwe ya gbasara usoro ochichi Goomenti Naijiria. Charles Oputa bụ onye ejiri 'Charly Boy' mara kwuputara iwe ya gbasara usoro ọchịchị Gọọmenti Naịjirịa. Onye ama ama dika Eze ndi ntoroobia na Naijiria bu Charly Boy kwuru na obi adighi ya mma maka onodu Naijiria. Onye ama ama dịka Eze ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Charly Boy kwuru na obi adịghị ya mma maka ọnọdụ Naịjirịa. Mgbe ndi BBC Igbo gbara ya ajujuonu, o juru 'Gini mere o jiri buru ndi ojoo na-achi Naijiria?'. Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, ọ jụrụ 'Gịnị mere o jiri bụrụ ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa?'. Charly Boy kwuru na o na-acho ndi ntoroobia puruiche o ga-akwado maka i were oche ochichi Naijiria. Charly Boy kwuru na ọ na-achọ ndị ntoroọbịa pụrụiche ọ ga-akwado maka ị were oche ọchịchị Naịjirịa. 'Obi na-agbawa m kamgbe afo iri ato na ise gara aga na nzoputa Naijiria ga-abu maka ndi ntoroobia puruiche, ' dika Charly Boy kwuru. 'Obi na-agbawa m kamgbe afọ iri atọ na ise gara aga na nzọpụta Naịjirịa ga-abụ maka ndị ntoroọbịa pụrụiche, ' dịka Charly Boy kwuru. Oscars 2018: Kobe Bryant so na ndi nwere ihe nrite Oscars 2018: Kobe Bryant so na ndị nwere ihe nrite Onye ogba basket boolu Amerika bu Kobe Bryant e sorola na ndi ritelu ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a. Onye ọgba basket bọọlụ Amerịka bụ Kobe Bryant e sorola na ndị ritelu ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a. Kobe Bryant, onye egwuregwu boolu Amerika a ma ama Kobe Bryant, onye egwuregwu bọọlụ Amerika a ma ama Mmeri puruiche- Kobe Bryant emeriela. Mmeri pụrụiche- Kobe Bryant emeriela. N' ihe itunanya mere ka Kobe Bryant bu onye a ma ama ka ogbaa basketboolu n' Amerika aturula ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a na-akpo Oscars. N' ihe ịtụnanya mere ka Kobe Bryant bụ onye a ma ama ka ọgbaa basketbọọlụ n' Amerịka atụrụla ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a na-akpọ Oscars. O ritere ihe a maka ihe onyonyo nke eserese nwa-oge. O ritere ihe a maka ihe onyonyo nke eserese nwa-oge. Lee ndi ozo nwere nrite na Oscars e mere n' onu ututu a. Lee ndị ọzọ nwere nrite na Oscars e mere n' ọnụ ụtụtụ a. Ndi mmeri: Ndị mmeri: The Shape of Water nwere nrite nke 'Best picture. ' The Shape of Water nwere nrite nke 'Best picture. ' Frances McDormand ritere nke a na-akpo 'Best actress' maka Three Billboards Outside Ebbing, Missouri Frances McDormand ritere nke a na-akpọ 'Best actress' maka Three Billboards Outside Ebbing, Missouri Onye ritere nke a na-akpo 'Best actor' bu Gary Oldman maka Darkest Hour Onye ritere nke a na-akpọ 'Best actor' bụ Gary Oldman maka Darkest Hour Guillermo Del Toro ritere nke a na-akpo 'Best director' maka The Shape of Water Guillermo Del Toro ritere nke a na-akpọ 'Best director' maka The Shape of Water Get Out nke Jordan Peele mere ritere 'Best original screenplay' Get Out nke Jordan Peele mere ritere 'Best original screenplay' Oscars 2018: ihe ndi nkiri yi puta n' ogbo Oscars 2018: ihe ndị nkiri yi pụta n' ọgbọ Abali ihe nrite akacha ekwu maka ya na Hollywood emela Abalị ihe nrite akacha ekwu maka ya na Hollywood emela Lekwa foto ihe ndi mmadu yi puta na 'red carpet' Lekwa foto ihe ndị mmadụ yi pụta na 'red carpet' Danai Gurira mere ihe nkiri Black Panther na Walking Dead gosiri ihe eserese n' akuku isi ya Danai Gurira mere ihe nkiri Black Panther na Walking Dead gosiri ihe eserese n' akụkụ isi ya Ihe nrite Academy Awards nke ama ama dika Oscars nke ugboro 90 mere n' abali ebe ndi mmadu gosiri ekike ha. Ihe nrite Academy Awards nke ama ama dịka Oscars nke ugboro 90 mere n' abalị ebe ndị mmadụ gosiri ekike ha. Lekwa ihe ndi na-eme ihe nkiri yi bia emume a. Lekwa ihe ndị na-eme ihe nkiri yi bịa emume a. Daniel Kaluuya Daniel Kaluuya Daniel Kaluuya bu onye Britain so mee ihe nkiri Get Out so na ndi a kporo aha inweta ihe nrite Oscars Daniel Kaluuya bụ onye Britain so mee ihe nkiri Get Out so ná ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite Oscars Lupita Nyong'o Lupita Nyong'o Lupita Nyong'o nwetara Oscars n' afo 2012 maka ihe nkiri o mere nke a kporo 12 Years a Slave Lupita Nyong'o nwetara Oscars n' afọ 2012 maka ihe nkiri o mere nke a kpọrọ 12 Years a Slave Jennifer Lawrence Jennifer Lawrence Uwe Jennifer Lawrence bu onye mere ihe nkiri Hunger Games yiri akpuruakpu Oscar na-acha olaocha Uwe Jennifer Lawrence bụ onye mere ihe nkiri Hunger Games yiri akpụrụakpụ Oscar na-acha ọlaọcha Andara Day Andara Day Andara Day bu onye Amerika na-agu ma dee egwu, dina ala na red carpet, si ndi mmadu bia lere uwe ya Andara Day bụ onye Amerịka na-agụ ma dee egwu, dina ala na red carpet, sị ndị mmadụ bịa lere uwe ya Oscars 2018: Ka o si gaa Oscars 2018: Ka o si gaa Black Panther na-ewu ofuma Black Panther na-ewu ọfụma E gosiri Afrika n' emume mbido 'Black Panther' E gosiri Afrịka n' emume mbido 'Black Panther' Black Panther: Kedu uma i bu na ihe nkiri a? Black Panther: Kedụ ụma ị bụ na ihe nkiri a? Tom Holland Tom Holland Tom Holland mere ihe nkiri Spider Man yi ezigbo uwe bia kpoputa aha onye nwetara ihe nrite n' emume a Tom Holland mere ihe nkiri Spider Man yi ezigbo uwe bịa kpọpụta aha onye nwetara ihe nrite n' emume a Chadwick Boseman Chadwick Boseman Chadwick Boseman bu eze T'challa nke obodo Wakanda n' ihe nkiri Black Panther yi uwe Givenchy kwara bia Oscars Chadwick Boseman bụ eze T'challa nke obodo Wakanda n' ihe nkiri Black Panther yi uwe Givenchy kwara bịa Oscars Ashley Judd Ashley Judd Ashley Judd nke tinyere onu n' ime okwu Time's Up yi uwe na-acha odoodo puta na red carpet Ashley Judd nke tinyere ọnụ n' ime okwu Time's Up yi uwe na-acha odoodo pụta na red carpet Adam Rippon Adam Rippon Adam Rippon n' eme egwuregwu olimpiks bekee kporo figure skating mere ka ndi mmadu kpuru ya n' onu ka o yi uwe nwere ihe e ji eke aji mere ka o di ka o si n' ime ihe nkiri Fifty Shades Of Grey riputa Adam Rippon n' eme egwuregwu olimpiks bekee kpọrọ figure skating mere ka ndị mmadụ kpụrụ ya n' ọnụ ka o yi uwe nwere ihe e ji eke ajị mere ka ọ dị ka o si n' ime ihe nkiri Fifty Shades Of Grey rịpụta Salman Hayek Salman Hayek Halman Sayek yi uwe na-acha odoodo puta Halman Sayek yi uwe na-acha odoodo pụta Darrell Britt-Gibson Darrell Britt-Gibson Ndi ose foto serela na-aga ka Darrell Britt-Gibson mere ihe nkiri Three Billboards maliri elu na red carpet Ndị ose foto serela na-aga ka Darrell Britt-Gibson mere ihe nkiri Three Billboards maliri elu na red carpet Whoopi Goldberg Whoopi Goldberg Uwe Whoopi Goldberg yi n' ahu di ka dragon eserese n' ahu ya Uwe Whoopi Goldberg yi n' ahụ dị ka dragon eserese n' ahụ ya Patrick Stewart Patrick Stewart Sir Patrick Stewart mere ihe nkiri X-men yi ntutu edere Time's Up n' uwe ya ka o nyere ndi ose foto nsusu Sir Patrick Stewart mere ihe nkiri X-men yi ntụtụ edere Time's Up n' uwe ya ka o nyere ndị ose foto nsusu Sally Hawkins Sally Hawkins Sally Hawkins, onye Britain so na ndi a kporo aha inweta ihe nrite maka ihe nkiri The Shape of Water o mere chisara ndi ose foto ochi Sally Hawkins, onye Britain so na ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite maka ihe nkiri The Shape of Water o mere chịsara ndị ose foto ọchị Saoirse Roman Saoirse Roman Saoirse Roman mere ihe nkiri Lady Bird yi uwe pink puta na red carpet Oscars ka afo 10 gachara oge mputa mbu ya n' afo 2008 oge o ka bu nwata di afo 13 Saoirse Roman mere ihe nkiri Lady Bird yi uwe pink pụta na red carpet Oscars ka afọ 10 gachara oge mpụta mbụ ya n' afọ 2008 oge ọ ka bụ nwata dị afọ 13 Meryl Streep Meryl Streep A kpoola Meryl Streep aha maka inweta ihe nrite Oscars ugboro 21 kamgbe o bidoro ime ihe nkiri A kpọọla Meryl Streep aha maka inweta ihe nrite Oscars ugboro 21 kamgbe o bidoro ime ihe nkiri Margot Robbie Margot Robbie Margot Robbie mere ihe nkiri Tonya mara mma n' ihe o yi puta red carpet Margot Robbie mere ihe nkiri Tonya mara mma n' ihe o yi pụta red carpet Tiffany Haddish Tiffany Haddish Tiffany Haddish kere ezigbote ekike ndi Afrika nke e ji mara umunwaanyi Eritrea na Ethiopia Tiffany Haddish kere ezigbote ekike ndị Afrịka nke e ji mara ụmụnwaanyị Eritrea na Ethiopia Foto niile a nwere ihe bekee kporo copyright. Foto niile a nwere ihe bekee kpọrọ copyright. Ihe mba Afrika ndi ozo ji kara Naijiria mma n' ihe nkiri Ihe mba Afrịka ndị ọzọ ji kara Naịjirịa mma n' ihe nkiri A bia n' ihe nturugo kachasi ada uda n' uwa ihe nkiri a kporo Oscars, ndi mpaghara Afrika na-egosi Naijiria nari. A bịa n' ihe nturugo kachasị ada ụda n' ụwa ihe nkiri a kpọrọ Oscars, ndị mpaghara Afrịka na-egosi Naijiria narị. Akpuruakpu ihe nrite Oscars Akpụrụakpụ ihe nrite Oscars 2018 a mere ya afo 90 a na-eme nturugo Oscars na Hollywood 2018 a mere ya afọ 90 a na-eme nturugo Oscars na Hollywood Ka e mechara Oscars nke bu emume nturugo kachasi ada uda n'uwa ihe nkiri nke 2018, BBC Igbo nyochara ma hu na mba Afrika ndi ozo ka Naijiria mma n' ihe gbasara ihe nkiri. Ka e mechara Oscars nke bụ emume nturugo kachasị ada ụda n'ụwa ihe nkiri nke 2018, BBC Igbo nyochara ma hụ na mba Afrịka ndị ọzọ ka Naijiria mma n' ihe gbasara ihe nkiri. Oscars 2018: N' etiti Afrika na Naijiria Oscars 2018: N' etiti Afrịka na Naijiria BBC choputara na n' agbanyeghi na ufodu ndi na-emeputa ihe nkiri na Naijiria na-etinye ufodu ndi Hollywood n' ihe nkiri ha, o mebeghi ka ha soro na ndi a na-akpo aha inweta nturugo obula na Hollywood. BBC chọpụtara na n' agbanyeghi na ụfọdụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naijiria na-etinye ụfọdụ ndị Hollywood n' ihe nkiri ha, o mebeghi ka ha soro na ndị a na-akpọ aha inweta nturugo ọbụla na Hollywood. Nollywood bu ndi na-emeputa ihe nkiri na Naijiria na mpaghara Afrika ndi ozo so na ndi a na-anu aha ya, ndi mba Afrika ndi ozo egosila ha nkari. Nollywood bụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naijiria na mpaghara Afrịka ndị ọzọ so na ndị a na-anụ aha ya, ndị mba Afrịka ndị ọzọ egosila ha nkarị. Lupita Nyong'o bu nwa afo Kenya bi n' Amerika nwetara ihe nrite 'nwaanyi kacha akwado ihe nkiri' n' afo 2013 Lupita Nyong'o bụ nwa afọ Kenya bi n' Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n' afọ 2013 N' afo ole na ole gara aga, a na-ahu Naijiria di ka 'dike' n' ihe nkiri n' Afrika, mana ugbua o di ka ndi ozo agaferela ha. N' afọ ole na ole gara aga, a na-ahụ Naijiria dị ka 'dike' n' ihe nkiri n' Afrịka, mana ugbua ọ dị ka ndị ọzọ agaferela ha. Ebe Nollywood n' onwe ha bu ndi no n' okwa abuo n' uwa ihe nkiri na-emeputa ihe nkiri kariri 1000 n' ime otu afo, Hollywood na-emeputa ihe na-erughi nke ahu mana o kwusighi ha ibu ndi uwa niile na-ele anya na ha kacha emeputa ihe nkiri kacha mma. Ebe Nollywood n' onwe ha bụ ndị nọ n' ọkwa abụọ n' ụwa ihe nkiri na-emepụta ihe nkiri karịrị 1000 n' ime otu afọ, Hollywood na-emepụta ihe na-erughị nke ahụ mana ọ kwusịghị ha ịbụ ndị ụwa niile na-ele anya na ha kacha emepụta ihe nkiri kacha mma. Mana a bia n' ime Afrika, mba Kenya na Saut Afrika na-egosi Naijiria nkari ebe o gbasara ihe nrite na nturugo Oscars. Mana a bịa n' ime Afrịka, mba Kenya na Saụt Afrịka na-egosi Naijiria nkarị ebe ọ gbasara ihe nrite na nturugo Oscars. Isi n' isi in Saut Afrika Isi n' isi in Saụt Afrịka Ihe na-akpa m bu nchekwa na akunauba obodo Ihe na-akpa m bụ nchekwa na akụnaụba obodo Etu ndi Sineto si agbari ego Naijiria Etu ndị Sinetọ si agbari ego Naijiria Lee onye aka ya di n'ohi ofo ndi sineti Lee onye aka ya dị n'ohi ọfọ ndị sineti Ntorobia Naijiria amaala Buhari aka maka ikpo ha 'ndi umengwu' Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka maka ịkpọ ha 'ndị umengwụ' Ndi ntorobia Naijiria ekwenyeghi n'ihe Buhari kwuru na CHOGM na ha di umengwu. Ndị ntorobia Naijirịa ekwenyeghị n'ihe Buhari kwuru na CHOGM na ha dị umengwụ. Muhammadu Buhari Muhammadu Buhari Ndi Naijiria na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari na-awu ha n'ala na mba ofesi oge ufodu Ndị Naịjirịa na-ekwu na onyeisiala Muhammadu Buhari na-awụ ha n'ala na mba ofesi oge ụfọdụ Ndi mmadu ka na-etinye onu n'okwu gbasara 'umengwu' onyeisiala Naijiria kporo ndi ntorobia. Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara 'umengwụ' onyeisiala Naịjirịa kpọrọ ndị ntorobịa. Ka Buhari gara London maka nzuko ndi ochichi mba ndi no n'okpuru Commonwealth nke a kporo CHOGM, o kwuru na ndi ntorobia Naijiria di umengwu. Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth nke a kpọrọ CHOGM, o kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ. Okwu a o kwuru atoghi otutu ndi Naijiria ochi, nke kpatara ha jiri gosi iwe ha n'elu sosha midia. Okwu a o kwuru atọghị ọtụtụ ndị Naịjirịa ọchị, nke kpatara ha jiri gosi iwe ha n'elu sosha midia. Okwu ato Buhari ji 'wuo Naijiria n'ala' Okwu atọ Buhari ji 'wụọ Naịjirịa n'ala' Iwe okwu Buhari na-ewe ndi ntorobia Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa Onyeisiala agaghi akoli umu Naijiria onu Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Onye na-ekwuchitere onu Buhari bu Femi Adesina, kwuru na ndi Naijiria ghotaghiere ihe o kwuru. Onye na-ekwuchitere ọnụ Buhari bụ Femi Adesina, kwuru na ndị Naịjirịa ghọtaghiere ihe o kwuru. Ihe Adesina kwuru akwusighi ndi mmadu ikwu ihe di ha n'obi. Ihe Adesina kwuru akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ihe dị ha n'obi. #LazyNigerianYouths na-ewu #LazyNigerianYouths na-ewu Otutu n'ime ha gara n'ihu bido igosiputa oru aka ha, ma na-ekwu na ha abughi ndi umengwu n'agbanyeghi na ala Naijiria adichaghi mma. Ọtụtụ n'ime ha gara n'ihu bido igosipụta ọrụ aka ha, ma na-ekwu na ha abụghị ndị umengwụ n'agbanyeghị na ala Naịjirịa adịchaghị mma. Otu onye ocha tinyere onu ya n'okwu a. Otu onye ọcha tinyere ọnụ ya n'okwu a. Ufodu kwuru etu ha si jiri aka ha zuo onwe ha n'uloakwukwo site na mbo ha na-agba. Ụfọdụ kwuru etu ha si jiri aka ha zụọ onwe ha n'ụlọakwụkwọ site na mbọ ha na-agba. Ufodu kwuru na ha agaghi ebinyere Buhari aka n'afo 2019 Ụfọdụ kwuru na ha agaghị ebinyere Buhari aka n'afọ 2019 Otu onye ji okwu njakiri gosi onye nwere orusi ka na-eji ya aru oru Otu onye ji okwu njakịrị gosi onye nwere ọrụsị ka na-eji ya arụ ọrụ Onye ga-abu onyeisi ohuru na commonwealth? Onye ga-abụ onyeisi ọhụrụ na commonwealth? Ndi isi Commonwealth na-ezuko ka ha wee choputa ma nwaeze Wales a ga-anochite anya nne ya dika onyeisi ngalaba ahu. Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha wee chọpụta ma nwaeze Wales a ga-anọchite anya nne ya dika onyeisi ngalaba ahụ. Ezenwaanyi Elizabeth Ezenwaanyị Elizabeth Ezenwaanyi mba England choro ka nwa ya nwoke Charles nochie ya n'okwa Ezenwaanyị mba England chọrọ ka nwa ya nwoke Charles nọchie ya n'ọkwa Ndi isi Commonwealth na-ezuko ka ha kparita uka i choputa ma nwaeze Wales a ga-anochite anaya nne ya dika onyeisi ga-chi ngalaba jikotara obodo 53. Ndị isi Commonwealth na-ezukọ ka ha kparịta ụka ị chọputa ma nwaeze Wales a ga-anọchite anaya nne ya dịka onyeisi ga-chi ngalaba jikọtara obodo 53. Ubochi Tosde ka Ezenwaanyi Briten kpebiri na nwa ya Charles ga-achi otu akporo CHOGM na Buckingham Palace. Ụbọchị Tọsde ka Ezenwaanyị Briten kpebiri na nwa ya Charles ga-achị otu akpọrọ CHOGM na Buckingham Palace. O si na o bu mmasi ya ka nwa ya Charles chia CHOGM otu ubochi. Ọ si na ọ bụ mmasị ya ka nwa ya Charles chịa CHOGM otu ụbọchị. Mana ya bu okwa abughi ihe Ezenwaanyi na-ekenye nwa ya maoburu godu na o nwuo. Mana ya bụ ọkwa abụghị ihe Ezenwaanyị na-ekenye nwa ya maọbụrụ godu na ọ nwụọ. A na-tu anya na ndi isi oche Commonwealth ga-ekpebi maka onye ga-achi ha ma ha zuko na Windsor Castle mana enwebeghi ihe gosiri na a ga-ekwuputa ya bu ihe na nzuko ahu. A na-tụ anya na ndị isi oche Commonwealth ga-ekpebi maka onye ga-achị ha ma ha zukọ na Windsor Castle mana enwebeghị ihe gosiri na a ga-ekwupụta ya bụ ihe na nzukọ ahụ. O bu na-enweghi onye ozo nwereike ichi commonwealth? Ọ bụ na-enweghị onye ọzọ nwereike ichi commonwealth? Onye ntaakuko BBC bu James Landale si na atuola aro ka okwa ahu na-agaghari n'etiti ndi isi obodo no na Commonwealth. Onye ntaakụkọ BBC bụ James Landale sị na atụọla arọ ka ọkwa ahụ na-agagharị n'etiti ndị isi obodo nọ na Commonwealth. Mana, Onyeisiala Saut Africa Cyril Ramaphosa egbubirila ije ya na nzuko a na-eme na London ka owere mara ihe kpatara mwakpo a na-eme n'obodo ya. Mana, Onyeisiala Saut Africa Cyril Ramaphosa egbubirila ije ya na nzukọ a na-eme na London ka owere mara ihe kpatara mwakpo a na-eme n'obodo ya. Mwakpo a na-eme n'ugwu Saut Afrika ebe ndi ngaghari iwe na-asi ka-enye ha oru, ulo obibi na nkwusi mmeruaka. Mwakpo a na-eme n'ugwu Saụt Afrịka ebe ndị ngagharị iwe na-asị ka-enye ha ọrụ, ụlọ obibi na nkwụsị mmerụaka. Kedu ihe bu oru onyeisi Commonwealth? Kedu ihe bụ ọrụ onyeisi Commonwealth? Okwa nke Ezenwaanyi Briten no na ya di oke mkpa. Ọkwa nke Ezenwaanyị Briten nọ na ya dị oke mkpa. Ngalaba a na-achikota mba iri ise na ato iji wee hu na ihe njirimara Commonwealth bu ihe biara na mmezu. Ngalaba a na-achịkọta mba iri ise na atọ iji wee hụ na ihe njirimara Commonwealth bụ ihe bịara na mmezu. Nke a gunyere ijikota mba ndi a site n'azumaahia na mmekorita mba uwa niile. Nke a gụnyere ijikọta mba ndị a site n'azụmaahịa na mmekọrịta mba ụwa niile. Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: Chimamanda si na onwere onye wakporo ya Chimamanda sị na onwere onye wakporo ya Onyeisiala agaghi akoli umu Naijiria onu Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Ntorobia Naijiria amaala Buhari aka Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka Onyeisi otu ndi a na-eme njem nleta na mba niile no na otu ahu, iji mee nkwekorita ahu guzosie ike. Onyeisi otu ndị a na-eme njem nleta na mba niile nọ na otu ahụ, iji mee nkwekọrịta ahụ guzosie ike. O bu ndi isi otu a na-eme mkpebi onye ga-abu onyeisi ha gbagburugburu. O bụ ndị isi otu a na-eme mkpebi onye ga-abụ onyeisi ha gbagburugburu. Praim Minista bu Theresa May na Praim Minista mba Canada bu Justin Trudeau akwadola okparaeze Charles i bu onyeisi. Praịm Mịnịsta bụ Theresa May na Praịm Mịnịsta mba Canada bụ Justin Trudeau akwadola ọkparaeze Charles ị bụ onyeisi. Gini bu CHOGM? Gịnị bụ CHOGM? CHOGM bu Commonwealth Heads of Government Meeting n'asusu bekee. CHOGM bụ Commonwealth Heads of Government Meeting n'asụsụ bekee. O bu ogbako ndi ndu mba ndi so n'otu commonwealth, nke a na-eme kwa afo abuo. Ọ bụ ọgbakọ ndị ndu mba ndị so n'otu commonwealth, nke a na-eme kwa afọ abụọ. Ndi na-eme ya bu ndi isiala na ndi Praim Minista mba di iri ise na ato na ndi ezinaulo ha, ndi na-ekwuru ha okwu na ndi ntaakuko. Ndị na-eme ya bụ ndị isiala na ndị Praịm Mịnịsta mba dị iri ise na atọ na ndị ezinaụlọ ha, ndị na-ekwuru ha okwu na ndị ntaakụkọ. Ogbako nke afo mere na London, ebe nke gara aga n'afo 2015 bu na Valletta di na Malta. Ọgbakọ nke afọ mere na Lọndọn, ebe nke gara aga n'afọ 2015 bụ na Valletta dị na Malta. Ego a na-atu n'Imo agaghi aba akpa anyi - Okwuchite onu Rochas Ego a na-atụ n'Imo agaghị aba akpa anyị - Okwuchite ọnụ Rochas Goomenti Imo steeti na-ekwu na atumatu utu a esighi ha n'aka, mana ha ga-eji naira nde iri akwado ya. Gọọmentị Imo steetị na-ekwu na atụmatụ ụtụ a esịghị ha n'aka, mana ha ga-eji naira nde iri akwado ya. Rochas Okorocha na eze ndi Ogoni, King Godwin Gininwa Rochas Okorocha na eze ndị Ogoni, King Godwin Gininwa Agba ochichi Rochas Okorocha ga-agwucha n'afo 2019 Agba ọchịchị Rochas Okorocha ga-agwụcha n'afọ 2019 Ka akuko na-akowa na goomenti Imo steeti agwala ndi okenye niile tozuru i ru-oru ha kwuo naira puku ato putara, goomenti Imo na-akowa na o gbughi ha ka ego a di mkpa. Ka akụkọ na-akọwa na gọọmentị Imo steeti agwala ndị okenye niile tozuru ị rụ-ọrụ ha kwụọ naira puku atọ pụtara, gọọmentị Imo na-akọwa na ọ gbụghị ha ka ego a dị mkpa. Ebere Iwuji bu onye na-ekwuchite onu govano n'ihe gbasara mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwenti na ugwo a bu ugwo a ga-akwu nani otu mgbe. Ebere Iwuji bụ onye na-ekwuchite ọnụ gọvanọ n'ihe gbasara mgbasa ozi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ụgwọ a bụ ụgwọ a ga-akwụ nanị otu mgbe. O kwukwara na a ga-eji ego kwado oru di icheiche obodo ndi no n'ime Imo steeti ji aka ha na-eme. O kwukwara na a ga-eji ego kwado ọrụ dị icheiche obodo ndị nọ n'ime Imo steeti ji aka ha na-eme. Agbanyeghi na akuko na-ekwu na o nde naira isii ka eyiri otu obodo, Nzewuji siri na enweghi aha ego obula akporo, makana o ndi bi na imi obodo ugbua kwesiri itu utu a. Agbanyeghị na akụkọ na-ekwu na ọ nde naira isii ka eyiri otu obodo, Nzewuji sịrị na enweghị aha ego ọbụla akpọrọ, makana ọ ndị bi na imi obodo ugbua kwesịrị ịtụ ụtụ a. Nzewuji si 'Ego a gaghi abanye n'akpa goomenti Imo steeti, o bu ngalaba obodo di icheiche akporo Community Government Council (CGC) nwe ya'. Nzewuji si 'Ego a gaghị abanye n'akpa gọọmentị Imo steeti, ọ bụ ngalaba obodo dị icheiche akporọ Community Government Council (CGC) nwe ya'. Nzewuji gara n'ihu kwuo na goomenti Imo steeti ga-eji nde naira iri wee kwado obodo obula turu ego a, ka ha na-ele anya na a ga-eje ya hiba ulooru meputa ihe na ihe ndi ozo obodo choro. Nzewuji gara n'ihu kwuo na gọọmentị Imo steetị ga-eji nde naira iri wee kwado obodo ọbula tụrụ ego a, ka ha na-ele anya na a ga-eje ya hiba ụlọọrụ mepụta ihe na ihe ndị ọzọ obodo chọrọ. A nam eche na onye obula choro oganiru ga-acho ikwado ya, okachasi ebe ha na-etinye aka n'mbu na oru mmepe obodo, Nzewuji kwuru. A nam eche na onye ọbụla chọrọ ọganiru ga-achọ ikwado ya, okachasị ebe ha na-etinye aka n'mbu na ọrụ mmepe obodo, Nzewuji kwuru. Nzewuji gakwara n'ihu kowa na onweghi eze obodo obula anapuru ogwo onwa maka ihe a. Nzewuji gakwara n'ihu kọwa na onweghị eze obodo ọbụla anapụrụ ọgwọ onwa maka ihe a. Gee nkowa ya n'uju ebe a: Gee nkọwa ya n'uju ebe a: Akuko ndi ozo ga-amasi gi: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: Ihe mere ndi Naijiria ji enye otu uzo n'uzo iri Ihe mere ndị Naịjịria ji enye otu ụzọ n'ụzọ iri Onyeisiala agaghi akoli umu Naijiria onu Onyeisiala agaghị akọli ụmụ Naịjirịa ọnụ Akuko kachasi n'abali a: Buhari bu nna Naijiria Akụkọ kachasi n'abalị a: Buhari bụ nna Naijiria Kedu otu pati ndi ga-ekpoko iwepu APC? Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC? Ntuliaka 2019 naha asara oku dika ufodu pati na-ejiko na-acho iwepu APC n'ochichi n'afo 2019. Ntuliaka 2019 naha asara ọkụ dịka ụfọdụ pati na-ejikọ na-achọ iwepu APC n'ọchịchị n'afọ 2019. Olusegun Obasanjo Olusegun Obasanjo Olusegun Obasanjo kwusiri ochichi n'afo 1999 Olusegun Obasanjo kwusiri ọchịchị n'afọ 1999 Otutu ndi otu pati no n'okwa ochichi akporo APC nakwa ndi onu na-eru n'okwu na Naijiria na-agba mbo iwepu ochichi n'aka pati Buhari na 2019. Ọtụtụ ndị otụ pati nọ n'ọkwa ọchịchị akpọrọ APC nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa na-agba mbọ ịwepụ ọchịchị n'aka pati Buhari na 2019. Akuko na-ekwu na otutu pati nwereike imalite ijiko n'izuka na-abia iji wee kwusi mgbago obula na ntuliaka na-abia nu. Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati nwereike imalite ijikọ n'izuka na-abia iji wee kwusi mgbagọ ọbụla na ntuliaka na-abia nu. Ndi gunyere na njikota pati a bu pati ndi a: 'Peoples Democratic Party(PDP), ufodu ndi isi na All progressives Congress (APC), Social Democratic Pati,' ndi obere pati ndi ozo ruru iri abuo na ato Ndị gunyere na njikọta pati a bụ pati ndị a: 'Peoples Democratic Party(PDP), ụfọdụ ndị isi na All progressives Congress (APC), Social Democratic Pati,' ndị obere pati ndi ọzọ ruru iri abuọ na atọ nakwa 'Coalition for Nigeria Movement (CNM) nke onye bubu onyeisiala Naijiria bu Olusegun Obasanjo . nakwa 'Coalition for Nigeria Movement (CNM) nke onye bubu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo . A malitela otu njiko nke Obasanjo A malitela otu njikọ nke Obasanjo Ntuliaka 2019: Keyamo bu onye nkwuchiteonu Buhari Ntuliaka 2019: Keyamo bụ onye nkwuchiteọnụ Buhari Buhari: Aga m azo ochichi 2019 Buhari: Aga m azọ ọchịchị 2019 APC were ochichi n'afo 2015 APC were ọchịchị n'afọ 2015 Ndi bubu onyeisiala na Naijiria, ndi isi agha lagoro ezumike nka gunyere onye agha T.Y Danjuma na-akwado mkpokoba a. Ndị bubu onyeisiala na Naịjirịa, ndị isi agha lagoro ezumike nka gunyere onye agha T.Y Danjuma na-akwado mkpokoba a. N'onu otu onye welitere isi na ya bu mkpoko, 'nke a agaghi adi ka mgbanwo mutara pati APC. N'ọnụ otu onye welitere isi na ya bụ mkpoko, 'nke a agaghị adị ka mgbanwo mụtara pati APC. Anyi anaghi ezigara ulooru INEC aha mgbanwe. Anyị anaghị ezigara ụlọọrụ INEC aha mgbanwe. Pati ohuru a ga-enye onye o bula ohere ikwuputa obi ya.' Pati ọhụrụ a ga-enye onye ọ bụla ohere ikwuputa obi ya.' Ndi no n'uloomeiwu na ndi govano ruru iri na itoolu na-akwadoka ya bu mkpokoba. Ndị nọ n'ụlọomeiwu na ndị govano ruru iri na itoolu na-akwadoka ya bụ mkpokoba. PDP chiri Naijirio afo iri na isii tupu APC anara ha ochichi PDP chịrị Naịjirịọ́ afọ iri na isii tupu APC anara ha ọchịchị N'aka nke ozo, pati PDP ka a na-atule ma ha ga-agbanwe aha pati ha. N'aka nke ọzọ, pati PDP ka a na-atule ma ha ga-agbanwe aha pati ha. Onyeisi pati ahu bu Uche Secondus kwuru na ya na ndi otu ya ka na-atule ya bu echic Onyeisi pati ahụ bu Uche Secondus kwuru na ya na ndị otu ya ka na-atule ya bụ echic Mana ndi mmadu na-ekwu na kama igbanwe aha, pati PDP weputa uzo dimma di iche iche ha ga-esi dozie ala Naijiria ma wepu APC n'ochichi. Mana ndị mmadụ na-ekwu na kama igbanwe aha, pati PDP weputa ụzọ dimma dị iche iche ha ga-esi dozie ala Naịjirịa ma wepu APC n'ọchịchị. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe eji atu utu naira 3000 n'Imo Ihe eji atụ ụtụ naira 3000 n'Imo Ndi na-anata ogwugwo ejichiela ndi oru ahuike Ndị na-anata ọgwụgwọ ejichiela ndị ọrụ ahụike Ntorobia Naijiria amaala Buhari aka Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka Mmonwu wakporo ulouka Fada 'Ebube muonso' Mmọnwụ wakporo ụlọụka Fada 'Ebube mụọnsọ' Ndi na-eti mmonwu wakporo ogbako ndi uka Katolik n'Uke Anambara steeti meruo otutu ahu ma mebie ugboala iri ato. Ndị na-eti mmọnwụ wakporo ọgbakọ ndị ụka Katolik n'Uke Anambara steeti merụọ ọtụtụ ahụ ma mebie ụgbọala iri atọ. Ndi ntorobia na-agba mmonwu Ndị ntorobịa na-agba mmọnwụ Igba mmonwu bu emume omenala e jiri mara Ndigbo Ịgba mmọnwụ bụ emume omenala e jiri mara Ndigbo Ndi mmonwu na-eme emume, 'Uzo Iyi' n'Uke di n'okpuru ochichi Idemili Not n'Anambara steeti wakporo ogbako ekpere ndi uka Katolik ma mebie ihe kariri ugboala iri ato, meruo otutu ndi mmadu ahu, ebe e chere n'otu onye ha mara mma nwuru n'ubochi Satode. Ndị mmọnwụ na-eme emume, 'Ụzọ Iyi' n'Uke dị n'ọkpuru ọchịchị Idemili Nọt n'Anambara steeti wakporo ọgbakọ ekpere ndị ụka Katolik ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ, merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ, ebe e chere n'otu onye ha mara mma nwuru n'ụbọchị Satọde. Onyeisi nchuaja ogbako ulouka ahu bu Fada Emmanuel Obimma, nke a ma ama di ka 'Ebube Mmuonso' na ndi ukochukwu ndi ozo, na ndi umunwaanyi e chiri echichi biara ebe ahu gbalahuru ndi ntorobia ahu wakporo ndi gara ikpere Chineke n'uka ncheabali ha mere n'abali Fraide banye n'isi ututu Satode. Onyeisi nchụaja ọgbakọ ụlọụka ahụ bụ Fada Emmanuel Obimma, nke a ma ama dị ka 'Ebube Mmụọnsọ' na ndị ụkọchụkwụ ndị ọzọ, na ndị ụmụnwaanyị e chiri echichi bịara ebe ahụ gbalahụrụ ndị ntorobịa ahụ wakporo ndị gara ikpere Chineke n'ụka ncheabalị ha mere n'abali Fraide banye n'isi ụtụtụ Satode. Onye nnyemaka ukochukwu bu Francis Okoye gwara onye ntaakuko BBC n'ekwenti na ndi mmonwu wakporo ebe ogbako uka abali ahu n'ihe dika elekere asato nke abali meruo otutu mmadu ahu ma mebie ihe kariri ugboala iri ato. Onye nnyemaka ụkọchụkwụ bụ Francis Okoye gwara onye ntaakụkọ BBC n'ekwentị na ndị mmọnwụ wakporo ebe ọgbakọ ụka abalị ahụ n'ihe dịka elekere asatọ nke abalị merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ ma mebie ihe karịrị ụgbọala iri atọ. Aguleri na Igboukwu abughi mbido Ndigbo Aguleri na Igboukwu abụghị mbido Ndigbo Otu nwoke egbuola umuaka ya n'Awada Otu nwoke egbuola ụmụaka ya n'Awada Mgbe ihe mechaziri, anyi gukoro ugboala ha mebiri guta iri ato. Mgbe ihe mechazịrị, anyị gụkọrọ ụgbọala ha mebirị gụta ịrị atọ. "Ha meruru otutu ndi mmadu ahu. " "Ha merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ. " "O nwere otu onye ha suru mma e bugara ulo ogwu. " "O nwere ọtụ onye ha sụrụ mma e bugara ụlọ ọgwụ. " Anyi amabeghi ma odi ndu ma o nwuru anwu. Anyị amabeghị ma ọdị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. "O were anya na ndi ntorobia Uke mere ihe a kwadoro akwado imekpa ndi uka ahu n'ihi na, a na-eme 'Uzo iyi', mmonwu na-agbadebe ma o kuo elekere isii nke mgbede mana ndi mmonwu a wakporo ebe a na-eme uka abali ka o kuchara elekere asato nke abali. " "O were anya na ndị ntorobịa Uke mere ihe a kwadoro akwado imekpa ndị ụka ahụ n'ihi na, a na-eme 'Uzọ iyi', mmọnwụ na-agbadebe ma ọ kụọ elekere isii nke mgbede mana ndị mmọnwụ a wakpọrọ ebe a na-eme ụka abalị ka ọ kụchara elekere asatọ nke abalị. " Ha bidoro na-eti ndi ji ugboala ebute ndi mmadu biara uka ihe, na-anara ha ego ha nakwa ekwenti ha. Ha bidoro na-eti ndị ji ụgbọala ebute ndị mmadụ bịara ụka ihe, na-anara ha ego ha nakwa ekwentị ha. Mmonwu mebiri otutu ugbola n'ogbako ahu Mmọnwụ mebiri ọtụtụ ụgbọla n'ọgbakọ ahụ "Ndi oru nche anyi nwara ike ha ikwusi ha imebi ihe mana mgbe anyi huru na ihe na-eme akariala, anyi kporo ndi uweojii. " "Ndị ọrụ nche anyị nwara ike ha ịkwụsị ha imebi ihe mana mgbe anyị hụrụ na ihe na-eme akarịala, anyị kpọrọ ndị uweojii. " Ha biara nwuchie ufodu n'ime ha. Ha bịara nwụchie ụfọdụ n'ime ha. Ndi uweojii Anambra steeti kwuru n'ezie na mmonwu wakporo ndiuka n'Uke mana ha kwuru na onweghi onye nwuru. Ndị uweojii Anambra steeti kwuru n'ezie na mmọnwụ wakporo ndịụka n'Uke mana ha kwuru na onweghị onye nwụrụ. Onu na-ekwuchitere ndi uweojii na steeti ahu bu Nkiru Nwode gwara BBC na 'Anyi nwuchiri mmonwu ato, anyi na-enyocha ihe mere ebe ahu.' Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nkirụ Nwode gwara BBC na 'Anyi nwụchịrị mmọnwụ atọ, anyị na-enyocha ihe mere ebe ahụ.' Akuko kwuru na nke a abughi mbu ndi ntorobia obodo ahu na-emekpa ndi na-aga ogbako a puruiche ndi uka Katolik na-eme kwa abali Fraide nke na-adota ihe kariri puku iri abuo kwa izuuka. Akụkọ kwuru na nke a abụghị mbụ ndị ntorobịa obodo ahụ na-emekpa ndị na-aga ọgbakọ a pụrụiche ndị ụka Katolik na-eme kwa abalị Fraide nke na-adọta ihe karịrị pụkụ iri abụọ kwa izuụka. Ndi no ebe ihe meere kwuru na ndi ntorobia obodo ahu na-esogbu ndi okwougboala na ndiuka na-anapu ha ego ma na-etikwa ufodu ihe. Ndị nọ ebe ihe meere kwuru na ndị ntorobịa obodo ahụ na-esogbu ndị ọkwọụgbọala na ndịụka na-anapụ ha ego ma na-etikwa ụfọdụ ihe. Na nsonso, ha tiri onye oru Fada Obimma ihe nke mere ukochukwu ahu ji kpesara ndiuweojii ndi nwuchiri ndi ntorobia ahu ma ahapuru ha oge eze obodo na ndi okenye obodo gboro ogu. Na nsonso, ha tiri onye ọrụ Fada Obimma ihe nke mere ụkọchụkwụ ahụ ji kpesara ndịuweojii ndị nwụchịrị ndị ntorobịa ahụ ma ahapụrụ ha oge eze obodo na ndị okenye obodo gboro ọgụ. E boro ebubo na ndi ntorobia na- emekpa ndi okwougbala na-akwoga ndi mmadu uka ahu kwa mgbe E boro ebubọ na ndị ntorobịa na- emekpa ndị ọkwọụgbala na-akwọga ndị mmadụ ụka ahụ kwa mgbe Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Umuaka ruru puku 88 nwere ike inwu n'oke aguu Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndi ochiehi egbuola mmadu 20 Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Kedu otu pati ndi ga-ekpoko iwepu APC? Kedụ otu pati ndị ga-ekpoko iwepụ APC? Ezeife: Ndigbo ga-aju Buhari ozo Ezeife: Ndigbo ga-ajụ Buhari ọzọ Ezeife na ufodu ndi onu na-eru n'okw ekwuola na igwa Igbo kwado Buhari ka ha nweta okwa na 2023 bu okwu aghugho. Ezeife na ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okw ekwụola na ịgwa Igbo kwado Buhari ka ha nweta ọkwa na 2023 bụ okwu aghụghọ. Chukwuemeka Ezeife na okenye ndi Igbo ufodu Chukwuemeka Ezeife na okenye ndị Igbo ụfọdụ Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bubu govano na Anambara Steeti bu otu onye na-ekwuchitere Ndigbo na Niajiria Chukwuemeka Ezeife,onye Igbo-Ukwu bụbu gọvanọ na Anambara Steeti bụ otu onye na-ekwuchitere Ndigbo na Niajiria Ndi nwere agba n'ala Igbo ekwuola na umuafo igbo ga-aju nkwado onyeisiala Buhari na ntulika nke 2019 dika ha mere n'afo 2015. Ndị nwere agba n'ala Igbo ekwuola na ụmụafọ ịgbo ga-ajụ nkwado onyeisiala Buhari na ntulika nke 2019 dịka ha mere n'afọ 2015. Ha doro Ndigbo aka na nti ka ha mata na ngwa na o buru na ha kwado onyeisiala Buhari ka o banye n'ochicihi ozo n'afo 2019 na okwa onyeisiala ga-erute Igbo aka bu nkwa a na-ekwe nwaanyi n'elu akwa, nihi na o bu okwu aghugho. Ha dọrọ Ndigbo aka na ntị ka ha mata na ngwa na ọ bụrụ na ha kwado onyeisiala Buhari ka ọ banye n'ọchịcihị ọzọ n'afọ 2019 na ọkwa onyeisiala ga-erute Igbo aka bụ nkwa a na-ekwe nwaanyị n'elu akwa, nihi na ọ bụ okwu aghụghọ. Na nsonso, otutu ndi otu APC gunyere, Minista na ahumaka njem bu Rotimi Amaechi, onye odeakwukwo nke goomenti etiti bu Boss Mustafa na kwa onyeisi ndi ulooru Voice of Nigeria nbu Osita Okechukwu gwara Ndi Igbo ka ha tunyere Buhari na'afo 2019, ka oke were rute ha na 2023. Na nsọnsọ, otụtụ ndị otu APC gụnyere, Minista na ahụmaka njem bụ Rotimi Amaechi, onye odeakwụkwọ nke gọọmenti etiti bụ Boss Mustafa na kwa onyeisi ndị ụlọọrụ Voice of Nigeria nbụ Ọsita Okechukwu gwara Ndị Igbo ka ha tụnyere Buhari na'afọ 2019, ka oke were rute ha na 2023. Nye Ndigbo onyeisiala 2019 - Balarabe Musa Nye Ndigbo onyeisiala 2019 - Balarabe Musa A na-emegbu Ndigbo ka ndi emeriri n'agha' A na-emegbu Ndigbo ka ndị emeriri n'agha' Mana ufodu ndi nwere onu n'igbo kwuru na okwu ahu bu okwu aghugho iji nweta votu Ndigbo, kwukwo na ndi dika Buhari boro ndi Igbo maka entinghiri ya akwukwo n'afo 2015, na ha agahi enyere ya na ntuliaka 2019. Mana ụfọdụ ndị nwere ọnụ n'igbo kwụrụ na okwu ahụ bụ okwụ aghụghọ iji nweta votu Ndigbo, kwụkwọ na ndị dịka Buhari bọrọ ndị Igbo maka entinghirị ya akwụkwọ n'afọ 2015, na ha agahị enyere ya na ntuliaka 2019. Na mkparitauka ya na ulooru ntaakuko Sun nwere onye chiburu Govano n'Anambara Steeti bu Dr Chukwuemeka Ezeife si: 'A hughi ka o ga e si mee. Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nwere onye chịbụrụ Gọvanọ n'Anambara Steeti bụ Dr Chukwuemeka Ezeife si: 'A hụghị ka ọ ga e si mee. Echeghi na anyi kwesiri i na-ario ndi mmadu okwa onyeisiala. Echeghị na anyị kwesịrị ị na-arịọ ndị mmadụ ọkwa onyeisiala. Uche m bu na anyi ga-aga rio Chineke, Onye mara na o buru na onye Igbo were okwa dika onyeisiala, obi ga-adi ndi Fulani mma, di ndi Yoruba mma, dikwara ndi mpaghara di ichiche na Naijiria mma n'ihi na anyi ga-ahazighari onodu akunauba Naijiria ka o ga n'ihu. Uche m bụ na anyị ga-aga rịọ Chineke, Onye mara na ọ bụrụ na onye Igbo were ọkwa dịka onyeisiala, obi ga-adị ndị Fulani mma, dị ndị Yoruba mma, dịkwara ndị mpaghara dị ichiche na Naijiria mma n'ihi na anyị ga-ahazigharị ọnọdụ akụnaụba Naijiria ka ọ ga n'ihu. Ikwu maka 2023 bu okwu akwughi oto, onye obula na-ekwu ya bu iji ghogbu Ndigbo.' Ikwu maka 2023 bụ okwu akwụghị ọtọ, onye ọbụla na-ekwu ya bụ iji ghọgbụ Ndịgbo.' N'otu aka ahu, onye bubu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bu Dozie Ikedife, kwuru na Ndigbo bu ndi ekwerela nkwa inweta okwa onyeisiala aputaghi ihe obuila n'oge gara aga. N'otu aka ahụ, onye bụbu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Dozie Ikedife, kwuru na Ndigbo bụ ndị ekwerela nkwa inweta ọkwa onyeisiala apụtaghị ihe ọbụịla n'oge gara aga. O gwara ulooru ntaakuko Sun si: 'E kwela Ndigbo otutu nkwa di otu a n'oge gara aga, aghogbukwara ndi be anyi. Ọ gwara ụlọọrụ ntaakụkọ Sun sị: 'E kwela Ndigbo ọtụtụ nkwa dị otu a n'oge gara aga, aghọgbukwara ndị be anyị. O buru na mmadu ghogbuo gi ugboro abuo ma o bu ato, o bia nke ano, i cheba echiche ime. Ọ bụrụ na mmadụ ghọgbụo gị ụgboro abụọ ma ọ bụ atọ, ọ bịa nke anọ, i cheba echiche ime. Ike ala a agwula mmadu. Ike ala a agwụla mmadụ. Ikedife gara n'ihu kwuo si : 'Ihe bu mkpa m bu otu a ga-esi gbaso iwu na mkparitauka nweta Biafra na alughi ogu maobu kpalia onye obula.' Ikedife gara n'ihu kwuo sị : 'Ihe bụ mkpa m bụ otu a ga-esi gbaso iwu na mkparitaụka nweta Biafra na alụghị ọgụ maọbụ kpalia onye ọbụla.' Cheta n'afo 2015, otutu Ndigbo atunyerighi Buhari akwukwo ntuliaka nke mere ka mere o jiri si na ya aghi nye ndi nyere nkwado pasent 95 na ndi nyere ya pasent ise otu ugwo, okwu otutu na-eche o mezuru site ndi o nyere okwa ochichi kemgbe o banyere n'ochichi. Cheta n'afọ 2015, ọtụtụ Ndigbo atụnyerịghị Buhari akwụkwọ ntuliaka nke mere ka mere o jiri si na ya aghị nye ndị nyere nkwado pasent 95 na ndị nyere ya pasent ise otu ụgwọ, okwu ọtụtụ na-eche o mezuru site ndị o nyere ọkwa ọchịchị kemgbe ọ banyere n'ọchịchị. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmonwu wakporo ulouka Katolik n'Anambara Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Umuaka ruru puku iri asato na asato nwere ike inwu n'oke aguu Ụmụaka ruru puku iri asatọ na asatọ nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndi ochiehi egbuola mmadu 20 Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Nwoke gba oto awakpoola ulooriri na mba Amerika Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri na mba Amerịka Ndi uweoji na-acho otu nwoke wakporo ndi na-eri nri gbuo mmadu ano ebe mmadu ano ndi ozo meruru ahu. Ndị uweoji na-achọ otu nwoke wakporo ndị na-eri nri gbuo mmadụ anọ ebe mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ. Ulooriri ebe ihe ahu mere Ụlọọriri ebe ihe ahụ mere Ndi uweoji chotara egbe eji wakpo ulooriri a Ndị uweoji chọtara egbe eji wakpo ụlọọriri a Ndi uweo ji kwuru na otu nwoke gba oto egbuola mmadu ano n'ulooriri di n'obodo Nashville na mba Amerika. Ndị uweo ji kwuru na otu nwoke gba ọtọ egbuola mmadụ anọ n'ụlọoriri dị n'obodo Nashville na mba Amerịka. Nwoke ahu tibara n'ime ulooriri ahu ebe elekere asato nke ututu n'Antioch ma malite i gba ndi mmadu egbe. Nwoke ahụ tibara n'ime ụlọoriri ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'Antioch ma malite ị gba ndị mmadụ egbe. Mmadu ano ndi ozo merukwara ahu tupu onye ozo na-eri nri ebe ahu anapu ya egbe oji, o we gbapu oso. Mmadụ anọ ndị ọzọ merụkwara ahụ tupu onye ọzọ na-eri nri ebe ahụ anapụ ya egbe oji, o we gbapụ ọsọ. Ndi uweoji enyela aha nwoke ahu ka Travis Reinking di afo iri abuo n'itoolu bu onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-acho ya. Ndị uweoji enyela aha nwoke ahụ ka Travis Reinking dị afọ iri abụọ n'itoolu bụ onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-achọ ya. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị Mmonwu wakporo ulouka Katolik n'Anambara Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Umuaka ruru puku 88 nwere ike inwu n'oke aguu Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndi ochiehi egbuola mmadu 20 Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 Soyinka: Saanu anya mmiri na 2019 Soyinka: Saanụ anya mmiri na 2019 Wole Soyinka Wole Soyinka Onye nwere nzere Nobel bu Wole Soyinka ekwuola na ezi ochichi akpuola afo n'ala na Naijiria. Onye nwere nzere Nobel bụ Wole Soyinka ekwuola na ezi ọchịchị akpụọla afọ n'ala na Naijiria. Wole Soyinka adoro ndi Naijiria aka na nti ka ha Wole Soyinka adọrọ ndị Naijiria aka na ntị ka ha Wole Soyinka bukwa odee akwukwo a mara amara adoola ndi Naijiria aka na nti ka ha saa anya mmiri ghara ikwe ka ndi ndoondoro ochichi ghogbu ha ozo na ntuliaka na-abia n'afo 2019. Wole Soyinka bụkwa odee akwụkwọ a mara amara adọọla ndị Naịjirịa aka na ntị ka ha saa anya mmiri ghara ikwe ka ndị ndọọndọrọ ọchịchị ghọgbu ha ọzọ na ntuliaka na-abịa n'afọ 2019. Soyinka, onye nke kwuru nke a ubochiuka n'emume ncheta omumu onye okaiwu a mara amara nwuru anwu bu Gani Fawehinmi nke e mere na Legos kwuru na obodo Naijiria na ochichi onyekwuoucheya no na nsogbu ugbua. Soyinka, onye nke kwuru nke a ụbọchịụka n'emụme ncheta ọmụmụ onye ọkaiwu a mara amara nwụrụ anwụ bụ Gani Fawehinmi nke e mere na Legọs kwuru na obodo Naijiria na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu ugbua. O si na ndi tinyere Naijiria na nsogbu o no na ya ugbua site na atumatu ha, e jikerela onwe ha ozo dika ndi nzoputa ka ntuliaka na-abia, ma duo ndi Naijiria odu ka ha ju ndi ndorondoro ochie iji nye ohere ka ndi agba ohuru were ochichi. Ọ si na ndị tinyere Naịjirịa na nsogbu ọ nọ na ya ugbua site na atụmatụ ha, e jikerela onwe ha ọzọ dịka ndị nzọpụta ka ntuliaka na-abịa, ma dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha jụ ndị ndọrọndọrọ ochie iji nye ohere ka ndị agba ọhụrụ were ọchịchị. Buhari na ndi isi otu APC enwela mkparita uka Buhari na ndị isi otu APC enwela mkparịta ụka Wole Soyinka: Chikotanu onwe unu onu ka okenye zuo ike Wole Soyinka: Chikọtanụ onwe ụnụ ọnụ ka okenye zuo ike O siri: 'A naghi enyo ya enyo na ochichi onyekwuoucheya no na nsogbu. Ọ sịrị: 'A naghị enyo ya enyo na ọchịchị onyekwuoucheya nọ na nsogbu. O bughi soso ochichi onyekwuoucheya, obodo anyi no na nsogbu. Ọ bụghị sọsọ ọchịchị onyekwuoucheya, obodo anyi nọ na nsogbu. Echeghi m na o nwere oge na ndu niile n'uwa , okachasi n'ala a oge nchere ihe niile dakporo adako otu a. Echeghị m na o nwere oge na ndụ niile n'ụwa , ọkachasị n'ala a oge nchere ihe niile dakpọrọ adakọ otu a. Anyi niile maa nke a. Anyị niile maa nke a. "Ajuju bu anyi ana-ahu ya dika ohere nzoputa ka anyi a na ahu ya ha ohere i ga n'ihu na-eme ihe ndi ahu mere na ala anyi na akpu afo n'ala? " "Ajụjụ bụ anyị ana-ahụ ya dịka ohere nzọpụta ka anyị a na ahụ ya ha ohere ị ga n'ihu na-eme ihe ndị ahụ mere na ala anyị na akpụ afọ n'ala? " "O bughi akuko ohuru mkpa o di imee ihe ga-azo idikonotu ala Naijiria. " "Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ mkpa ọ dị imee ihe ga-azọ ịdịkọnotu ala Naijiria. " O bu ihe mgbagwojuanya na ndi bu ndi iro ochichi onyekwuoucheya ndi ji aka ha webata atumatu nke butere anyi n'onodu anyi no taa bu ndi putara na egosi onwe ha dika ndi nzoputa nke ala Naijiria na-ele anya, obodo nweere onuogugu mmadu nde 200.' Ọ bụ ihe mgbagwojuanya na ndị bụ ndị iro ọchịchị onyekwuoucheya ndị ji aka ha webata atụmatụ nke butere anyị n'ọnọdụ anyị nọ taa bụ ndị pụtara na egosi onwe ha dịka ndị nzọpụta nke ala Naijiria na-ele anya, obodo nweere ọnụọgụgụ mmadụ nde 200.' Soyinka gara n'ihu duo ndi Naijiria odu ka ha saa anya mmiri iji gbalahu. Soyinka gara n'ihu dụọ ndị Naijiria ọdụ ka ha saa anya mmiri iji gbalahụ. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Mmonwu wakporo ulouka Katolik n'Anambara Mmọnwụ wakpọrọ ụlọụka Katolịk n'Anambara Umuaka ruru puku 88 nwere ike inwu n'oke aguu Ụmụaka ruru puku 88 nwere ike ịnwụ n'oke agụụ Benue: Ndi ochiehi egbuola mmadu 20 Benue: Ndị ọchịehị egbuola mmadụ 20 "O gbara m gharii na ka a na-ekwu okwu izoputa ala Naijiria, otu otu maobu abuo putara ndi nwere ndi no n'isi ya na eso. " "Ọ gbara m gharịị na ka a na-ekwu okwu ịzọpụta ala Naijiria, otu otu maọbụ abụọ pụtara ndị nwere ndị nọ n'isi ya na eso. " A na ma agwa ndi mmadu ka ha na-enyo ha enyo n'ihi ndi na awanye onwe ha na otu ndia bu ndi soro dowe Naijiria na onodu ochichi onyekwuoucheya no taa. A na ma agwa ndị mmadụ ka ha na-enyo ha enyo n'ihi ndị na awanye onwe ha na otu ndịa bụ ndị soro dowe Naijiria na ọnọdụ ọchịchị onyekwuoucheya nọ taa. Kedu ihe mere ndi Naijiria agaghi nzuko mgbere n'Amerika? Kedu ihe mere ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ mgbere n'Amerịka? Goomenti Naijiria agorola onu ha maka ihe mere na nzuko ndi choro itinye ego na Naijiria na ndi minista nwere n'Amerika. Gọọmentị Naịjirịa agọrọla ọnu ha maka ihe mere na nzụkọ ndị chọrọ itinye ego na Naịjirịa na ndị minista nwere n'Amerịka. Yemi Osibanjo na Abuja Yemi Osibanjo na Abuja Yemi Osibanjo so na ndi aha di n'akwukwo eji hazie ha bu nzuko Yemi Osibanjo so na ndị aha dị n'akwụkwọ eji hazie ha bụ nzụkọ Otutu ndi na-anochite anya goomenti Naijiria aturuanya na ha no n'ogbako ulooru na-ahu maka Naijiria na mba Amerika haziri n'obodo Washington DC egosighi ihu na ya bu emume. Ọtụtụ ndị na-anọchịte anya gọọmentị Naịjirịa atụrụanya na ha nọ n'ọgbakọ ụlọọrụ na-ahụ maka Naịjirịa na mba Amerịka haziri n'obodo Washington DC egosịghị ihu na ya bu emume. Obibia ndi goomenti ahu abiaghi mere ka ndi mmadu na-enwe itunanya na Naijiria agaghi enweta ntunye ego site na mba ofesi. Ọbịbịa ndị gọọmentị ahụ abịaghị mere ka ndị mmadụ na-enwe ịtụnanya na Naịjirịa agaghị enweta ntunye ego site na mba ofesi. Ndi kwesiri iga ebe ahu gunyere osote onyeisiala bu Yemi Osinbajo, minista na-ahu maka ego bu Kemi Adeosun, minista nke mmanu agbidi bu Ibe Kwachukwu, minista nke oruugbo bu Audu Ogbeh, minista nke tecknuzu bu Ogbonnaya Onu, minista mgbasaozi bu Lai Mohammed, minista nke okwute ndi bara uru bu Kayode Fayemi na minista nke mgbere bu Okechukwu Enelamah. Ndị kwesiri ịga ebe ahu gunyere osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun, mịnịsta nke mmanụ agbịdị bụ Ibe Kwachukwu, mịnịsta nke ọrụugbo bu Audu Ogbeh, mịnịsta nke tecknụzụ bụ Ogbonnaya Onu, mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed, mịnịsta nke okwute ndị bara uru bụ Kayode Fayemi na mịnịsta nke mgbere bụ Okechukwu Enelamah. Utu anwuru na mmanya etinyela ego Ụtụ anwụrụ na mmanya etinyela ego Switzerland ekwetala iweghachite ego Abacha buuru Switzerland ekwetala iweghachite ego Abacha buuru Otu onye ihe a ndi goomenti mere na-ewute bu Emir nke Kano Sanusi Lamido, bu onye ruburu oru ka onye nhazi uloaku ukwu na Naijiria. Otu onye ihe a ndị gọọmentị mere na-ewute bụ Emir nke Kano Sanusi Lamido, bụ onye rụbụrụ ọrụ ka onye nhazi ụlọakụ ukwu na Naịjirịa. Ihe Sanusi kwuru Ihe Sanusi kwuru Sanusi kwuru na onye na-akwado itinye ego n'Afirika, 'o nwere Naijiria, onwere Gana, o nwere Ruwanda, Kenya na Sawut Afirika'. Sanụsi kwuru na onye na-akwado itinye ego n'Afịrịka, 'o nwere Naijirịa, onwere Gana, o nwere Rụwanda, Kenya na Sawụt Afịrịka'. O gakwara n'ihu kwuo, 'Naijiria nwere ike karia ndi ozo niile n'itu mgbere, mana o nwere ike si kama ya ga etinye dola 500 na Naijiria, ka m tinye dola 100 na Ghana, dola 100 na Ruwanda, dola 100 na Code Vuwa, ka o nweta nrite mgbasa aka.' Ọ gakwara n'ihu kwuo, 'Naịjirịa nwere ike karịa ndi ọzọ niile n'ịtụ mgbere, mana o nwere ike sị kama ya ga etinye dọla 500 na Naịjirịa, ka m tinye dọla 100 na Ghana, dọla 100 na Rụwanda, dọla 100 na Code Vuwa, ka o nweta nrite mgbasa aka.' "Anyi gara ka anyi na ndi nwere ego ha na-etinye na mba mee nzuko, anyi kwesiri ibido na elekere itoolu, anyi wee bido na elekere iri. " "Anyị gara ka anyị na ndị nwere ego ha na-etinye na mba mee nzụkọ, anyị kwesiri ibido na elekere itoolu, anyị wee bido na elekere iri. " "Mgbe m ruru ebe ahu, ha kporo m ga n'ulooro onye na-anochite anya Naijiria. " "Mgbe m ruru ebe ahụ, ha kpọrọ m ga n'ụlọọrọ onye na-anọchịte anya Naịjirịa. " Ndi biara nzuko ahu no ebe ahu, osote onyeisiala anoghi, ndi minista anoghi, Sanusi kwuru. Ndị bịara nzụkọ ahụ nọ ebe ahụ, osote onyeisiala anọghị, ndị mịnịsta anọghị, Sanusi kwuru. Sanusi si na ihe a mere adighi mma, maka na o na-egosi na Naijiria adibeghi nkwadobe maka ihe a na-ekwu okwu ya. Sanusi sị na ihe a mere adịghị mma, maka na ọ na-egosi na Naịjirịa adịbeghi nkwadobe maka ihe a na-ekwu okwu ya. O kwuru, 'Unu kporo ndi mmadu ka ha bia nuru etu e si atu mgbere na Naijiria, mana unu abiaghi. O kwuru, 'Unu kpọrọ ndị mmadụ ka ha bịa nụrụ etu e si atụ mgbere na Naịjirịa, mana unu abịaghị. Obughi etu a ka esi enwete ndi ga-etinye ego na Naijiria. Ọbụghi etu a ka esi enwete ndị ga-etinye ego na Naịjirịa. Ya buru na o bu ndi Ruwanda haziri ogbako a, onyeisiala ha bu Kagame ga-ano ebe ahu na-agwa ndi mmadu biawa Ruwanda. Ya bụrụ na ọ bụ ndị Rụwanda haziri ọgbakọ a, onyeisiala ha bu Kagame ga-anọ ebe ahụ na-agwa ndi mmadụ bịawa Rụwanda. Ndi mmadu tinyekwere onu n'okwu a na soshal midia. Ndị mmadụ tinyekwere ọnụ n'okwu a na soshal midia. Onye nwere akara @SegunAndrews kwenyere n'ihe Sanusi kwuru. Onye nwere akara @SegunAndrews kwenyere n'ihe Sanusi kwuru. Mana, goomenti ekwuola na obughi etu a ka ha bu ihe siri ga. Mana, gọọmentị ekwuola na ọbụghị etu a ka ha bụ ihe siri ga. Lai Mohammed bu minista na-ahu maka mgbasaozi zipuru ozi na-akowa na o bughi eziokwu na ndi kwesiri iga ya bu nzuko agaghi. Laị Mohammed bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi zipuru ozi na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na ndị kwesịrị ịga ya bụ nzụkọ agaghị. Mohammed na-akowa na ndi minista aha ha di n'emume a enwetaghi akwukwo e ji si ha bia ya, maobu nodu na Washintin DC mgbe ogbako a na-eme. Mohammed na-akọwa na ndị mịnịsta aha ha dị n'emume a enwetaghị akwụkwọ e ji si ha bịa ya, maọbụ nọdụ na Washịntịn DC mgbe ọgbakọ a na-eme. O kwuru na minista oruugbo, nke oku latrik na oru na nke okike ego na-ahazi enwetaghi akwukwo agbanyeghi na aha ha di n'akwukwo ndi ga-ekwu okwu na ya bu ogbako. O kwuru na mịnịsta ọrụugbo, nke ọkụ latrik na ọrụ na nke okike ego na-ahazi enwetaghi akwụkwọ agbanyeghị na aha ha dị n'akwụkwọ ndị ga-ekwu okwu na ya bụ ọgbako. Minista nke mgbere na onwe ya so onyeisiala gawa nzuko ndi na-achi mba ndi so na Commonwealth bi na London. Mịnịsta nke mgbere na onwe ya so onyeisiala gawa nzụkọ ndị na-achị mba ndị so na Commonwealth bi na London. Minista na-ahu maka ego no na Washintin DC, mana o bu maka nzuko ndi uloaku uwa na IMF. Mịnịsta na-ahu maka ego nọ na Washịntịn DC, mana ọ bụ maka nzụkọ ndị ụlọakụ ụwa na IMF. O gakwara n'ihu kwuo na minista na-ahu maka mgbasa ozi na omenala nwetere akwukwo, mana o zara ya were gwa ndi na-ahazi ogbako a na ya agaghi aganwu maka ihe ndi ozo aka ya di na ya. Ọ gakwara n'ihu kwuo na mịnịsta na-ahu maka mgbasa ozi na omenala nwetere akwukwọ, mana ọ zara ya were gwa ndị na-ahazi ọgbako a na ya agaghị aganwu maka ihe ndị ọzọ aka ya di na ya. Lai Mohammed kwuru na 'Ihe ndi a gosiri na e kwesighi ikwu na ndi Minista ekweghi iga ya bu nzuko. Lai Mohammed kwuru na 'Ihe ndị a gosiri na e kwesịghị ikwu na ndị Minista ekweghi ịga ya bu nzụkọ. Ekwela ka Igbo nwuo' Ekwela ka Igbo nwụọ' Ikeogu Oke ritere puku dola 100 dika onye okachasi ede mbem na Naijira n'afo 2017. Ikeogu Oke ritere puku dọla 100 dịka onye ọkachasị ede mbem na Naịjira n'afọ 2017. Onye ritere ihe nrite dika onye bu okachasi n'ide akwukwo na Naijiria n'afo 2017 bu Ikeogu Oke ekwuola na asusu Igbo agaghi anwu ma ndi Igbo kpoo ya mkpa. Onye ritere ihe nrite dịka onye bụ ọkachasị n'ide akwụkwọ na Naịjirịa n'afọ 2017 bụ Ikeogu Oke ekwuola na asụsụ Igbo agaghị anwụ ma ndị Igbo kpọọ ya mkpa. Ikeogu ritere ego puku dola 100 dika onye kachasi ede mbem na Naijiria nke a kporo 'Nigerian Prize of Literature' maka akwukwo ya o kporo “The Heresiad”. Ikeogu ritere ego puku dọla 100 dịka onye kachasị ede mbem na Naịjirịa nke a kpọrọ 'Nigerian Prize of Literature' maka akwụkwọ ya ọ kpọrọ “The Heresiad”. Ihe mere akwukwo ahu odi iche bu na o dere ya n'usoro ndi Igbo ji agu mbem. Ihe mere akwụkwọ ahụ ọdị iche bụ na o dere ya n'usoro ndị Igbo ji agụ mbem. Na mkparita uka ya na BBC Igbo nwere, Maazi Oke kwuru okwu gbasara nchekwa asusu Igbo, na onye o chere na o kwesiri idi n'aka ya. Na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere, Maazị Oke kwuru okwu gbasara nchekwa asụsụ Igbo, na onye o chere na o kwesịri ịdị n'aka ya. Goomenti etiti ekwuola ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee Gọọmentị etiti ekwuola ihe a ga-eji ego Abacha zuru mee Kemi Adeosun bu minista na-elekota ihe gbasara ego ekwuola ihe goomenti etiti ga-eji ego Abacha mee na Naijiria. Kemi Adeosun bụ minista na-elekọta ihe gbasara ego ekwuola ihe gọọmentị etiti ga-eji ego Abacha mee na Naịjirịa. Kemi Adeosun na Christine Lagarde bu onyeisi oche na IMF Kemi Adeosun na Christine Lagarde bụ onyeisi oche na IMF Goomenti Naijiria akwadola iji ihe kariri dolla nde dolla nari ato bu ego Abacha zuru nke goomenti Swiss weghachitere ga-eme. Gọọmentị Naijiria akwadola iji ihe kariri dọlla nde dọlla narị atọ bụ ego Abacha zuru nke gọọmentị Swiss weghachitere ga-eme. Minista na-ahu maka ihe gbasara ego bu Kemi Adeosun ekwuola na a ga-eji ego ahu zuo ndi ubiam dika Onyeisiala Buhari kwere na nkwa mgbe o na-azo ochichi. Minista na-ahụ maka ihe gbasara ego bụ Kemi Adeosun ekwuola na a ga-eji ego ahụ zụọ ndị ụbiam dịka Onyeisiala Buhari kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị. O kwuru nke a ebe o na-ezi ndi ntaakuko ozi na ngwucha nzuko ngalaba na-eke ego n'uwa niile bu IMF na-aha ichafu nke mere n'obodo Washington na Amerika. O kwuru nke a ebe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi na ngwucha nzụkọ ngalaba na-eke ego n'ụwa niile bụ IMF na-aha ịchafụ nke mere n'obodo Washington na Amerịka. Adeosun si kwa na-etinyela ego a n'akpa puruiche n'uloaku Niajiria a kporo CBN n'aha ichafu iji bido meputa atumatu ndi ga-enyere ndi ogbenye aka. Adeosun sị kwa na-etinyela ego a n'akpa pụrụiche n'ụlọakụ Niajiria a kpọrọ CBN n'aha ịchafụ iji bido mepụta atụmatụ ndị ga-enyere ndị ogbenye aka. Utu anwuru na mmanya etinyela ego Ụtụ anwụrụ na mmanya etinyela ego Ndi sineti akpoola onyeisi uloaku ukwu Ndị sinetị akpọọla onyeisi ụlọakụ ukwu Na ozi o na-agbasa, o si na goomenti etiti nwere olileanya na ha meputa atumatu ha bu n'obi, n'ihe ga na-adiri Naijiria mma. Na ozi ọ na-agbasa, ọ sị na gọọmentị etiti nwere olileanya na ha mepụta atụmatụ ha bu n'obi, n'ihe ga na-adịri Naịjiria mma. N'olu ya 'Anyi tinye atumatu ndi a na mmeputa, aku na uba obodo Naijiria ga-ari elu' N'olu ya 'Anyị tinye atụmatụ ndị a na mmepụta, akụ na ụba obodo Naịjiria ga-arị elu' Kedu ihe Naijiria na-erite na CHOGM? Kedu ihe Naịjirịa na-erite na CHOGM? Nwaafo Igbo emeriela Big Brother Naija Nwaafọ Igbo emeriela Big Brother Naija Ndi Naijiria agaghi nzuko n'Amerika? Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka? Ihe ato inwe otutu onu mgbanwe ego na-ebute Ihe atọ inwe ọtụtụ ọnụ mgbanwe ego na-ebute IMF gwara Naijiria ka o chikota onu mgbanwe ego ya ka o buru otu, ebe ndi okacharamara na-ekwu oghom di na inwe otutu. IMF gwara Naijiria ka ọ chịkọta ọnụ mgbanwe ego ya ka ọ bụrụ otu, ebe ndị ọkacharamara na-ekwu ọghọm dị na inwe ọtụtụ. Naira Naira EFCC kwuru na Umar cho nde naira iri EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị Iji mee ka mgbanwe onu ego Naijiria kwudosie ike, IMF aduola Naijiria odu ka o jikota mgbanwe ego ya onu. Iji mee ka mgbanwe ọnụ ego Naijiria kwụdosie ike, IMF adụọla Naijiria ọdụ ka o jikọta mgbanwe ego ya ọnụ. Naijiria nwere opeka mpe mgbanwe ego ise ; otu maka ndi na-atubata mmanu ugboala na Najiria, otu maka ndi ukaalabukuba na-aga njem okwukwe na Saudi Arabia, otu maka ndi uka Kraist na-aga ala nso, ozo maka ndi na-agu akwukwo na mba ofesi na otu onu nke goomenti hiwere. Naijiria nwere opeka mpe mgbanwe ego ise ; otu maka ndị na-atụbata mmanụ ụgbọala na Najiria, otu maka ndị ụkaalabụkụba na-aga njem okwukwe na Saudi Arabia, otu maka ndị ụka Kraist na-aga ala nsọ, ọzọ maka ndị na-agụ akwụkwọ na mba ofesi na otu ọnụ nke gọọmenti hiwere. Dika ndi okacharamara n'okwu akunauba bu Pat Utomi na Uche Uwaleke siri kowara onyentakuko BBC, inwe otutu mgbanwe ego nwere oghom. Dịka ndị ọkacharamara n'okwu akụnaụba bụ Pat Utomi na Uche Uwaleke siri kọwara onyentakụkọ BBC, inwe ọtụtụ mgbanwe ego nwere ọghọm. Lee ufodu oghom inwe otutu mgbanwe ego: Lee ụfọdụ ọghọm inwe ọtụtụ mgbanwe ego: O na-ebute mmeruaka Ọ na-ebute mmerụaka Pat Utomi kowara na o na-eme ' Onye maa mmadu enwe ohere igote ego n'onuala ma were ya tuo mgbere, mana onye nwere mkpa ego ahu iji tubata ihe o ga-eji meputa ngwa ahia n'ala anyi na amaghi mmadu o gaghi eru ya aka. Pat Utomi kọwara na ọ na-eme ' Onye maa mmadụ enwe ohere igote ego n'ọnụala ma were ya tụọ mgbere, mana onye nwere mkpa ego ahụ iji tubata ihe ọ ga-eji mepụta ngwa ahịa n'ala anyị na amaghị mmadụ ọ gaghị eru ya aka. Odighi mma maka oganihu azumahia.' Ọdịghị mma maka ọganihu azụmahịa.' Ebe ego Abacha ga-aba Ebe ego Abacha ga-aba Mgbanwe ego: Dola odaala n'akuku Naira? Mgbanwe ego: Dọla ọdaala n'akụkụ Naịra? N'okwu ya, Uche Uwaleke nyere omumatu si, 'Dika onu ego mgbanwe nke goomenti bu N305, e resi mmadu n'onu ahu, o nwere ike hapu ihe a siri ya gote, resi ya onye ozo N365, nweta omurunwa. Mana o buru na e nwere otu mgbanwe ego, i gaghi enwe ike ireghari ya.' N'okwu ya, Uche Uwaleke nyere ọmụmatụ sị, 'Dịka ọnụ ego mgbanwe nke gọọmenti bụ N305, e resi mmadụ n'ọnụ ahụ, o nwere ike hapụ ihe a sịrị ya gote, resi ya onye ọzọ N365, nweta ọmụrụnwa. Mana ọ bụrụ na e nwere otu mgbanwe ego, ị gaghị enwe ike iregharị ya.' O na-emenyu oku itinye uchu na imeputa ihe n' obodo. Ọ na-emenyụ ọkụ itinye uchu na imepụta ihe n' obodo. Uwaleke siri na inwe mgbanwe ego di otutu na-eme otutu ha di uwengwu. Uwaleke sịrị na inwe mgbanwe ego dị ọtụtụ na-eme ọtụtụ ha dị uwengwụ. Sooso ihe ha ga na-eme bu ire ego di onuala, agahi na-enwe mmeputa ihe. Sọọsọ ihe ha ga na-eme bụ ire ego dị ọnụala, agahị na-enwe mmepụta ihe. O na eweda mmubanye akunauba obodo Ọ na eweda mmụbanye akụnaụba obodo Utomi kwuru na 'o buru na ndi mmadu na-enweta ego mgbanwe ego n'onu ala iji ziga nwa ha obodo oyibo maka igu akwukwo, o ga-eme ka onye obula choo iziga nwa ya obodo oyibo, ulo akwukwo ndi di n'obodo anyi ga akpu afo n'ala. Utomi kwuru na 'ọ bụrụ na ndị mmadụ na-enweta ego mgbanwe ego n'ọnụ ala iji ziga nwa ha obodo oyibo maka ịgụ akwụkwọ, ọ ga-eme ka onye ọbụla chọọ iziga nwa ya obodo oyibo, ụlọ akwụkwọ ndị dị n'obodo anyị ga akpụ afọ n'ala. Saraki na Ekweremadu: Ihe ndi mmadu na-ekwu maka mgbochi ha Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha Ekweremadu 'zoro akunauba ya' Ekweremadu 'zoro akụnaụba ya' E tinyela udo Naijiria n'aka Ekweremadu ozo E tinyela udo Naịjirịa n'aka Ekweremadu ọzọ Ndi omeiwu sineti di mmadi 109, o buru na mmadu 108 no na be Ekweremmadu ugbua, o putara na ha niile no na be ya. Ndị omeiwu sineti dị mmadị 109, ọ bụrụ na mmadụ 108 nọ na be Ekweremmadu ugbua, ọ pụtara na ha niile nọ na be ya. Cheta na uloomeiwu sineti kpebiri taa ka ndi oru nchekwa puo n'ulo osote onyeisi sineeti bu Ike Ekweremadu ozugbo, ebe ha wakporo taa. Cheta na ụlọomeiwu sineti kpebiri taa ka ndị ọrụ nchekwa pụọ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ebe ha wakporo taa. E gbochiri Ekweremadu iputa n'ulo ya n'ututu taa, mere ka o ghara ibia nzuko ndi uloomeiwu ukwu mere taa, ebe ndi omeiwu ruru 14 hapuru APC gafee PDP. E gbochiri Ekweremadu ịpụta n'ụlọ ya n'ụtụtụ taa, mere ka ọ ghara ịbịa nzukọ ndị ụlọomeiwu ukwu mere taa, ebe ndị omeiwu ruru 14 hapụrụ APC gafee PDP. Uche Anichukwu bu onu na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ndi EFCC gbochiri ya ipu n'ulo ya n'Abuja, na o bughi DSS dika anyi dere mbu. Uche Anichukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere Ekweremadu, gwara BBC Igbo na ndị EFCC gbochiri ya ịpụ n'ụlọ ya n'Abuja, na ọ bụghị DSS dịka anyị dere mbụ. @MrBanksOmishore bu onye enyemaka puruiche nke Bukola Saraki, deputara akwukwo ozi ndi EFCC ziteere Ekweremadu n'ututu a, na Twitter. @MrBanksOmishore bụ onye enyemaka pụrụiche nke Bukola Saraki, depụtara akwụkwọ ozi ndị EFCC ziteere Ekweremadu n'ụtụtụ a, na Twitter. N'ime akwukwo ozi ahu, EFCC kwuru na ha choro inyocha Ekweremadu maka ikpa nkata, mmeru ikike okwa ya nyere ya na ibupu ego nke Bekee kporo 'money laundering'. N'ime akwụkwọ ozi ahụ, EFCC kwuru na ha chọrọ inyocha Ekweremadu maka ịkpa nkata, mmerụ ikike ọkwa ya nyere ya na ibupu ego nke Bekee kpọrọ 'money laundering'. Ka Saraki banyere n'uloomeiwu ma bido 'plenary', o kwutere okwu na Ekweremdu abianwughi, ma kwuo na-ekwesiri igba mbo hu na ochichi onyekwuouche ya emebighi. Ka Saraki banyere n'ụlọomeiwu ma bido 'plenary', o kwutere okwu na Ekweremdu abịanwughị, ma kwuo na-ekwesịrị ịgba mbọ hụ na ọchịchị onyekwuouche ya emebighị. Omeiwu Sam Anyanwu kwuru na ya na Ekweremadu no unyaahu, mana onweteghi akwukwo gosiri na ndi uweojii na-acho ya. Omeiwu Sam Anyanwu kwuru na ya na Ekweremadu nọ ụnyaahụ, mana onweteghị akwụkwọ gosiri na ndị uweojii na-achọ ya. Ka e mechara 'plenary', ndi omeiwu kpebiri na ndi oru nchekwa kwesiri ipu n'ulo osote onyeisi sineeti bu Ike Ekweremadu ozugbo, ka o nwee ike rite ikike ruru ya. Ka e mechara 'plenary', ndị omeiwu kpebiri na ndị ọrụ nchekwa kwesịrị ịpụ n'ụlọ osote onyeisi sineeti bụ Ike Ekweremadu ozugbo, ka o nwee ike rite ikike ruru ya. N'ututu a, Saraki so na ndi egbochiri ipu n'ezi ulo ya. N'ụtụtụ a, Saraki so na ndị egbochiri ịpụ n'ezi ụlọ ya. N'aka ozo, onyeisi ala Naijiria bu Muhammadu Buhari kelere ndi siri na APC puo taa ka o gara ha nke oma. N'aka ọzọ, onyeisi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kelere ndị siri na APC pụọ taa ka ọ gara ha nke ọma. O kwuru nke a site na akara Twita ya bu @MBuhari: O kwuru nke a site na akara Twita ya bụ @MBuhari: Ndi EFCC gbochiri onuuzo Ekweremadu n'Abuja Ndị EFCC gbochiri ọnụụzọ Ekweremadu n'Abuja Ihe onyoonyo na-egosi ebe ndi EFCC chewere n'ihu ulo Ekweremadu: Ihe onyoonyo na-egosi ebe ndị EFCC chewere n'ihu ụlọ Ekweremadu: A maala ndi tooro ma gbuo ukochuckwu uka Katolik ikpe onwu A maala ndị tọọrọ ma gbuo ụkọchuckwu ụka Katolik ikpe ọnwụ Uloikpe ukwu amaala ndi toro ma gbuo Fada John Adeyi ikpe onwu site na nkwugbu. Ụlọikpe ukwu amaala ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi ikpe ọnwụ site na nkwugbu. Uloikpe enyela iwu ka akwugbu ndi omekome Ụlọikpe enyela iwu ka akwụgbu ndị omekome Ndi uloikpe ukwu di na Makurdi, Benue steeti ekpebiela ka a kwugbuo mmadu abuo, Hartuna Idi na Suleiman Gina bu ndi foro na ndi toro ma gbuo Fada John Adeyi rue oge ha nwuru maka ihe ha mere. Ndị ụlọikpe ukwu dị na Makurdi, Benue steeti ekpebiela ka a kwụgbuo mmadụ abụọ, Hartuna Idi na Suleiman Gina bụ ndị fọrọ na ndị tọrọ ma gbuo Fada John Adeyi rue oge ha nwụrụ maka ihe ha mere. Cheta na ndi ntoo mmadu ano gunyere Saidu Abdullahi na Aliyu Garba toro Fada Adeyi, onye Vika-Jenaraalu uka Katolik n'Otukpo Dayosis, Benue steeti, gbuo ya ma tufuo ozu ya n'ime ugbo di nso na Otukpo n'afo 2016. Cheta na ndị ntọọ mmadụ anọ gụnyere Saidu Abdullahi na Aliyu Garba tọrọ Fada Adeyi, onye Vika-Jenaraalụ ụka Katọlik n'Otukpo Dayosis, Benue steeti, gbuo ya ma tufuo ozu ya n'ime ugbo dị nso na Otukpo n'afọ 2016. Ihe m gabigara n'aka ndi nto Ihe m gabigara n'aka ndị ntọ A gbaputala nna Mikel Obi n'aka ndi nto ozokwa A gbapụtala nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ ọzọkwa Mana e mechara ndi uweojii nwuchie ha ano, ha kwuputa na ha natara ezinaulo ukochukwu ahu otu nde naira na uma(N1.7m) dika ego isi ya mana ha gbagburu ya oge ha nuru na ndi obodo jikere ibia gbaputa ya ebe ha nwuchiri ya. Mana e mechara ndị uweojii nwuchie ha anọ, ha kwupụta na ha natara ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ otu nde naira na ụma(N1.7m) dịka ego isi ya mana ha gbagburu ya oge ha nụrụ na ndị obodo jikere ịbịa gbapụta ya ebe ha nwụchiri ya. Otu n'ime ha kwuputara na o bu ya gbara ya egbe gburu ya, ebe a mara mamdu abuo foro n'ime ha ikpe onwu taa bu Wenezde. Otu n'ime ha kwupụtara na ọ bụ ya gbara ya egbe gburu ya, ebe a mara mamdụ abụọ fọrọ n'ime ha ikpe ọnwụ taa bụ Wenezde. N'ozi ezinaulo ukochukwu ahu zigara uloakuko Daily Post, ha gosiri afo ojuju na n'ikpeazu, ikpenkwumoto erutela ha aka. N'ozi ezinaụlọ ụkọchukwu ahụ zigara ụlọakụkọ Daily Post, ha gosiri afọ ojuju na n'ikpeazụ, ikpenkwụmọtọ erutela ha aka. Mana ha turu ariri na mkpebi ahu chetara ha ogbugbu n'ike e gburu Adeyi, onye bu okammuta. Mana ha tụrụ arịrị na mkpebi ahụ chetara ha ogbugbu n'ike e gburu Adeyi, onye bụ ọkammụta. Ndi sineti agbakutela Ekweremadu Ndị sineti agbakutela Ekweremadu Saraki na Ekweremadu: Ihe ndi mmadu na-ekwu maka mgbochi ha Saraki na Ekweremadu: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mgbochi ha APC na-akwu ugwo ochichi nchigbu ha na-achi - Okachamara APC na-akwụ ụgwọ ọchịchị nchịgbu ha na-achị - Ọkachamara O nwere mmuo bi na nwata bu isi dada puta uwa? O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa? Ihe omenala Igbo kwuru gbasara isi dada n'oge gboo na kwa ebumnuche sokwa ya ugbua. Ihe omenala Igbo kwuru gbasara isi dada n'oge gboo na kwa ebumnuche sokwa ya ugbua. N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ndi bu isi dada nwere ike ime anwansi N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ndị bu isi dada nwere ike ime anwansi Akwa nwata ohuru n'ulo obula na-ebute nnukwu onu n'obi onye obula. Akwa nwata ọhụrụ n'ụlọ ọbụla na-ebute nnukwu ọṅụ n'obi onye ọbula. Mana o nwere ufodu ebe n'ala Igbo ebe nwata ohuru a muru buru isi dada nwere ike ibute egwu. Mana o nwere ụfọdụ ebe n'ala Igbo ebe nwata ọhụrụ a mụrụ buru isi dada nwere ike ịbute egwu. Ndi obodo a dika Igbuzo(Ibusa) n'ime Delta steeti , ebe a na-ahu umuaka bu dada dika ndi puru iche. Ndị obodo a dịka Igbuzo(Ibusa) n'ime Delta steeti , ebe a na-ahụ ụmụaka bu dada dịka ndị pụrụ iche. Onye bu onye isi dada? Onye bụ onye isi dada? Akuko ufodu kowara na nwata a muru ohuru buru isi dada bu maka na nne ya rio otu mmuo bi n'ala a aririo ka o nye ya nwa. Akụkọ ụfọdụ kọwara na nwata a mụrụ ọhụrụ buru isi dada bụ maka na nne ya rịọ otu mmụọ bi n'ala a arịrịọ ka o nye ya nwa. I ga-egbu udiri ichi a egburu mgbe gboo? I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? I ma chi ndi Igbo na-efe n'oge gboo? Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ha nwere nkwenye na isi dada bu akara ndi mmuo kara nwata ahu nke ha ga-eji mara ya. Ha nwere nkwenye na isi dada bụ akara ndị mmụọ kara nwata ahụ nke ha ga-eji mara ya. Ha na-akpo umuaka a 'Ezenwa'. Ha na-akpọ ụmụaka a 'Ezenwa'. Ha nwere nkwenye na isi dada ha bu okpueze ha. Ha nwere nkwenye na isi dada ha bụ okpueze ha. Dika ka ha siri nwe nkwenye, nwata buru isi dada ga-abu nwata ga-eme nke oma n'uwa maka na chi ya kwusiri ike n'akuku ya, ha na-esi ezigbo ike, nakwa na ha ga-eto buru dike na-ebute nnukwu egwu n'oge agha. Dịka ka ha siri nwe nkwenye, nwata buru isi dada ga-abụ nwata ga-eme nke ọma n'ụwa maka na chi ya kwụsiri ike n'akụkụ ya, ha na-esi ezigbo ike, nakwa na ha ga-eto buru dike na-ebute nnukwu egwu n'oge agha. Mana otutu nsogbu na-eso ndi bu isi dada. Mana ọtụtu nsogbu na-eso ndi bụ isi dada. O na-afiahu i lekota isi dada nke oma Ọ na-afịahụ ị lekọta isi dada nke ọma Nso sonyere n'isi dada Nsọ sonyere n'isi dada Otutu n'ime ndi obodo a, nwere nkwenye na nwata buru isi dada ga-aria nnukwu oria maobu nwuo ma o buru na mboisi banye na ntutu ya. Ọtụtụ n'ime ndị ọbọdọ a, nwere nkwenye na nwata buru isi dada ga-arịa nnukwu ọrịa maọbụ nwụọ ma ọ bụrụ na mbọisi banye na ntụtụ ya. O bu aru imetu aka na ntutu onye bu isi dada. Ọ bụ arụ imetu aka na ntutu onye bu isi dada. Onye obula mere udi ihe a kwesiri inye nwata ahu ego n'aka ngwa ngwa ma o bu kedo ego ayoro n'isi ya. Onye ọbụla mere udi ihe a kwesiri inye nwata ahụ ego n'aka ngwa ngwa ma ọ bụ kedo ego ayọrọ n'isi ya. Sooso emume a ga-akwusi nwata ahu iria nnukwu oria. Sọọsọ emume a ga-akwụsị nwata ahụ ịrịa nnukwu ọrịa. O bu sooso nne nwata ahu nwere ike imetu ntutu nwata a nwere isi dada aka. Ọ bụ sọọsọ nne nwata ahụ nwere ike ịmetụ ntụtụ nwata a nwere isi dada aka. Emume okpukpe ikpu isi dada Emume okpukpe ịkpụ isi dada Akuko kwuru na o bu ndi dibia na-akpu isi nwata buru isi dada. Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị dibia na-akpụ isi nwata buru isi dada. Ugbua ndi ama ama n'ihe onyonyo na kwa otutu mmadu ji isi dada eme inyanga Ugbua ndị ama ama n'ihe onyonyo na kwa ọtụtụ mmadụ ji isi dada eme ịnyanga Nwata ahu ga-atoola eto, buru nwata na-ekwu okwu. Nwata ahụ ga-atoola eto, bụrụ nwata na-ekwu okwu. Ezinaulo ya ga-aju ya ihe o choro ka eji nwere kpu ya isi dada ya. Ezinaụlọ ya ga-ajụ ya ihe ọ chọrọ ka eji nwere kpụ ya isi dada ya. Ihe niile o choro n'ubochi ahu ka ha ga-enye ya. Ihe niile ọ chọrọ n'ụbọchi ahụ ka ha ga-enye ya. Uka Kraist Uka Kraist Ala Igbo niile bu ebe okwukwe ndi otu uka Kraist kwusiri nke oma. Ala Igbo niile bụ ebe okwukwe ndị otu ụka Kraist kwusiri nke ọma. Ihe a emeela ka otutu omenaala Igbo gbanwe agbanwe. Ihe a emeela ka ọtụtụ omenaala Igbo gbanwe agbanwe. Ugbua otutu ndi umuafo Igbo ekweteghi na ajo mmuo bi n'ime nwata obula buru isi dada puta n'uwa. Ugbua ọtụtụ ndị umụafọ Igbo ekweteghị na ajọ mmụọ bi n'ịme nwata ọbụla buru isi dada pụta n'ụwa. Mana ha ka na-akporo udi nwata ahu gawa ulouka ka ndi ukochukwu mere ya ekpere. Mana ha ka na-akpọrọ ụdị nwata ahụ gawa ụlọụka ka ndị ụkọchukwu mere ya ekpere. Dokita Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo na isi dada bu ihe na-esite na agburu ezinaulo ahu. Dọkịta Anthony Mgbolu gwara BBC Igbo na isi dada bụ ihe na-esite na agbụrụ ezinaụlọ ahụ. Ihe omenaala Igbo kowara maka ndi isi dada Ihe omenaala Igbo kọwara maka ndị isi dada Okachamara n'ihe omumu gbasara Afrika na asusu na Mahadum University of Lagos bu Chiagozie Nnabuihe kowara BBC Igbo na ala Igbo n'oge gboo enweghi nkwenye obula gbasara ndi bu isi dada. Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum University of Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na ala Igbo n'oge gboo enweghị nkwenye ọbụla gbasara ndị bu isi dada. Nnabuihe kwusiri ike na o buru na Igbo n'oge gboo nwere nkwenye n'isi dada ha kwesiri inye ya aha. Nnabuihe kwusiri ike na ọ bụrụ na Igbo n'oge gboo nwere nkwenye n'isi dada ha kwesiri inye ya aha. N'onu okwu ya: 'Dada bu aha ndi yoruba nyere ya. N'ọnụ okwu ya: 'Dada bụ aha ndị yoruba nyere ya. Ndi Igbo na-aso isi dada bu maka a ha na ndi Yoruba enweela mmekorita.' Ndị Igbo na-asọ isi dada bụ maka a ha na ndị Yoruba enweela mmekọrịta.' Mana isi dada o bu ihe ojoo n'ezie? Mana isi dada ọ bụ ihe ọjọọ n'ezie? Nnamdi Daniels bu onye na-eme ihe nkiri Nnamdi Daniels bụ onye na-eme ihe nkiri Otutu ndi mmadu anyi gbara ajuju onu kwuru na o nweghi ihe ojoo di n'isi dada mana n'ezi e, otutu mmadu ka na-ele ndi bu isi dada dika ndi na-eme agwaa ojoo. Ọtụtụ ndị mmadụ anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na o nweghị ihe ọjọọ dị n'isi dada mana n'ezi e, ọtụtụ mmadụ ka na-ele ndị bu isi dada dịka ndị na-eme agwaa ọjọọ. Nnamdi Daniels bu nwoke bu isi dada gwara BBC Igbo na o hushiela anya maka mkpari ha na akpari ya maka isi dada ya. Nnamdi Daniels bụ nwoke bu isi dada gwara BBC Igbo na ọ hushiela anya maka mkparị ha na akparị ya maka isi dada ya. N'onu okwu ya: 'Echetera'm otu oge m mere njem gawa mahadum nke Niger Steeti. N'ọnụ okwu ya: 'Echetera'm otu oge m mere njem gawa mahadum nke Niger Steeti. Onye nchekwa bidoro igba m ajuju gbagwojuru m anya maka isi dada m. Ihe a butere m nnukwu ihere.' Onye nchekwa bidoro ịgba m ajụjụ gbagwojuru m anya maka isi dada m. Ihe a butere m nnukwu ihere.' Goomenti ekpochapuola ogwu ukwara Codiene kariri nde abuo Gọọmentị ekpochapụọla ọgwụ ụkwara Codiene kariri nde abụọ Ministri na-ahu maka ahu ike ejideela ogu ukwara codien kariri nde abuo na kwa na-eleba anya na ndi ozo Ministri na-ahụ maka ahụ ike ejideela ọgụ ụkwara codien karịrị nde abụọ na kwa na-eleba anya na ndị ọzọ Ogwu Codiene Ọgwụ Codiene umu ntorobia na anubiga ogwu codiene oke ụmụ ntorobia na aṅụbiga ogwu codiene oke Goomenti etiti ekwuola na ha ekpochapula ogwu ukwara codiene kariri nde abuo n'ime ahia na Naijiria. Gọọmentị etiti ekwuola na ha ekpochapụla ọgwụ ụkwara codiene karịrị nde abụọ n'ime ahịa na Naịjirịa. Minista na-ahu maka ahuike bu Okammuta Isaac Adewole kwuru nke a mgbe komitee ulooru ya ihebere ilabaanya na nsogbu Codiene biara igosi ya nchoputa ha. Minista na-ahụ maka ahụike bụ Okammụta Isaac Adewole kwuru nke a mgbe kọmitee ulọọrụ ya ihebere ịlabaanya na nsogbu Codiene bịara ịgosi ya nchọpụta ha. O kwukwara na nke a bu maka i gosi na goomenti kwusiri ike na ebumnuche ha imachi ogu codiene na Naijiria. O kwukwara na nke a bụ maka ị gosi na gọọmentị kwusiri ike na ebumnuche ha imachi ọgụ codiene na Naịjirịa. Mmachi Codeine: Ogwu ukwara adaala onu Mmachi Codeine: Ọgwụ ụkwara adaala ọnụ Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndi ozo Nafdac ebuliela mmachi Emzor na ndị ọzọ Adewole kwuru na ulooru ya na ngalaba na-ahu maka nri na ogwu ha kporo National Agency for Food and Drug Administration and Control na Bekee bu ndi rukotara oru na mkpochapu a. Adewole kwuru na ụlọọrụ ya na ngalaba na-ahụ maka nri na ọgwụ ha kpọrọ National Agency for Food and Drug Administration and Control na Bekee bụ ndị rụkọtara ọrụ na mkpochapụ a. Cheta n'ime Mee nke afo a, BBC nweputara ihe onyonyo gosiri mkpamkpa ogwu ukwara codiene na-akpa na Naijiia. Cheta n'ịme Mee nke afọ a, BBC nwepụtara ihe onyonyo gosiri mkpamkpa ọgwụ ụkwara codiene na-akpa na Naịjiịa. O bu oge ihe onyonyo a putara ka goomenti kwuru na ha ga-amachi orire na onunu ogwu ukwara a. Ọ bụ oge ihe onyonyo a pụtara ka gọọmentị kwuru na ha ga-amachị ọrịre na ọṅunụ ọgwụ ụkwara a. Goomenti na-ekwu na ha ka na-elebaanya n'ogwu ukwara ndi ozo bu oto m ogbu m. Gọọmentị na-ekwu na ha ka na-elebaanya n'ọgwụ ụkwara ndị ọzọ bụ ọtọ m ogbu m. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị 2019 Election: Lee ufodu umuafo Igbo choro izo okwa onyeisiala 2019 Election: Lee ụfọdụ ụmụafọ Igbo chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Gini kpatara ndi Igbo ji agakari ulouka ndi a? Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a? Ihe mere Igbo ji achupu mmadu n'ajo ohia Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa Ajo ohia bu ebe Igbo na-efe ala mana o bu mmegbu ka ha na-emegbu ndi ha supu n'ohia a? Ajọ ọhịa bụ ebe Igbo na-efe ala mana ọ bụ mmegbu ka ha na-emegbu ndị ha sụpụ n'ọhịa a? Ndi mmanwu Ndị mmanwụ Igbo na-efe mmuo di iche iche Igbo na-efe mmụọ dị iche iche Gini mere Igbo jiri kpo ajo ohia ajo ohia? Gịnị mere Igbo jiri kpọ ajọ ọhịa ajọ ọhịa? I mara na ajo ohia ka noro ruo ugbua n'ala Igbo? Ị mara na ajọ ọhịa ka nọrọ ruo ugbua n'ala Igbo? Gini bu ajo ohia? Gịnị bụ ajọ ọhịa? Okachamara n'ihe omumu gbasara Afrika na asusu na Mahadum nke Lagos bu Chiagozie Nnabuihe kowara BBC Igbo na Igbo kporo ebe a ohia mmuo, obughi ajo ohia dika otutu mmadu na-akpo ya ugbua. Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum nke Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na Igbo kporọ ebe a ọhịa mmụọ, ọbụghị ajọ ọhịa dịka ọtụtụ mmadụ na-akpọ ya ugbua. Dika Igbo siri were nkwenye, ohia mmuo bu ebe ha na-efe chi biri n'Ala. Dịka Igbo siri were nkwenye, ọhịa mmụọ bụ ebe ha na-efe chi biri n'Ala. Ebe a burukwa ebe ha na-asupu onyeobula Ala buru onu. Ebe a burukwa ebe ha na-asụpụ onyeọbụla Ala bụrụ ọnụ. N'ala Igbo Chukwu kachasi mkpa, mana mmuo na-eso ya bu Ala. N'ala Igbo Chukwu kachasị mkpa, mana mmụọ na-eso ya bụ Ala. Nnabuihe kowara na ala Igbo were nkwenye na Ala bu mmuo muputara ihe niile di n'uwa. Nnabuihe kọwara na ala Igbo were nkwenye na Ala bụ mmụọ mụpụtara ihe nịịle dị n'ụwa. O nwere mmuo bi na nwata bu isi dada puta uwa? O nwere mmụọ bi na nwata bu isi dada pụta ụwa? I ga-egbu udiri ichi a egburu mgbe gboo? I ga-egbu ụdịrị ichi a egburu mgbe gboo? Ala so njo (njo Ala bu igbuochu) Ala sọ njọ (njọ Ala bụ igbuọchụ) Igbo were nkwenye na Ala, na-ahu ihe niile, nke a putara na onweghi njo obula i ga-ekpuchi n'anya ya. Igbo were nkwenye na Ala, na-ahụ ihe niile, nke a pụtara na onweghi njọ ọbụla ị ga-ekpuchi n'anya ya. Ajo Ohia ka di na-ala Igbo ruo ugbua Ajọ Ọhịa ka dị na-ala Igbo ruo ugbua Ala ga-aku onye a oria kpam kpam. Ala ga-akụ onye a ọrịa kpam kpam. Lee oria Ala na-aku ndi mere ya njo Lee ọrịa Ala na-akụ ndị mere ya njọ Ekpenta (Leprosy) Ekpenta (Leprosy) Afo oziza Afọ ọzịza Nziza (Dropsy) Nzịza (Dropsy) Ibi(hernia) Ibi(hernia) Nnabuihe kowara n'oge ahu, o nweghi dibia ga-anwa anwa igwo oria ndi a anyi kporo aha. Nnabuihe kọwara n'oge ahụ, o nweghị dibịa ga-anwa anwa ịgwọ ọrịa ndị a anyị kpọrọ aha. Onye obula were udi oria kwesiri ikwuputa njoo o mere kpamkpam tupu o nwuo. Onye ọbụla were ụdị ọrịa kwesiri ikwupụta njọọ o mere kpamkpam tupu ọ nwụọ. O buru na o saghi asisa njo o mere, ha ga-asupu ya n'ohia mmuo. Ọ bụrụ na ọ saghị asịsa njọ o mere, ha ga-asụpụ ya n'ọhịa mmụọ. I ma chi ndi Igbo na-efe n'oge gboo? Ị ma chi ndị Igbo na-efe n'oge gboo? Ihe ndi i na-ekwesighi ime n'akuku onye Igbo Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo Ihe ndi ozo dika ikwa iko di maobu nwunye onye ozo, maobu imu ejime nakwa oria agwota agwota nwere ike imee ka Ala buo onye ahu onu. Ihe ndị ọzọ dịka ịkwa iko di maọbụ nwunye onye ọzọ, maọbụ ịmụ ejime nakwa ọrịa agwọta agwọta nwere ike imee ka Ala bụọ onye ahụ ọnụ. Nsupu mmadu abughi njo Nsụpụ mmadụ abụghị njọ Dika Nnabuihe jiri kowa, nsupu onye a bu maka izo isi umu ya nakwa ezinaulo ya. Dịka Nnabụihe jiri kọwa, nsụpụ onye a bụ maka ịzọ isi ụmụ ya nakwa ezinaụlọ ya. Uka Krist bu okwukwe kachasi n'ala Igbo Ụka Krist bụ okwukwe kachasị n'ala Igbo Igbo n'oge gboo nwere nkwenye na onye obula nabatara onye a anabataala iwe Ala n'ezinaulo ya. Igbo n'oge gboo nwere nkwenye na onye ọbụla nabatara onye a anabataala iwe Ala n'ezinaụlọ ya. Ebe ka ohia mmuo di n'ala Igbo ugbua Ebe ka ọhịa mmụọ di n'ala Igbo ugbua Mkpa Mbaise n'Imo steeti Mkpa Mbaise n'Imo steeti Ogwugwu oku n'ime Okija Ogwugwu ọkụ n'ime Okija Mbitoolu ala ogbaga Mbitoolu ala ogbaga Ihiala Ihiala Arusi Okija Arusi Ọkịja Omenala Igbo na-anwu anwu Omenala Igbo na-anwụ anwụ Nnabuihe kwuru na ihe a bu nke kachasi njo na-eme ugbua n'ala Igbo. Nnabuihe kwuru na ihe a bụ nke kachasị njọ na-eme ugbua n'ala Igbo. O kwuru na: 'Omenaala di iche iche n'ala Igbo n'anwu maka uka Kraist batara n'ala Igbo, ndi mmadu emetoola otutu ohia mmuo a, o nweghi onye na-atuzi egwu ohia a' O kwuru na: 'Omenaala dị iche iche n'ala Igbo n'anwụ maka ụka Kraist batara n'ala Igbo, ndị mmadụ emetọọla ọtụtụ ọhịa mmụọ a, o nweghị onye na-atuzi egwu ọhịa a' Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị A na-ahu otele nwaanyi a n'oku na Twitter maka ihe o kwuru A na-ahụ otele nwaanyị a n'ọkụ na Twitter maka ihe o kwuru Ndi ndorondoro agba ohuru ji soshal midia anya isi Ndị ndọrọndọrọ agba ọhụrụ jị soshal midia anya isi Ahmed Musa: Otu Al Nasr anabatala ya taa Ahmed Musa: Otu Al Nasr anabatala ya taa O teela aka a na-anu kepu kepu na Musa nwere ike igafe n'otu Al Nasr mana ugbua, ekwuputala ya. O teela aka a na-anụ kepu kepu na Musa nwere ike ịgafe n'otu Al Nasr mana ugbua, ekwuputala ya. Ahmed Musa Ahmed Musa Otu onye ndi mmadu chere na o ga-abanye otu egwuregwu boolu gbalitere n'okwa bu Ahmed Musa. Otu onye ndị mmadụ chere na ọ ga-abanye otu egwuregwu bọọlụ gbalitere n'ọkwa bụ Ahmed Musa. Mana ugbua, Musa kpara mkpamkpa n'asompi Iko Mbauwa gwuru agwu esila n'otu Leicester City gafee n'otu Al Nasr nke Saudi Arebia. Mana ugbua, Musa kpara mkpamkpa n'asọmpi Iko Mbaụwa gwụrụ agwụ esila n'otu Leicester City gafee n'otu Al Nasr nke Saudi Arebia. Amabeghi ego ole ha jiri zuo ya n'aka ndi Leicester City mana a na-anu kepu kepu na o ruru nde pounds iri na asaa na okara. Amabeghị ego ole ha jiri zụọ ya n'aka ndị Leicester City mana a na-anụ kepu kepu na o ruru nde pounds iri na asaa na ọkara. I ma umunwaanyi ji ndi Super Eagles n'oru? Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n'ọrụ? Ndi Super Eagles dizi ka nwunye ohuru a choro ilu Ndị Super Eagles dịzị ka nwunye ọhụrụ a chọrọ ịlụ World Cup 2018: Ihe mere ndi Naijiria ji ekele Ahmed Musa World Cup 2018: Ihe mere ndị Naịjirịa ji ekele Ahmed Musa Leicester City zuru ya mbu n'aka otu CSKA Moscow n'afo 2016 mana o laghachiri ebe ahu n'oge boolu nke afo 2017 gara aga. Leicester City zụrụ ya mbụ n'aka otu CSKA Moscow n'afọ 2016 mana ọ laghachịrị ebe ahụ n'oge bọọlụ nke afọ 2017 gara aga. Ka agbachara Iko Mbauwa, ndi mmadu chere na o ga-aga Galatasaray maka na ndi na-akwado otu egwuregwu ahu kporo ya oku nke ukwuu. Ka agbachara Iko Mbaụwa, ndị mmadu chere na ọ ga-aga Galatasaray maka na ndị na-akwado otu egwuregwu ahụ kpọrọ ya oku nke ukwuu. Ihe onyonyo di n'elu na-egosi etu otu ohuru ya siri si ya 'nnoo' ma nabata ya n'ime otu ha. Ihe onyonyo dị n'elu na-egosi etu otu ọhụrụ ya siri sị ya 'nnọọ' ma nabata ya n'ime otu ha. Ka o di ugbua, Ahmed Musa ekwubeghi ihe obula maka okwu a na-ewu ewu. Ka ọ dị ugbua, Ahmed Musa ekwubeghi ihe ọbụla maka okwu a na-ewu ewu. Babatunde Fashola si na Naijiria na ayoribazi egwu maka oku latrik Babatunde Fashola sị na Naịjirịa na ayọrịbazi egwu maka ọkụ latrik Yaburu na ihe Babatunde Fashola kwuru maka mmeputa oku latrik bu eziokwu, o ga-abu nnukwu ihe nye ndi ojiegochuego na Naijiria. Yabụrụ na ihe Babatunde Fashola kwuru maka mmepụta ọkụ latrik bu eziokwu, ọ ga-abụ nnukwu ihe nye ndị ojiegochụego na Naịjirịa. Odu anu Ọdụ anụ Otela ndi Naijiria na-eti mkpu maka oku adighi Otela ndị Naịjirịa na-eti mkpụ maka ọkụ adịghị Minista na-ahu maka oku, oru na ulo bu Babatunde Fashola kwuru na oku latrik a na-emeputa na Naijiria agbagotela ruo megawatt puku asaa. Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọkụ latrik a na-emepụta na Naịjirịa agbagotela ruo megawatt puku asaa. Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti unyaahu. Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti ụnyaahụ. Oku latrik agaghi enwu ofuma ruo afo 2023 - Ndi oru latrik Ọkụ latrik agaghị enwu ọfụma ruo afọ 2023 - Ndị ọrụ latrịk PHCN kwesiri inye gi onwa ato tupu ha achabie oku - Okaiwu PHCN kwesịrị inye gị ọnwa atọ tupu ha achabie ọkụ - Ọkaiwu Fashola no na Kalaba ebe ndi isi oru na ngalaba o na-achi na-eme nzuko. Fashola nọ na Kalaba ebe ndị isi ọrụ na ngalaba ọ na-achị na-eme nzukọ. O kwuru na agbanyeghi na oru foduru ka nku, ngalaba ya agbanyela onodu oku latrik na Naijiria karia etu o di mgbe ha malitere oru n'afo 2015. O kwuru na agbanyeghi na ọrụ fọdụrụ ka nkụ, ngalaba ya agbanyela ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa karịa etu ọ dị mgbe ha malitere ọru n'afọ 2015. Fashola ji ngalaba ato achikotara onu na goomenti Buhari Fashola jị ngalaba atọ achịkọtara ọnụ na gọọmentị Buhari "Afo ato gara aga, akuko bu na mmeputa oku latrik bu nnukwu nsogbu anyi nwere na Naijiria. " "Afọ ato gara aga, akukọ bụ na mmepụta ọkụ latrik bụ nnukwu nsogbu anyị nwere na Naijirịa. " "Mgbe ahu, ndi na-eke oku na-ekwu na ha enweghi nke ha ga-ekenye umu Naijiria. " "Mgbe ahụ, ndị na-eke ọkụ na-ekwu na ha enweghị nke ha ga-ekenye ụmụ Naịjirịa. " Mgbe ahu, anyi na-eke 'megawatt' 2,690 nye ndi Naijiria, mana akuko ahu agbanwela. Mgbe ahụ, anyị na-eke 'megawatt' 2,690 nye ndị Naịjirịa, mana akụkọ ahụ agbanwela. Ihe anyi nwere ike ugbua bu megawat 5,222, nke bu nke kachasi kamgbe Naijiria putara. Ihe anyị nwere ike ugbua bụ megawat 5,222, nke bụ nke kachasị kamgbe Naịjirịa pụtara. "Ugbua, ihe a na-emeputa bu megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. " "Ugbua, ihe a na-emepụta bụ megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. " "Nsogbu ka dikwa, mana anyi ga-ekwu na anyi na-aga n'ihu. " "Nsogbu ka dịkwa, mana anyi ga-ekwu na anyị na-aga n'ihu. " "Akuko ndi ga-amasi gi: " "Akụkọ ndị ga-amasị gị: " "'Nye nwa gi ohere ka o mita ara' " "'Nye nwa gị ohere ka ọ mịta ara' " "Ndi Igbo na-azo eze na Kano " "Ndị Igbo na-azọ eze na Kano " "A gbagbuola ndi na-agbanwe ego mmadu ano na Port Harcourt " "A gbagbuola ndị na-agbanwe ego mmadụ anọ na Port Harcourt " "Uzo i ga-eji mee umuaka gi obi anuri n'oge ezumike " "Ụzọ ị ga-eji mee ụmụaka gị obi aṅụrị n'oge ezumike " "Ma iji ego ma ijighi ego, lee ihe ufodu gi na umu gi nwere ike ime n'oge ogologo ezumike a. " "Ma iji ego ma ijighi ego, lee ihe ụfọdụ gị na ụmụ gị nwere ike ime n'oge ogologo ezumike a. " "Umuakwukwo na Oprah Winfrey " "Ụmụakwụkwọ na Oprah Winfrey " "Oge eruola ozo mgbe ndi umuakwukwo nwere oge ezumike puruiche maka na o di ogologo. " "Oge eruola ọzọ mgbe ndị ụmụakwụkwọ nwere oge ezumike pụrụiche maka na ọ dị ogologo. " "Ufodu ndi nne na nna akwadola etu ha ga-esi kpoga umu ha uloakwukwo nke a kporo 'Summer Lesson' mana o bughi umuaka niile ka nke a ga-amasi. " "Ụfọdụ ndị nne na nna akwadola etu ha ga-esi kpọga ụmụ ha ụlọakwụkwọ nke a kpọrọ 'Summer Lesson' mana ọ bụghị ụmụaka niile ka nke a ga-amasị. " "O buru na i sonyeghi na ndi ga-akpoga umu ha 'Summer Lesson', lee ihe ndi i nwereike i mere ha. " "Ọ bụrụ na ị sonyeghi na ndị ga-akpọga ụmụ ha 'Summer Lesson', lee ihe ndị i nwereike i mere ha. " "Umu nwaanyi choro ka goomenti kwuwa ha ego omugwo " "Ụmụ nwaanyị chọrọ ka gọọmenti kwụwa ha ego ọmụgwọ " "Akpokputala umuaka 4 n'ime 12 bu ndi toro n'ime ogba Thailand " "Akpokpụtala ụmụaka 4 n'ime 12 bụ ndị tọrọ n'ime ọgba Thailand " "Buhari: Buo agha megide mwakpo umuaka " "Buhari: Buo agha megide mwakpo ụmụaka " "Kuziere ha etu e si egwu mmiri " "Kuziere ha etu e si egwu mmiri " "Igwu mmmiri bu uzo umu gi ga-eji megharia ahu ma muta i zo onwe ha ma ha danye n'ime mmiri. " "Igwu mmmiri bụ ụzọ ụmụ gị ga-eji megharịa ahụ ma mụta ị zọ onwe ha ma ha danye n'ime mmiri. " "O ga-emekwa ha ka ike gwu ha ofuma ka ha nweike rahu ura ofuma ma too ofuma. " "Ọ ga-emekwa ha ka ike gwụ ha ọfụma ka ha nweike rahụ ụra ọfụma ma too ọfụma. " "Gbalia kpoga ha taa. " "Gbalia kpọga ha taa. " "Kuziere ha eserese nakwa nka na uzu ndi ozo " "Kuziere ha eserese nakwa nka na ụzụ ndị ọzọ " "Kuziere ha etu esi agba egwu " "Kuziere ha etu esi agba egwu " "Igbo kwenu! " "Igbo kwenu! " "O nwere egwu kariri egwu ogene? " "O nwere egwu karịrị egwu ogene? " "Mba! " "Mba! " "Anyi a ga-akuziri umu anyi ya? " "Anyị a ga-akụziri ụmụ anyị ya? " "Eeeeeee " "Eeeeeee " "Koro ha akuko oge gboo " "Kọrọ ha akụkọ oge gboo " "I ma ubochi mbu aturu ogbunigwe n'ala Igbo? " "Ị ma ụbọchị mbụ atụrụ ogbunigwe n'ala Igbo? " "I ma aha nwoke mbu si n'oru toghapu onwe ya? " "Ị ma aha nwoke mbụ si n'oru tọghapụ onwe ya? " "I nwere ike i maata nke a ma kuzikwara umu gi. " "Ị nwere ike ị maata nke a ma kuzikwara ụmụ gị. " "Otu uzo i ga-esi mee nke a bu i kporo ha gaa n'ulo ngosi di icheiche n'ala Igbo. " "Otu ụzọ ị ga-esi mee nke a bụ ị kpọrọ ha gaa n'ụlọ ngosi dị ịcheịche n'ala Igbo. " "Aka-oru " "Aka-ọrụ " "Kporo ha gaa ebe ha ga-amuta oru aka. " "Kpọrọ ha gaa ebe ha ga-amụta ọrụ aka. " "Nke a ga-eme ha muta aka oru nwere ike i nye ha nri n'odinihu ma oburu na ha enwetaghi oru na ngwucha mahadum. " "Nke a ga-eme ha mụta aka ọrụ nwere ike ị nye ha nri n'ọdịnihu ma ọbụrụ na ha enwetaghị ọrụ na ngwụcha mahadụm. " "Otu Ogbo " "Otu Ọgbọ " "Na ngwucha, o buru na i bu onye omenala na-amasi nke oma, oge ezumike ogologo a bu mgbe i nwere ike iji tinye ha na mmanwu maobu otu ogbo n'obodo unu. " "Na ngwụcha, ọ bụrụ na ị bụ onye omenala na-amasị nke ọma, oge ezumike ogologo a bụ mgbe i nwere ike iji tinye ha na mmanwụ maọbụ otu ọgbọ n'obodo unu. " "Nke a ga-eme ka ha nwee ezigbo amamihe, ako na uche banyere omenala Igbo nakwa n'ebe o siri ike. " "Nke a ga-eme ka ha nwee ezigbo amamihe, akọ na uche banyere omenala Igbo nakwa n'ebe o siri ike. " "Akuko ndi ga-amasi gi: " "Akụkọ ndị ga-amasị gị: " "'Nye nwa gi ohere ka o mita ara' " "'Nye nwa gị ohere ka ọ mịta ara' " "Ihe mere Igbo ji asupu mmadu n'ajo ohia " "Ihe mere Igbo ji asụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa " "Nwaanyi toro onwe ya, ebe ura buru onye ntoo ozo nuru Tramadol " "Nwaanyị tọrọ onwe ya, ebe ụra buru onye ntọọ ọzọ ṅụrụ Tramadol " "Ndi okammuta ekwuola na o bu oke mpu butere otutu ihe ojoo gunyere uzo nto ohuru ji eme na Naijiria. " "Ndị ọkammụta ekwuola na ọ bụ oke mpụ butere ọtụtụ ihe ọjoo gụnyere ụzọ ntọ ọhụrụ ji eme na Naịjirịa. " "Edgal Imohimi " "Edgal Imohimi " "Komishona ndi uweojii na Legos steeti bu Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndi otu badoo na-akpa n'Ikorodu " "Kọmishọna ndị uweojii na Legos steeti bụ Edgal Imohimi kwuru na ha ebelatala ike ndị otu badoo na-akpa n'Ikorodu " Ndi uweojii nwuchiri Nwaanyi toro onwe ya iji nata di ya nde naira 15 na Ogun state. Ndị uweojii nwụchiri Nwaanyị tọro onwe ya iji nata di ya nde naịra 15 na Ogun state. "Ozo, aka kpara onye ntoo ebe o gara itoro mmadu ma ura buru ya ka o nuchara ogwu ike Tramadol. " "Ọzọ, aka kpara onye ntọo ebe ọ gara ịtọrọ mmadụ ma ụra buru ya ka ọ ṅụchara ọgwụ ike Tramadol. " "Mana ndi okachamara n'ihe gbasara omume ndi mmadu bu psychologist na bekee na-ekwu na udi agwa bu oke mpu na ajo enyi bu ihe kpatara ya. " "Mana ndị ọkachamara n'ihe gbasara omume ndị mmadụ bụ psychologist na bekee na-ekwu na ụdị agwa bụ oke mpụ na ajọ enyị bụ ihe kpatara ya. " "A gbaputala nna Mikel Obi n'aka ndi nto ozokwa " "A gbapụtala nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ ọzọkwa " "Femi Joseph na ndi otu ya ji egbe wakpo odoahia ogwu itoro onye nwe ya mana ura buru Joseph ka o nuchara tramadol e nwetara n'ulo ahia ogwu ahu. " "Femi Joseph na ndị otu ya ji egbe wakpo ọdọahịa ọgwụ ịtọrọ onye nwe ya mana ụra buru Joseph ka ọ nụchara tramadol e nwetara n'ụlọ ahịa ọgwu ahụ. " "Di okpa ahu kowara na oge ha batara onye nwe ulo ahia ogwu ahu tiri mkpu ma si uzo azu ulo gbaa oso. " "Dị ọkpa ahụ kọwara na oge ha batara onye nwe ụlọ ahịa ọgwụ ahụ tiri mkpu ma si ụzọ azụ ụlọ gbaa ọsọ. " Dika onu na-ekwuru ndi uweojii na Ondo steeti si, Mana dika ha enwetaghi ihe ha choro, otu n'ime ha bidoro sowa gani gani n'ihi tramadol o nuru. Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti sị, Mana dịka ha enwetaghị ihe ha chọrọ, otu n'ime ha bidoro sọwa ganị ganị n'ihi tramadol ọ ṅụrụ. O rahuru ura awa 24 ka o nwuchara ya. O rahụrụ ụra awa 24 ka ọ ṅwụchara ya. E nwetakwara mkpo Tramadol n'akpa ya. E nwetakwara mkpọ Tramadọl n'akpa ya. N'aka nke ozo, otu nwaanyi aha ya bu Hadijat Kabir na mmadu abuo ndi ozo gunyere otu nwoke na nwaanyi ozo kpara nkata aghugho na ndi ntori ji ya ma naa di ya nde naira 15. N'aka nke ọzọ, otu nwaanyị aha ya bụ Hadijat Kabir na mmadụ abụọ ndị ọzọ gụnyere otu nwoke na nwaanyị ọzọ kpara nkata aghụghọ na ndị ntọrị ji ya ma naa di ya nde naira 15. Komishona ndi uweojii na legos steeti bu Imohimi Edgal, kwuru na o bu mkpesa di ya wetara mere ka ha bido nyocha were choputa na o bu nwunye ya na ndi omekemo kpara nkata ahu. Kọmishọna ndị uweojii na legos steeti bụ Imohimi Edgal, kwuru na ọ bụ mkpesa di ya wetara mere ka ha bido nyocha were chọpụta na ọ bụ nwunye ya na ndị omekemo kpara nkata ahụ. Okammuta n'ihe gbasara omume mmadu nakwa onye nkuzi n'Ebonyi State University bu Nnachi Amos kwuru, na o bughi isi mmebi kpatara udi akwa kama' Ihe ojoo bara uba ugbua. Okammuta n'ihe gbasara omume mmadụ nakwa onye nkuzi n'Ebonyi State University bụ Nnachi Amos kwuru, na ọ bụghị isi mmebi kpatara ụdị akwa kama' Ihe ọjọọ bara ụba ugbua. Ufodu bu mkparita ojoo site na inwee ajo oyi.' Ụfọdụ bụ mkparita ọjọọ site na inwee ajọ ọyị.' Ogbo ya no na Federal Neuro-Pychiatric Hospital di na Yaba, Legos bu Chinyere Okonkwo kwenyere n'ihe Amos kwuru. Ogbo ya nọ na Federal Neuro-Pychiatric Hospital dị na Yaba, Legos bụ Chinyere Okonkwo kwenyere n'ihe Amos kwuru. "Isi zuru ha oke. " "Isi zuru ha oke. " "I lee anya, oru ntori abughi oru di mfe. " "I lee anya, ọrụ ntọrị abụghị ọrụ dị mfe. " Mpu na ajoo ihe kariri. Mpụ na ajọọ ihe karịrị. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ozubulu Church Massacre: Otu afo agafeela Ozubulu Church Massacre: Otu afọ agafeela Nwoke na nwaanyi enwere ike ibu enyi nkiti? Nwoke na nwaanyị enwere ike ịbụ enyi nkịtị? Ihe ndi i na-ekwesighi ime n'akuku onye Igbo Ihe ndị ị na-ekwesịghị ime n'akụkụ onye Igbo Onye nto nuru ogwu ike anwuola ka ubochi itoolu gachara Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla ka ụbọchị itoolu gachara Ndi uweojii no n'Ondo steeti ekwuola na onye nto na-atoghi onye o biara ito maka ogwu ike o nwuru anwuola. Ndị uweojii nọ n'Ondo steeti ekwuola na onye ntọ na-atọghị onye ọ biara ịtọ maka ogwu ike ọ nwụrụ anwụọla. Onye na-arahu ura Onye na-arahụ ụra Dokita BBC gbara ajuju onu kwuru na ya bu onye nto kwesiri inata ogwugwo Dọkịta BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ya bụ onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ Onu na-ekwuchitere ndi uweojii n'Ondo bu Femi Joseph agwala ndi ntaakuko na onye nto nuru ogwu ike anwufuola dika 'News agency of Nigeria' si deputa. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo bụ Femi Joseph agwala ndị ntaakụkọ na onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụfụola dika 'News agency of Nigeria' si depụta. Cheta na o na-arahu ura kamgbe ndi uweojii nwuchichara ya n'Ogostu 5 ebe a na-ere ogwu. Cheta na ọ na-arahụ ụra kamgbe ndị uweojii nwụchichara ya n'Ọgọstụ 5 ebe a na-ere ọgwụ. Joseph kwuru na onye nto a nwuru n'uloogwu di na steeti ahu ebe ndi dokita Bekee no na-agba mbo igwo ya. Joseph kwuru na onye ntọ a nwurụ n'ụlọọgwụ dị na steeti ahụ ebe ndị dọkita Bekee nọ na-agba mbọ ịgwọ ya. Onye nto kwesiri inata ogwugwo - Dibia bekee Onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ - Dibia bekee Onye okaiwu Evans esepula aka n'ikpe ya Onye ọkaiwu Evans esepụla aka n'ikpe ya Kedu ihe na-etiri ndi nto egwu ha na-agba? Kedụ ihe na-etiri ndị ntọ egwu ha na-agba? N'onu ya, 'Onye nto a a na-enyocha nwuru ka abali itoolu anyi jiri nwuchie ya gachara. N'ọnụ ya, 'Onye ntọ a a na-enyocha nwụrụ ka abalị itoolu anyị jiri nwụchie ya gachara. Anyi chere na anyi ga-agwonwu ya ka o wee nyere anyi aka na nyocha anyi na-eme, mana o nwuru unyaahu.' Anyị chere na anyị ga-agwọnwu ya ka o wee nyere anyị aka na nyocha anyị na-eme, mana ọ nwụrụ ụnyaahụ.' "Ihe a nwere ike si n'ogwu ike o nuru. " "Ihe a nwere ike si n'ọgwụ ike ọ ṅụrụ. " Anyi ji ohere a adu ndi nne na nna odu ka ha mara udiri enyi ha na-enwe.' Anyị ji ohere a adụ ndị nne na nna ọdụ ka ha mara ụdịrị enyi ha na-enwe.' Akuko kwuru na onye nto a gara ito onye na-ere ogwu mana onye ahu riri mbombo oso. Akukọ kwuru na onye ntọ a gara ịtọ onye na-ere ọgwụ mana onye ahụ riri mbombo ọsọ. Ya na ndi otu ya mechara nara otu onye bu Daudu Wale ogbatumtum ya, ebe o gara izuta ogwu ebe e nwudere otu onye n'ime ha. Ya na ndị otu ya mechara nara otu onye bụ Daudu Wale ọgbatumtum ya, ebe ọ gara ịzụta ọgwụ ebe e nwudere otu onye n'ime ha. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Gini ka i ga-agwa Nnamdi Kanu ma i zute ya n'uzo? Gịnị ka ị ga-agwa Nnamdi Kanu ma ị zute ya n'ụzọ? A tufuru nwa ohuru n'Onicha taa A tufuru nwa ọhụrụ n'Ọnịcha taa Buhari na Osinbajo ha ga-azoko na 2019? Buhari na Osinbajo ha ga-azọkọ na 2019? Akaoru ise i nwere ike iji N10,000 bido Akaọrụ ise ị nwere ike iji N10,000 bido Okwu o kwuru kpalitere otutu asisa n'ebe ndi onu na-eru n'okwu na Naijiria nakwa goomenti etiti no. Okwu o kwuru kpalitere ọtụtụ asịsa n'ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa nakwa gọọmenti etiti nọ. Akuko ozo dara uda bu akuko nwaanyi Igbo akporo Mama Boko Haram. Akụkọ ọzọ dara ụda bụ akụkọ nwaanyị Igbo akpọrọ Mama Boko Haram. Aisha Wakil gwara BBC Igbo etu o si zuo umuaka bu ndi otu Boko Haram taa. Aisha Wakil gwara BBC Igbo etu o si zụọ ụmụaka bụ ndị otu Boko Haram taa. Akuko Ukochukwu ama ama na Naijiria muru umu ejima ato ka afo iri na itoolu gafechara, nyere umu Igbo nakwa Naijiria niile oke obi uto. Akụkọ Ụkọchụkwụ ama ama na Naịjịria mụrụ ụmụ ejima atọ ka afọ iri na itoolu gafechara, nyere ụmụ Igbo nakwa Naịjirịa niile oke obi ụtọ. Okwu Abaribe kwuru maka ndi ochiehi wuru ewu n'afo 2018. Okwu Abaribe kwuru maka ndị ọchịehi wuru ewu n'afọ 2018. Asompi iko mbauwa niile narakwara umu Igbo uche. Asọmpi iko mbaụwa niile narakwara ụmụ Igbo uche. World Cup: Ezi 'na-ahu uzo' ekwuola na Super Eagles ga-eru okara-ikpeazu World Cup: Ezi 'na-ahụ ụzọ' ekwuola na Super Eagles ga-eru ọkara-ikpeazụ Ozo so ya bu akuko nwuchi umunwaanyi Ipob otu nari na iri ano n'Owere. Ọzọ so ya bụ akụkọ nwuchi ụmụnwaanyị Ipob otu narị na iri anọ n'Owere. Umunwaanyi ahu n'uloikpe taa. Ụmụnwaanyị ahụ n'ụlọịkpe taa. Umunwaanyi anyi adaghi iwu obula - Okaiwu Ipob Ụmụnwaanyị anyị adaghị iwu ọbụla - Ọkaiwu Ipob Atoghapula umunwaanyi IPOB n'Owere Atọghapụla ụmụnwaanyị IPOB n'Owere Mmiri ide kpara mkpamkpa n'ala Igbo n'afo 2018. Mmiri ide kpara mkpamkpa n'ala Igbo n'afọ 2018. Akuko ha kpalitere nkata a na-akpa maka IVF. Akụkọ ha kpalitere nkata a na-akpa maka IVF. Umunwaanyi ise si n'uloakwukwo Regina Pacis di n'Onicha kpakwara ndi Igbo mgbe ha turu ugo n'asompi Technovation 2018 site n'ibu okaibe n'uwa niile. Ụmụnwaanyị ise si n'ụlọakwụkwọ Regina Pacis dị n'Onịcha kpakwara ndị Igbo mgbe ha turu ugo n'asọmpi Technovation 2018 site n'ịbụ ọkaibe n'ụwa niile. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Egwu Eke ato ga-amalite na Jenuwari 1 - Ndi agha Naijiria Egwu Eke atọ ga-amalite na Jenụwarị 1 - Ndị agha Naịjirịa Green Revolution: Ihe ndi Shagari meputaara umu Naijiria Green Revolution: Ihe ndị Shagari mepụtaara ụmụ Naịjirịa Etu i ga-esi gbanahu mwakpo na mmemme Etu ị ga-esi gbanahụ mwakpo na mmemme Second Niger Bridge dika nkwa e kwere nwaanyi' Second Niger Bridge dịka nkwa e kwere nwaanyị' Igbo Tradition: Ihe mere e ji alu nwaanyi n'ozu n'ala Igbo Igbo Tradition: Ihe mere e ji alụ nwaanyị n'ozu n'ala Igbo Otutu oge ka ndi mmadu na-aju ihe kpatara e ji alu nwaanyi n'ozu n'ufodu mpaghara ala Igbo, akuko a kowara ya. Ọtụtu oge ka ndị mmadụ na-ajụ ihe kpatara e ji alụ nwaanyị n'ozu n'ụfọdụ mpaghara ala Igbo, akụkọ a kọwara ya. Nwoke na nwaanyi jiko aka Nwoke na nwaanyị jikọ aka Igbo adighi anabata nwoke na nwaanyi ibi na-alughi alu Igbo adịghi anabata nwoke na nwaanyị ibi na-alụghị alụ A na-enwetakari akuko gbasara ufodu ndi ntorobia maobu agboghobia huru onwe ha n'anya, ma kwekoritara ibikota onu dika di na nwunye, mana ha emeghi omenala alumdinanwunye dika ha kwesiri. A na-enwetakarị akụkọ gbasara ụfọdụ ndị ntorobịa maọbụ agbọghọbịa hụrụ onwe ha n'anya, ma kwekọrịtara ibikọta ọnụ dịka di na nwunye, mana ha emeghị omenala alụmdinanwunye dịka ha kwesịrị. A na-ahutakwa mgbe ufodu ihe mberede di iche iche n'onodu a, okachasi nwaanyi ino n'ulo nwoke ahu nwuo na-enweghi mmemme alum obula emere n'uzo omenala. A na-ahụtakwa mgbe ụfọdụ ihe mberede dị iche iche n'ọnọdụ a, ọkachasị nwaanyị ịnọ n'ụlọ nwoke ahụ nwụọ na-enweghị mmemme alụm ọbụla emere n'ụzọ omenala. Echichi nwaanyi n'ala Igbo Echichi nwaanyị n'ala Igbo Ihe ise masiri umunwaanyi Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Omugwo o bu omenala ga-akwusi n'ala Igbo? Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo? Ka o sila di, nke a na-etinyekari ezinaulo di iche iche na gbagharia. Ka o sila dị, nke a na-etinyekarị ezinaụlọ dị iche iche na gbagharịa. N'ihi ajo onodu a, ufodu obodo di n'ala Igbo, mere ya ka o buru iwu na nwoke ga-alu nwaanyi ya na ya bi n'ozu, bu nke o na-emeghi mgbe o di ndu. N'ihi ajọ ọnọdụ a, ụfọdụ obodo dị n'ala Igbo, mere ya ka ọ bụrụ iwu na nwoke ga-alụ nwaanyị ya na ya bi n'ozu, bụ nke ọ na-emeghị mgbe ọ dị ndụ. Ihe mere eji alu nwaanyi n'ozu: Ihe mere eji alụ nwaanyị n'ozu: N'ala Igbo, anaghi ekweta na nwoke aluola nwaanyi, maoburu na o mezubeghi ihe n'isi ya. N'ala Igbo, anaghị ekweta na nwoke alụọla nwaanyị, maọbụrụ na o mezubeghị ihe n'isi ya. O burugodu na o mere nke uloikpe, a turu anya na o ga-abia mekwaa ihe dika ndi nwe nwa siri choo. Ọ bụrụgodu na o mere nke ụlọikpe, a tụrụ anya na ọ ga-abịa mekwaa ihe dịka ndị nwe nwa siri chọọ. Dika okachamara n'okwu gbasara omenala bu Nze Olueze Ukaejuoha (Duruagwu nke abuo) n'Umuakara, Isu di na Nwangele nke Imo steeti siri gwa BBC Igbo, iwu a di ezigbo ire n'obodo ha, bukwa nke nwere ntaramahuhu di iche iche so ya. Dịka ọkachamara n'okwu gbasara omenala bụ Nze Olueze Ụkaejuoha (Duruagwụ nke abụọ) n'Ụmụakara, Isu dị na Nwangele nke Imo steeti siri gwa BBC Igbo, iwu a dị ezigbo ire n'obodo ha, bụkwa nke nwere ntaramahụhụ dị iche iche so ya. Onye n'alughi na ndu, o lu o n'onwu, bu usoro otutu obodo si eme Onye n'alụghị na ndụ, ọ lụ ọ n'ọnwụ, bụ usoro ọtụtụ obodo si eme Mana n'obodo Akokwa dikwa n'Imo steeti, atumatu a adighi ire obula, ebe ezinaulo muru nwaanyi na-abia eburu ozu nwa ha ma gaa lie n'ulo ha. Mana n'obodo Akọkwa dịkwa n'Imo steeti, atụmatụ a adịghị ire ọbụla, ebe ezinaụlọ mụrụ nwaanyị na-abịa eburu ozu nwa ha ma gaa lie n'ụlọ ha. Usoro esi alu nwaanyi n'ozu: Usoro esi alụ nwaanyị n'ozu: Onye ahu ga-abia gwa ndi mu nwa na nwa ha nwere ahu oku (o gaghi ebu uzo agwa ha na o nwuola). Onye ahụ ga-abịa gwa ndị mụ nwa na nwa ha nwere ahụ ọkụ (ọ gaghị ebu ụzọ agwa ha na ọ nwụọla). Ha ga-eso ya gaa 'leta' nwa ha, mgbe ha huru ozu ya, ha ga-ebo nke nwoke ebubo na o bu ya gburu nwa ha, nke ga-eme ka o gowa ukwu na aka ya Ha ga-eso ya gaa 'leta' nwa ha, mgbe ha hụrụ ozu ya, ha ga-ebo nke nwoke ebubo na ọ bụ ya gburu nwa ha, nke ga-eme ka ọ gọwa ụkwụ na aka ya Iji gosi na o bughi ya gburu ya o ga-ekwenye ilu ozu nwaanyi ahu Iji gosi na ọ bụghị ya gburu ya ọ ga-ekwenye ịlụ ozu nwaanyị ahụ O ga-abia luo ya Ọ ga-abịa lụọ ya O ga-abiaghachi gwazie ndi mu nwa na nwunye ya anwuola Ọ ga-abịaghachị gwazie ndị mụ nwa na nwunye ya anwụọla Nwoke ahu ga-agazi n'ihu mee mmemme akwamozu ya. Nwoke ahụ ga-agazi n'ihu mee mmemme akwamozu ya. Ihe ga-eme onye juru ilu nwaanyi n'ozu: Ihe ga-eme onye jụrụ ịlụ nwaanyị n'ozu: Dika Nze Ukaejuoha siri kowaa, ihe ndi a bu ihe ga-eme onye juru ilu nwaanyi omeghi ihe isi ya n'ozu: Dịka Nze Ụkaejuọha siri kọwaa, ihe ndị a bụ ihe ga-eme onye jụrụ ịlụ nwaanyị omeghị ihe isi ya n'ozu: Onye ahu ga-enweta ntaramahuhu n'uzo di iche iche Onye ahụ ga-enweta ntaramahụhụ n'ụzọ dị iche iche Ihe ojoo dikwa iche iche na-ezute onye ahu Ihe ọjọọ dịkwa iche iche na-ezute onye ahụ Ihe anaghi agara onye di otu a nke oma Ihe anaghị agara onye dị otu a nke ọma Onye ahu nwekwara ike inwu onwu ihere Onye ahụ nwekwara ike ịnwụ ọnwụ ihere Mana onye ahu nwere ike icheghari, tumadu ma o buru na ihe ndakwasi niile a bido idakwasi ya. Mana onye ahụ nwere ike ichegharị, tụmadụ ma ọ bụrụ na ihe ndakwasị niile a bido ịdakwasị ya. Ihe onye ahu ga-eme ma o chegharia Ihe onye ahụ ga-eme ma o chegharịa O buru na nwoke ahu kpochiri nti ma mechaa chegharia n'ihi ihe mkpobi ukwu o na-enweta, ihe ndi a ka o ga-eme: Ọ bụrụ na nwoke ahụ kpọchiri ntị ma mechaa chegharịa n'ihi ihe mkpọbi ụkwụ ọ na-enweta, ihe ndị a ka ọ ga-eme: Onye ahu ga-ezite ndi okenye obodo ha ka ha bia mee ka ala daa juu Onye ahụ ga-ezite ndị okenye obodo ha ka ha bịa mee ka ala daa jụụ A ga-enye ya ntaramahuhu site n'ihu na o mezuru ihe ndi o kwesiri ime n'uzo okpuku abuo. A ga-enye ya ntaramahụhụ site n'ịhụ na o mezuru ihe ndị o kwesịrị ime n'ụzọ okpuku abụọ. Nigeria 2019 elections: Njirimara ndi na-azo oche Onyeisiala – Muhammadu Buhari Nigeria 2019 elections: Njirimara ndị na-azọ oche Onyeisiala – Muhammadu Buhari Onyeisiala Naijiria bu Muhammadu Buhari na-azo okwa dika onyeisiala nke ugboro abuo ya n'ime ochichi onye kwuo uche ya n'okpuru pati na-achi. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-azọ ọkwa dịka onyeisiala nke ugboro abuọ ya n'ime ọchịchi onye kwuo uche ya n'okpuru pati na-achị. President Muhammadu buhari President Muhammadu buhari Onyeisiala Muhammadu Buhari na-achu nta vootu ugbua iji buru onyeisiala Naijiria nke ugboro ato. Onyeisiala Muhammadu Buhari na-achụ nta vootu ugbua iji bụrụ onyeisiala Naịjirịa nke ugboro atọ. O bu uzo bata ochichi n'onwa Disemba 1983 (1984) ka ndiagha Naijiria nara ochichi n'ike, mana ufodu ndi agbatobi ya chuturu Buhari n'ike n'afo 1985. O bu ụzọ bata ọchịchị n'ọnwa Disemba 1983 (1984) ka ndịagha Naijirịa nara ọchịchi n'ike, mana ụfọdụ ndị agbatobi ya chuturu Buhari n'ike n'afọ 1985. Nruritauka BBC ka na-aga n'ihu ugbua Nrụrịtaụka BBC ka na-aga n'ihu ugbua Buhari mechara buru onyeisiala site na ndorondoro ochichi onye kwuo uche ya na'afo 2015, ka ogbara mbo inweta ya bu oche ugboro ato n'efu. Buhari mechara bụrụ onyeisiala site na ndọrọndọrọ ọchịchi onye kwuo uche ya na'afọ 2015, ka ọgbara mbọ ịnweta ya bụ oche ugboro atọ n'efu. Dika mgbe o na-achi dika onyeagha, Buhari enweghi ezigbote aha banyere ikike diri onye. Dịka mgbe ọ na-achị dịka onyeagha, Buhari enweghị ezigbote aha banyere ikike diri onye. Agbanyeghi na-ano n'ochichi onye kwuo uche ya, otutu mmadu no na mkporo maka Buhari ekweghi ituhapu ha dika uloikpe si ka eme. Agbanyeghi na-anọ n'ọchịchi onye kwuo uche ya, ọtụtụ mmadụ nọ na mkpọrọ maka Buhari ekweghị ịtụhapụ ha dịka ụlọikpe sị ka eme. Nwoke a di afo 76 nuru iyi oru n'afo 2015, ma kwe nkwa na ya ga-ebuso agha megide mpu na nruruaka na ogbaghara, nakwa kwalite akunauba Naijiria. Nwoke a dị afọ 76 ṅụrụ iyi ọrụ n'afọ 2015, ma kwe nkwa na ya ga-ebuso agha megide mpụ na nrụrụaka na ọgbaghara, nakwa kwalite akụnaụba Naịjirịa. Afo ano na-abia na ngwucha mana otutu ndi mmadu ekweghi na ihe o mere putara ihe anya na-ahu. Afọ anọ na-abịa na ngwụcha mana ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị na ihe o mere pụtara ihe anya na-ahụ. Okwere nkwa na ya ga emeri Boko Haram na-agha Naijiria na-ebuso ndi a choro ikewaputa mba ofufe alakuba na owuwa anyanwu ugwu Naijiria, mana na nso a, ndi a na-akpazi ike na-enye ebumnobi Buhari inodu n'oche onyisiala nsogbu site n'etu ha si awakpo mpaghara ahu. Okwere nkwa na ya ga emeri Boko Haram na-agha Naịjirịa na-ebuso ndị a chọro ikewapụta mba ofufe alakuba na ọwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa, mana na nso a, ndị a na-akpazị ike na-enye ebumnobi Buhari inọdụ n'oche onyisiala nsogbu site n'etu ha si awakpo mpaghara ahu. Ndi onu ha na-eru n'okwu kwenyere na Buhari ga-ezute ezigote ogu n'aka pati na-anoghi n'ochichi aha ha na-ada uda karia - onye bu okoloto PDP bu Atiku Abubakar bukwa onye ofufe alakuba ma sikwa ugwu Naijiria dika Buhari. Ndị ọnụ ha na-eru n'okwu kwenyere na Buhari ga-ezute ezigote ọgụ n'aka pati na-anọghị n'ọchịchi aha ha na-ada ụda karịa - onye bu ọkọlọtọ PDP bụ Atiku Abubakar bụkwa onye ofufe alakuba ma sikwa ugwu Naịjirịa dịka Buhari. Buhari bu onye buu okoloto All Progressives Congress (APC) nwere aha dika onye aka ya kwu oto n'ime di ndorondoro na Naijiria, agbanyeghi na otutu mmadu na-ahu achumta vootu ya ka ihe na-egosi mkwafu akunauba. Buhari bụ onye buu ọkọlọtọ All Progressives Congress (APC) nwere aha dịka onye aka ya kwụ ọtọ n'ime dị ndọrọndọro na Naịjirịa, agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-ahụ achumta vootu ya ka ihe na-egosị mkwafu akụnaụba. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: O foro obere ka 'Egwu Eke II' loo Nnamdi Kanu - Buratai Ọ fọrọ obere ka 'Egwu Eke II' loo Nnamdi Kanu - Buratai Obi esighi m ike maka mpu n'ime ntuliaka 2019' - Atiku Obi esighi m ike maka mpụ n'ime ntuliaka 2019' - Atiku Nigeria Election 2019: Ndi na-azo ntuliaka na osote ha Nigeria Election 2019: Ndị na-azọ ntuliaka na osote ha I ma mmadu isii kacha puta ihe n'ime ndi na-azo okwa onyeisiala na ntuliaka 2019? Ị ma mmadụ isii kacha pụta ihe n'ime ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019? BBC ga-agba ha n'anwu. BBC ga-agba ha n'anwụ. Ndi na-azo okwa onyeisiala Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Lee mmadu isii na-azo okwa onyeisiala ndi mmadu kacha anu aha ha na ndi osote ha: Lee mmadụ isii na-azọ ọkwa onyeisiala ndị mmadụ kacha anụ aha ha na ndị osote ha: Ka otu na-ahu maka ntuliaka na Naijiria bu 'Independent National Electoral Commission (INEC)' biputara akwukwo gosiri na ihe kariri mmadu iri asaa na-azo okwa onyeisiala na 2019, BBC Igbo choro igosi gi ndi nke aha ha kacha ada uda. Ka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)' bipụtara akwụkwọ gosiri na ihe karịrị mmadụ iri asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019, BBC Igbo chọrọ igosi gị ndị nke aha ha kacha ada ụda. Nkwado ntuliaka n'Owuwa Anyanwu ebirila oku Nkwado ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ ebirila ọkụ Agaghi m adi ka Tinubu igwa ndi mmadu onye ha ga-atunyere' Agaghị m adị ka Tinubu ịgwa ndị mmadụ onye ha ga-atụnyere' Peter Obi agaghi enye gi ego mana o ga-akwado oru obula ziri ezi' Peter Obi agaghị enye gị ego mana ọ ga-akwado ọrụ ọbụla ziri ezi' N'ime mmadu isii a na ndi osote ha, e nwere umunwaanyi ato n'ime ha; otu na-azo onyeisiala ebe ndi ozo na-azo osote. N'ime mmadụ isii a na ndị osote ha, e nwere ụmụnwaanyị atọ n'ime ha; otu na-azọ onyeisiala ebe ndị ọzọ na-azọ osote. 1) Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo 1) Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo Buhari na Osinbajo achiala Naijiria kemgbe afo 2015 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC) Buhari na Osinbajo achịala Naịjirịa kemgbe afọ 2015 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC) Onye bu Muhammadu Buhari? Onye bụ Muhammadu Buhari? A muru ya n'ubochi iri na asaa nke onwa Disemba afo 1942 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Disemba afọ 1942 O chiala Naijiria ugboro abuo; dika onye agha nakwa onye nkiti Ọ chịala Naịjirịa ugboro abụọ; dịka onye agha nakwa onye nkịtị O zoro okwa onyeisiala ugboro ato (2003, 2007 na 2011) tupu o zota ya n'afo 2015 Ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ (2003, 2007 na 2011) tupu ọ zọta ya n'afọ 2015 N'otu aka a o bu onyeisiala, o bukwa onye minista na-ahu maka mmanu amiputara n'ala N'otu aka a ọ bụ onyeisiala, ọ bụkwa onye mịnịsta na-ahụ maka mmanụ amịpụtara n'ala Onye bu Yemi Osinbajo? Onye bụ Yemi Osinbajo? A muru ya n'ubochi asato nke onwa Maachi afo 1957 A mụrụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 1957 O bu ukochukwu n'uka Redeemed Christian Church of God(RCCG) Ọ bụ ụkọchukwu n'ụka Redeemed Christian Church of God(RCCG) O zotara okwa osote onyeisiala Buhari n'afo 2015 Ọ zọtara ọkwa osote onyeisiala Buhari n'afọ 2015 O bukwa okaiwu onu na-eru n'okwu Ọ bụkwa ọkaiwu ọnụ na-eru n'okwu 2) Atiku Abubakar na Peter Obi 2) Atiku Abubakar na Peter Obi Atiku na Obi na-efe okoroto Peoples Democratic Party (PDP) na ntuliaka 2019 a Atiku na Obi na-efe ọkọrọtọ Peoples Democratic Party (PDP) na ntuliaka 2019 a Onye bu Atiku Abubakar? Onye bụ Atiku Abubakar? A muru ya n'ubochi iri abuo na ise nke onwa Novemba n'afo 1946 A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba n'afọ 1946 O bu osote onyeisiala site n'afo 1999 ruo 2007 Ọ bụ osote onyeisiala site n'afọ 1999 ruo 2007 O zoola okwa onyeisiala dika onye bu okoroto pati ya ugboro abuo; n'afo 2007 n'okpuru AC nakwa 2018 n'okpuru PDP Ọ zọọla ọkwa onyeisiala dịka onye bu ọkọrọtọ pati ya ugboro abụọ; n'afọ 2007 n'okpuru AC nakwa 2018 n'okpuru PDP O bu onye achumnta ego nwere otutu azumahia di iche iche Ọ bụ onye achụmnta ego nwere ọtụtụ azụmahịa dị iche iche Onye bu Peter Obi? Onye bụ Peter Obi? A muru ya n'ubochi iri na itoolu nke onwa Julai n'afo 1961 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị n'afọ 1961 O zotara govano Anambara steeti n'okpuru pati APGA n'afo 2003 mana o rigoghi n'oche ruo Maachi 2006 mgbe o meriri n'uloikpe, mana e mechara chutuo ya n'onwa Novemba afo ahu. Ọ zọtara gọvanọ Anambara steeti n'okpuru pati APGA n'afọ 2003 mana ọ rigoghị n'oche ruo Maachị 2006 mgbe o meriri n'ụlọikpe, mana e mechara chutuo ya n'ọnwa Nọvemba afọ ahụ. O mechara loghachita n'oche ya na Februwari 2007, ma puo na Mee oge Andy Uba meriri ya, mana ulo ikpe kwuru ka a hapu ya nozuo afo ano ya. O mechara lọghachita n'oche ya na Febrụwarị 2007, ma pụọ na Mee oge Andy Uba meriri ya, mana ụlọ ikpe kwuru ka a hapụ ya nọzuo afọ anọ ya. O rituru n'oche dika govano Anambara n'afo 2014 ka o chizuru ugboro abuo O rituru n'oche dịka gọvanọ Anambara n'afọ 2014 ka ọ chizuru ugboro abụọ O bu onye okachamara n'ihe gbasara akunauba Ọ bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba 3) Oby Ezekwesili na AbdulGaniyu Galadima 3) Oby Ezekwesili na AbdulGaniyu Galadima Galadima bukwa onyeisioche otu pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) ha choro iji zota ochichi Galadima bụkwa onyeisioche otu pati Allied Congress Party of Nigeria (ACPN) ha chọrọ iji zọta ọchịchị Onye bu Oby Ezekwesili? Onye bụ Oby Ezekwesili? A muru ya n'ubochi iri abuo na asato nke onwa Epreelu 1963 A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Epreelụ 1963 O bu minista na-ahu maka ihe e gwuputara n'ala site na 2005 ruo 2006 nakwa nke agumakwukwo site na 2006 ruo 2007 Ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka ihe e gwuputara n'ala site na 2005 ruo 2006 nakwa nke agụmakwụkwọ site na 2006 ruo 2007 O so hibe otu 'Bring Back Our Girls (BBOG)' na-ahu maka umuaka Chibok a tooro kemgbe afo 2014 O so hibe otu 'Bring Back Our Girls (BBOG)' na-ahụ maka ụmụaka Chibok a tọọrọ kemgbe afọ 2014 O merie, o ga-abu nwaanyi mbu ga-abu onyeisiala na Naijiria O merie, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisiala na Naịjirịa Onye bu Ganiyu Galadima? Onye bụ Ganiyu Galadima? A muru ya n'ubochi iri na otu onwa Jun nke afo 1964 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na otu ọnwa Jun nke afọ 1964 O guru akwukwo na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara buru otu onye n'ime otu ndi na-achi n'ulo akwukwo ahu Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara bụrụ otu onye n'ime otu ndị na-achị n'ụlọ akwụkwọ ahụ O bubu onye zoro oche onyeisiala n'okpuru pati ACPN n'afo 2015 Ọ bụbu onye zọrọ oche onyeisiala n'okpuru pati ACPN n'afọ 2015 O bu onye ojiegoachuego Ọ bụ onye ojiegoachụego 4) Kingsley Moghalu na Umma Getso 4) Kingsley Moghalu na Umma Getso Moghalu na Getso na-azo okwa n'okpuru pati Young Progressive Party (YPP) Moghalu na Getso na-azọ ọkwa n'okpuru pati Young Progressive Party (YPP) Onye bu Kingsley Moghalu? Onye bụ Kingsley Moghalu? A muru ya n'ubochi asaa nke onwa Mee nke afo 1963 A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Mee nke afo 1963 Nke a bu mbu o na-azo ndorondoro ochichi Naijiria Nke a bụ mbụ ọ na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa O guru akwukwo ma nata asambodo dika okaiwu na mahadum Ọ gụru akwụkwọ ma nata asambodo dịka ọkaiwu na mahadum O bukwa onye okachamara n'ihe gbasara ichekwa akunauba. Ọ bụkwa onye ọkachamara n'ihe gbasara ịchekwa akụnaụba. O ruru dika directon n'uloaku etiti nke a kporo Central Bank of Nigeria(CBN) na bekee. Ọ rụrụ dịka directọn n'ụlọakụ etiti nke a kpọrọ Central Bank of Nigeria(CBN) na bekee. Onye bu Umma Getso? Onye bụ Umma Getso? A muru ya n'afo 1981 A mụrụ ya n'afọ 1981 O bu osote onyeisioche otu pati ha bu YPP Ọ bụ osote onyeisioche otu pati ha bụ YPP O bu onye ojiegoachu ego, nakwa onye na-agba mbo n'ihe gbasara ikike ruuru umunwaanyi Ọ bụ onye ojiegoachụ ego, nakwa onye na-agba mbọ n'ihe gbasara ikike ruuru ụmụnwaanyị 5) Omoyele Sowore na Rabiu Ahmed Rufai 5) Omoyele Sowore na Rabiu Ahmed Rufai Sowore na Rufai na-azo okwa n'okpuru pati African Action Congress (AAC) Sowore na Rufai na-azọ ọkwa n'okpuru pati African Action Congress (AAC) Onye bu Omoyele Sowore? Onye bụ Omoyele Sowore? A muru ya n'ubochi iri na isii nke onwa Februwari 1971 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị 1971 O bu onye na-ebu ihe gbasara ikike diri onye n'isi. Ọ bụ onye na-ebu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi. O malitere ya oge o ka no na mahadum Ọ malitere ya oge ọ ka nọ na mahadum O hibere ulooru ntaakuko 'Sahara Reporters' O hibere ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters' O hibere otu pati AAC n'onwa Ogostu nke 2018 O hibere otu pati AAC n'ọnwa Ọgọstụ nke 2018 Onye bu Rabiu Ahmed Rufai? Onye bụ Rabiu Ahmed Rufai? A muru ya n'ubochi iri na asaa nke onwa Julai 1976 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Julaị 1976 O bu dibia Bekee maobu dokinta bu okachamara n'ihe gbasara ahu ike Ọ bụ dibia Bekee maọbụ dọkịnta bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụ ike O kuziburu nkuzi na mahadum Bayero di na Kano Ọ kuziburu nkuzi na mahadum Bayero dị na Kano 6) Fela Durotoye na Khadijah Abdullahi-Iya 6) Fela Durotoye na Khadijah Abdullahi-Iya Durotoye na Abdullahi-Iya na-azo ochichi n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN) Durotoye na Abdullahi-Iya na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN) Onye bu Fela Durotoye? Onye bụ Fela Durotoye? A muru ya n'ubochi iri na abuo nke onwa Mee n'afo 1971 A mụrụ ya n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee n'afọ 1971 O gara mahadum Obafemi Awolowo di n'obodo Ile-Ife Ọ gara mahadum Obafemi Awolowo dị n'obodo Ile-Ife O bu onye na-akuziri ndi mmadu etu e si eji ego achu ego, ma burukwa onye na-eji okwu akpalite mmuo ndi mmadu Ọ bụ onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si eji ego achụ ego, ma bụrụkwa onye na-eji okwu akpalite mmụọ ndị mmadụ O na-azo okwa Onyeisiala n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN) Ọ na-azọ ọkwa Onyeisiala n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN) Onye bu Khadijah Abdullahi-Iya? Onye bụ Khadijah Abdullahi-Iya? O bu onye hibere otu na-ahu maka nlekota umunwaanyi bu 'Women Community of Africa (WCA)' nakwa 'Rags to Riches (R2R)' Ọ bụ onye hibere otu na-ahụ maka nlekọta ụmụnwaanyị bụ 'Women Community of Africa (WCA)' nakwa 'Rags to Riches (R2R)' O bukwa onye okaiwu Ọ bụkwa onye ọkaiwu Kedu onye i ga-atunyere? Kedụ onye ị ga-atụnyere? Imo Election Results: Ihe asaa gbara okpurukpu Uche Nwosu kwuru Imo Election Results: Ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru Naani Uche Nwosu biara nruritauka BBC igbo mere maka okwa govano n'Owere Imo steeti. Naanị Uche Nwosu bịara nrụrịtaụka BBC igbo mere maka ọkwa gọvanọ n'Owere Imo steeti. Igbo juru n'Owere mgbe BBC Igbo mere nrurita uka nke ndi na-azo okwa govano n'Imo steeti mana o bu ihe turu ndi Imo n'anya na naani otu onye n'ime mmadu ano kwesre BBC Igbo nkwa na ha ga-abia nrurita uka ahu bu ihe biara ya. Igbo juru n'Owere mgbe BBC Igbo mere nrụrịta ụka nke ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steetị mana ọ bụ ihe tụrụ ndị Imo n'anya na naani otu onye n'ime mmadụ anọ kwesre BBC Igbo nkwa na ha ga-abịa nrụrịta ụka ahụ bụ ihe bịara ya. Onu na-ekwuchitere ndi APC n'Imo steeti agbasola Uche Nwosu Ọnụ na-ekwuchitere ndị APC n'Imo steeti agbasola Uche Nwosu Imo APC Primaries: A kpoputala Uche Nwosu dika onye ga-azo okwa govano Imo Imo APC Primaries: A kpọpụtala Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo Ndi a tere ndi Imo unyi n'ihu bu Emeka ihedioha PDP, Hope Uzodimma nke APC na Ifeanyi Ararume nke APGA. Ndị a tere ndị Imo ụnyị n'ihu bụ Emeka ihedioha PDP, Hope Uzodimma nke APC na Ifeanyi Ararume nke APGA. Onyeisi BBC Igbo bu Adline Okere si na o bu sooso Ararume bu onye gwara ya na ya nwereike ghara abia maka na ya na-amalite achum nta vootu ya. Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere sị na ọ bụ sọọsọ Ararume bụ onye gwara ya na ya nwereike ghara abịa maka na ya na-amalite achụm nta vootu ya. Ya bu emume bidoro ka o ji okara gacha elekere abuo n'ehihe. Ya bụ emume bidoro ka o ji ọkara gacha elekere abụọ n'ehihe. Na nruritauka ahu sooso ya biara, Uche Nwosu kwere nkwa na ya ga-akwu puku naira iri ato dika ugwu onwa opekatampe ma o buru na goomenti etiti hibe ya. Na nrụrịtaụka ahu sọọsọ ya bịara, Uche Nwosu kwere nkwa na ya ga-akwụ pụkụ naira iri atọ dịka ụgwụ ọnwa opekatampe ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti hibe ya. Nwosu gakwara n'ihu kwuo na pati ya enweghi onye na-azo onyeisiala ka o tinyere onu n'okwu banyere nkwado o na-enye Onyeisiala Muhammau Buhari. Nwosu gakwara n'ihu kwuo na pati ya enweghi onye na-azọ onyeisiala ka o tinyere ọnụ n'okwu banyere nkwado o na-enye Onyeisiala Muhammau Buhari. Ihe ozo o kwuru bu; 'O nweghi ihe o bula no na 'manifesto' m agaghi eme.' Ihe ọzọ o kwuru bụ; 'O nweghị ihe ọ bụla nọ na 'manifesto' m agaghị eme.' Okwu asaa gbara okpurukpu Uche Nwosu kwuru: Okwu asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru: Uche Nwosu si APC banye otu AA iji zoo okwa govano n'Owere Imo steeti Uche Nwosu si APC banye otu AA iji zọọ ọkwa gọvanọ n'Owere Imo steeti Nwosu kwuputara ihe o ga-emere ndi steeti Imo ma o were okwa ochichi na ntuliaka a ga-eme n'onwa Maachi afo 2019. Nwosu kwupụtara ihe ọ ga-emere ndị steeti Imo ma o were ọkwa ọchịchị na ntụliaka a ga-eme n'ọnwa Maachị afọ 2019. Buhari for President: 'Otu AA nwere ike ipiasu Uche Nwosu' Buhari for President: 'Otu AA nwere ike ịpịasu Uche Nwosu' O bughi eziokwu na Action Alliance akwughi Uche Nwosu n'azu - Obidiche Ọ bụghị eziokwu na Action Alliance akwụghị Uche Nwosu n'azụ - Obidiche Ngwa, lee ihe ndi o ruturuaka na nkeji na nkeji: Ngwa, lee ihe ndị ọ rụtụrụaka na nkeji na nkeji: A ga m eweta agumakwukwo bu igba site na mgbako aka ndi uka A ga m eweta agụmakwụkwọ bụ ịgba site na mgbakọ aka ndị ụka A ga m eme ka ahuike buru n'efu maka umuaka, umunwaanyi di ime nakwa ndi okenye A ga m eme ka ahụike bụrụ n'efu maka ụmụaka, ụmunwaanyị dị ime nakwa ndị okenye A ga m eme ka ndi ntorobia bata n'oruubi A ga m eme ka ndị ntorobịa bata n'ọrụubi A maara m nke ekwe na-aku n'ihe gbasara okwu ochichi A maara m nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara okwu ọchịchị A ga m eme kai he ndi e ji ebi ndu baara ndi Imo uba A ga m eme kai he ndị e ji ebi ndụ baara ndị Imo ụba A ga m akwu ugwo onwa opekatampe puku iri naira ato ma goomenti etiti kwuputa ya A ga m akwụ ụgwọ ọnwa ọpekatampe puku iri naịra atọ ma gọọmenti etiti kwuputa ya A ga m eleba anya n'ihe gbasara ugwo ezumike nka A ga m eleba anya n'ihe gbasara ụgwọ ezumike nka Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: Uzodimma, Ihedioha na Ararume abiaghi nruritauka BBC Igbo Uzodimma, Ihedioha na Ararume abịaghị nrụrịtaụka BBC Igbo Atiku bata Amerika o nwere ajuju o ga-asa anyi-Lai Mohammed Atiku bata Amerịka o nwere ajụjụ ọ ga-asa anyị-Lai Mohammed Ihe umu Naijiria na-ekwu maka njem Atiku na mba Amerika Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka njem Atiku na mba Amerika Atiku: Abuja kporo oku dika Atiku lotara njem Amerika Atiku: Abuja kporo ọkụ dịka Atiku lọtara njem Amerịka Akuko maka nlota Atiku Abubakar, oku gbara ulooru mmeputa mmanya Guinness, onyeisiala Buhari na akunauba ndi ndorondoro, akuko Onnoghen, ihe mberede Mexico na ndi ozo so. Akụkọ maka nlọta Atiku Abubakar, ọkụ gbara ụlọọrụ mmepụta mmanya Guinness, onyeisiala Buhari na akụnaụba ndị ndọrọndọrọ, akụkọ Onnoghen, ihe mberede Mexico na ndi ọzọ so. Akuko di mkpa: Akuko dị mkpa: Ndi otu PDP na ndi ihe Atiku Abubakar na-amasi putara n'igwe n'odogboelu Nnamdi Azikiwe di n'Abuja iji nabata Abubakar, onye gara mba Amerika. Ndị otu PDP na ndị ihe Atiku Abubakar na-amasị pụtara n'igwe n'ọdọgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja iji nabata Abubakar, onye gara mba Amerịka. Atiku na onyeisi Uloomeiwu Naijiria bu Bukola Saraki soro mee njem abali abuo na mba ahu ebe dika Atiku siri kowa, ya ndi oru goomenti mba ahu na ndi ojiegoachuego nwere ogbako. Atiku na onyeisi Ụlọomeiwu Naijiria bụ Bukola Saraki soro mee njem abalị abụọ na mba ahụ ebe dịka Atiku siri kọwa, ya ndị ọrụ gọọmenti mba ahụ na ndị ojiegoachụego nwere ọgbakọ. Atiku ga-esonye na ndoritauka nke ndi na-azokwa onyeisiala ga-eme n'abali Satode n'Abuja. Atiku ga-esonye na ndọrịtaụka nke ndị na-azọkwa onyeisiala ga-eme n'abalị Satode n'Abuja. Oku gbara n'ulooru mmeputa mmanya Guinness Ọkụ gbara n'ụlọọrụ mmepụta mmanya Guinness Oku gbara ulo mmeputa mmanya nke ulooru Guinness n'Osisioma Industrial Layout, Aba, Abia steeti ubochi Fraide. Ọkụ gbara ụlọ mmepụta mmanya nke ụlọọrụ Guinness n'Osisioma Industrial Layout, Aba, Abia steeti ụbọchị Fraide. Oku ahu nke gbara rue awa isii bu ndi ulooru na-emenyu oku, nakwa ulooru ndi ozo no nso, ndi uweojii na ndi obodo ahu nyere aka gbanyuo ya. Ọkụ ahụ nke gbara rue awa isii bụ ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ, nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ nọ nso, ndị uweojii na ndị obodo ahụ nyere aka gbanyụọ ya. Onu na-ekwuru Guiness bu Nike Onakoya gwara BBC Igbo na oku ahu emerughi mmadu ahu nke o na emebei nnukwu ihe. Ọnụ na-ekwuru Guiness bụ Nike Ọnakoya gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ emerụghị mmadụ ahụ nke ọ na emebei nnukwu ihe. O kwukwara na oru mmeputa mmanya ha ka di ire n' odo ha di na Benin nakwa Ogba,Lagos Breweries. O kwukwara na ọrụ mmepụta mmanya ha ka dị ire n' ọdọ ha dị na Benin nakwa Ogba,Lagos Breweries. "O nweghi ihe mmeru ahu maobu nnukwu ihe mebiri site n'ihe mere dika ogba nke Aba bu maka mgbari oru ma nwekwa naani ndi oru mmadu ole na ole. " "O nweghị ihe mmerụ ahụ maọbụ nnukwu ihe mebiri site n'ihe mere dịka ọgba nke Aba bụ maka mgbarị ọrụ ma nwekwa naanị ndị ọrụ mmadụ ole na ole. " Ebe anyi jiri mere ebe mmeputa manya bukariri na odo anyi di na Benini nakwa Ogba(Legos). Ebe anyị jiri mere ebe mmepụta manya bụkarịrị na ọdọ anyị dị na Benini nakwa Ogba(Legọs). O bu akuko ugha na a choro inwuchi Onnoghen Ọ bụ akụkọ ụgha na a chọrọ inwụchi Onnoghen Femi Adesina bu onye ntaakuko ama ama tupu oruwa n'ulooru onyeisiala Femi Adesina bụ onye ntaakụkọ ama ama tupu ọrụwa n'ụlọọrụ onyeisiala Ulooru onyeisala agoola si na akuko na goomenti choro inwuchi okaikpe ukwu Naijiria bu Jostis Onnoghen bu akuko ugha. Ụlọọrụ onyeisala agọọla sị na akụkọ na gọọmentị chọrọ ịnwụchi ọkaikpe ukwu Naijiria bụ Jọstis Onnoghen bụ akụkọ ụgha. Onu na-ekwuru onyeisisala Muhammadu Buhari bu Femi Adesina kwuputara n'igwe okwu Facebook ya na ' akuko ugha' ahu nke ha boro otu jikoro ndorondoro ochichi (Coalition of United Political Parties(CUPP) . Ọnụ na-ekwuru onyeisisala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina kwupụtara n'igwe okwu Facebook ya na ' akụkọ ụgha' ahụ nke ha boro otu jikọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị (Coalition of United Political Parties(CUPP) . Donald Trump: Oganihu adila n'okwu iwepu ngwagha nuklia Not Koria Donald Trump: Ọganihu adịla n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa Nọt Korịa Goomenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndi sineti akwadoghi bojeti ha Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha Onyeisiala Amerika bu Donald Trump ekwuola na enwela oganihu were anya n'okwu iwepu ngwagha nuklia mba Not Koria. Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na enwela ọganihu were anya n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa mba Nọt Korịa. O kwu ya di iche n'ihe ndi okachara na-ekwu si na agabeghi ya uzo aga fodukwa iru ebe a na-aga. O kwu ya dị iche n'ihe ndị ọkachara na-ekwu sị na agabeghị ya ụzọ aga fọdụkwa iru ebe a na-aga. Liverpool na Crystal Palace chipuru ya Liverpool na Crystal Palace chịpụrụ ya N'egwuregwu, N'egwuregwu, Liverpool gbara Crystal Palace okpu ato asatara abuo n'Asompi premier league ha mere ubochi Satode. Liverpool gbara Crystal Palace ọkpụ atọ asatara abụọ n'Asompi premier league ha mere ụbọchị Satọde. Goomenti ga-ere akunauba ndi aka ha di na mpu Gọọmentị ga-ere akụnaụba ndị aka ha dị na mpụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na goomenti ya ga-ere akunauba anatara ndi ndorondoro ochichi aka ha di na mpu na nruru aka. Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na gọọmentị ya ga-ere akunaụba anatara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka ha dị na mpụ na nrụrụ aka. Buhari kwuru nke a na Kaduna bu ebe ogara achumata vootu unyaahu. Buhari kwuru nke a na Kaduna bụ ebe ọgara achụmata vootu ụnyaahụ. O si na atumatu bu maka na ya achoghi ka eme ihe o si na emere na afo 1985, bu enyeghachi ndi a akunauba ha. Ọ sị na atumatụ bụ maka na ya achọghị ka eme ihe ọ sị na emere na afọ 1985, bu enyeghachi ndị a akunaụba ha. Ndi ulooru Okwaiwu ukwu Naijiria amalitela njem ichutu Onnoghen Ndị ụlọọrụ Ọkwaiwu ukwu Naịjirịa amalitela njem ịchụtụ Onnoghen Akuko na-eru anyi nti na-akowa na Goomenti etiti agaala uloikpe Code of Conduct irio ka ewepu Okaikpe Walter Onnoghen n'okwa ya dika Okaikpe ukwu nke Naijiria nakwa onyeisi ngalaba na-ahu maka ndi oru ikpe bu National Judicial Council. Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Gọọmentị etiti agaala ụlọikpe Code of Conduct ịrịọ ka ewepụ Ọkaikpe Walter Onnoghen n'ọkwa ya dika Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ ikpe bu National Judicial Council. Onye eji aha ha tinye ya bu akwukwo na CCT bu Okaiwu ukwu Naijiria Abubakar Malami Onye eji aha ha tinye ya bu akwukwọ na CCT bụ Ọkaiwu ukwu Naịjirịa Abubakar Malami N'ofesi N'ofesi Ihe ruru mmadu iri abuo anwuola na mba Mexico ka oku bara igwe na-ebu mmanu ugboala. Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na mba Mexico ka ọkụ bara igwe na-ebu mmanụ ụgbọala. Otutu ndi ozo meruru ahu na ihe mberede a mere na Hidalgo steeti di na etiti Mexico. Ọtutụ ndi ọzọ merụrụ ahụ na ihe mberede a mere na Hidalgo steeti dị na etiti Mexico. N'egwuregwu N'egwuregwu Mgbe Lobi Stars and Heartland FC zutere Mgbe Lobi Stars and Heartland FC zutere Lobi Stars nke Naijiria ga-ezute Asec Mimosas nke Ivory Coast taa n'isi obodo mba ahu bu Abidjan na agba nke abuo ha n'iko CAF Champions League. Lobi Stars nke Naịjirịa ga-ezute Asec Mimosas nke Ivory Coast taa n'isi obodo mba ahụ bụ Abidjan na agba nke abụọ ha n'iko CAF Champions League. Ndi Lobi ji okpu goolu abuo asatara otu merie agba nke mbu ha na Mamolodi Sundowns gbara n'Enugwu. Ndi Lobi ji okpu goolu abuọ asatara otu merie agba nke mbu ha na Mamolodi Sundowns gbara n'Enugwu. Gee nkeji ndi a ebe a: Gee nkeji ndị a ebe a: Lee ihe nkiri nke taa: Lee ihe nkiri nke taa: Obasanjo: 'Anyi choro onyeisiala isi na ahu zuruoke' Obasanjo: 'Anyị chọrọ onyeisiala isi na ahụ zuruoke' Onye chiburu Naijiria bu Olusegun Obasanjo ekwuputela otutu ihe na-ewute ya maka etu ihe si kwuru na Naijiria ugbua na ihe o choro ka umu Naijiria mee gbasara ya. Onye chiburu Naịjiria bụ Olusegun Obasanjo ekwuputela ọtụtụ ihe na-ewute ya maka etu ihe si kwụrụ na Naịjiria ugbua na ihe ọ chọrọ ka ụmụ Naịjirịa mee gbasara ya. Obasanjo Obasanjo Olusegun Obasanjo ekwuola na o cheghi na Inec ga-eme ntuliaka kwu oto n'onwa na-abianu. Olusegun Obasanjo ekwuola na o cheghị na Inec ga-eme ntụliaka kwụ ọtọ n'ọnwa na-abịanụ. O burugodi na ha choro ime ntuliaka kwuoto, ndi no n'ochichi ugbua agaghi enye ha ohere. Ọ bụrụgodi na ha chọrọ ime ntuliaka kwụọtọ, ndị nọ n'ọchịchị ugbua agaghị enye ha ohere. A malitela otu njiko nke Obasanjo A malitela otu njikọ nke Obasanjo Atunyerela goomenti a na 2019 - Obasanjo Atụnyerela gọọmenti a na 2019 - Obasanjo Obasanjo kwuru nke a mgbe o na-aguputara ndi ntakuko akwukwo o deputara akporo 'Points for concern and action' n'ulo ebe o na-edowe akwukwo na Abeokuta. Obasanjo kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụtara ndị ntakụkọ akwụkwọ o depụtara akpọrọ 'Points for concern and action' n'ụlọ ebe o na-edowe akwụkwọ na Abeokuta. O kwuru na ihe Naijiria choro ugbua bu onyeisiala nwere uche zuruoke ma sikwa ike ichi obodo. O kwuru na ihe Naịjirịa chọrọ ugbua bụ onyeisiala nwere uche zuruoke ma sikwa ike ichi obodo. Obasanjo kwuru ka umu Naijiria too obere ihe Buhari meere ha kamgbe o no n'ochichi. Obasanjo kwuru ka ụmụ Naịjirịa too obere ihe Buhari meere ha kamgbe ọ nọ n'ọchịchị. N'okwu ya, 'Buhari alafu go anyi na mbu, anyi ga-abu ewu maoburu na anyi kwe ka o rafuo anyi ozo.' N'okwu ya, 'Buhari alafu go anyị na mbụ, anyị ga-abụ ewu maọbụru na anyị kwe ka ọ rafuo anyị ọzọ.' O were ochichi Buhari tunyere nke onye agha ji aka ike chi Naijiria akporo Sanni Abacha mgbe o di ndu dika onyeisiala. O were ọchịchị Buhari tunyere nke onye agha ji aka ike chị Naijirịa akpọrọ Sanni Abacha mgbe ọ dị ndụ dịka onyeisiala. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Nwa m anwuchala n'ihi ego adighi iwa ya obi' Nwa m anwụchala n'ihi ego adịghị ịwa ya obi' I maara ilu Igbo nke oma? Ị maara ilu Igbo nke ọma? Day 28: I ma aha pati 91 di na Naijiria? Day 28: Ị ma aha pati 91 dị na Naịjirịa? #BBCNigeria2019 #BBCNigeria2019 Atiku bata Amerika o nwere ajuju o ga-asa anyi-Lai Mohammed Atiku bata Amerịka o nwere ajụjụ ọ ga-asa anyị-Lai Mohammed Olusegun Obasanjo: Ihe Atiku ji kara Buhari mma Olusegun Obasanjo: Ihe Atiku ji kara Buhari mma Obasanjo gwara BBC na ya elelechar ihe Buhari mereela ma hu na Atiku ka ya mma mmaji abuo. Obasanjo gwara BBC na ya elelechar ihe Buhari mereela ma hụ na Atiku ka ya mma mmaji abụọ. Na mkparitauka ya na BBC Yoruba nwere, onye bubu Onyeisiala Naijiria bu Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bubu osote nakwa onye na-azo ochichi na ndorondoro ochichi nke 2019 bu Atiku Abubakar. Na mkparịtaụka ya na BBC Yoruba nwere, onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru maka onye bụbu osote nakwa onye na-azo ọchịchị na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 bụ Atiku Abubakar. O si na asi ya hara ugbua na ya ga ahara Atiku karia Buhari n'ihi ihe Buhari merela. O sị na asị ya hara ugbua na ya ga ahara Atiku karia Buhari n'ihi ihe Buhari merela. "Ndi e nwere ihoro n'etiti ha bu onye nke APC na nke PDP. " "Ndị e nwere ịhọrọ n'etiti ha bụ onye nke APC na nke PDP. " "Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghi oru ma ncha, ikpa oke, nruruaka, adighi ike ahu, adighi ike nke uche na ihe niile ndi ozo were ya tunyere Atiku. " "Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghị ọrụ ma ncha, ịkpa oke, nrụrụaka, adịghị ike ahụ, adịghị ike nke uche na ihe niile ndị ọzọ were ya tụnyere Atiku. " Atiku ga-agbali mmaji abuo karia Buhari. Atiku ga-agbali mmaji abụọ karịa Buhari. O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC). O kwukwara maka Boko Haram nakwa Independence National Electoral Commission (INEC). Obasanjo kowara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapu ikwado ndi ntoroobia n'ime mmadu 73 na-azo oche onyeisiala Naijiria. Obasanjo kọwara na ya kwenyere na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka Atiku njo, bu ihe mere ya jiri rapụ ikwado ndi ntoroọbịa n'ime mmadụ 73 na-azọ oche onyeisiala Naịjirịa. O kwukwara ihe mere tupu ndi agha wakpo obodo Odi n'afo 1999, bu mgbe ihe ruru mmadu 2500 ndi obodo nwuru n'aka ndi agha. O kwukwara ihe mere tupu ndị agha wakpo obodo Odi n'afọ 1999, bụ mgbe ihe ruru mmadụ 2500 ndị obodo nwụrụ n'aka ndị agha. Mkparitauka a ga-aputa n'uju eche bu ubochi nke 22 nke onwa Januwari 2019. Mkparịtaụka a ga-apụta n'uju eche bụ ụbọchị nke 22 nke ọnwa Janụwarị 2019. Ubiam sokwa eme na ndi mmadu na anu ogwu ekwesighi maka na ha ejighi ego ha ji aga uloogwu. Ụbịam sokwa eme na ndị mmadụ na aṅụ ọgwụ ekwesighị maka na ha ejighị ego ha ji aga ụlọọgwụ. Dika Oriuiakhi si kwuo, 'o bu udi agwa ojo a ufodu na-eme megide ogwu mgbochi mere ogwu ufodu e ji agwo iba jiri nwuo pii.' Dịka Oriuiakhi sị kwụọ, 'ọ bụ ụdị agwa ọjọ a ụfọdụ na-eme megide ogwu mgbochi mere ogwu ụfọdụ e ji agwọ ịba jiri nwụọ pịị.' Ihe ano i maghi maka oria iba Ihe anọ ị maghị maka ọrịa ịba O si na ndi ufodu na-aga na Kemist, goro ogwu ndi a na-enweghi ikike n'aka ndi dokinta anu ya. Ọ sị na ndị ụfọdụ na-aga na Kemist, gọrọ ọgwụ ndị a na-enweghị ikike n'aka ndị dọkịnta aṅụ ya. Nke a ga-eme na mgbe ahu ha choziri ya bu ogwu, o gaghizi aru oru n'ahu ha. Nke a ga-eme na mgbe ahụ ha chọzịrị ya bụ ọgwụ, ọ gaghịzị arụ ọrụ n'ahụ ha. O kwukwara na ihe a bu nsogbu diara oru ahuike. O kwukwara na ihe a bụ nsogbụ dịara ọrụ ahụike. Kedu ihe a ga-eme ka ogwu mgbochi ruo oru ka o kwesiri? Kedụ ihe a ga-eme ka ọgwụ mgbochi rụọ ọrụ ka o kwesiri? E kwesiri inye ndi mmadu ezigbo ozuzu maka otu esi anu ogwu mgbochi. E kwesiri inye ndị mmadụ ezigbo ọzụzụ maka otu esi aṅụ ọgwụ mgbochi. Naani mgbe dokinta deerela mmadu ogwu mgbochi ndi a bu mgbe e kwesiri inu ya. Naanị mgbe dọkịnta deerela mmadụ ọgwụ mgbochi ndị a bụ mgbe e kwesiri ịnụ ya. Nutrition: Oke ibu abughi na ahu di nwa gi Nutrition: Oke ibu abụghị na ahụ dị nwa gị Ndi na-ere ogwu mgbochi ekwesighi iresi ya mmadu ma onye ahu ejighi akwukwo dokinta ya dere. Ndị na-ere ọgwụ mgbochi ekwesighị iresi ya mmadụ ma onye ahụ ejighị akwụkwọ dọkịnta ya dere. E kwesikwara ime nnyocha Bekee kporo 'Culture and Sensitivity' tupu enye mmadu ogwu mgbochi. E kwesikwara ịme nnyocha Bekee kpọrọ 'Culture and Sensitivity' tupu enye mmadụ ọgwụ mgbochi. Onye ahu adighi gaa n'uloogwu ga mee nnyocha ka e wee deere ya ogwu kwesiri. Onye ahụ adịghị gaa n'ụlọọgwụ ga mee nnyocha ka e wee deere ya ọgwụ kwesiri. Ndi oruahuike kwesiri ikowara ndi mmadu mkpa o di imata ka esi anu ogwu mgbochi ndi a. Ndị ọrụahụike kwesiri ịkọwara ndị mmadụ mkpa ọ dị ịmata ka esi aṅụ ọgwụ mgbochi ndị a. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị Eweputaghi ego maka nyefe ochichi Imo steeti Ewepụtaghị ego maka nyefe ọchịchị Imo steeti Mmechi ulooru isiobodo Naijiria na ihe o putara Mmechi ụlọọrụ isiobodo Naịjirịa na ihe ọ pụtara Gini ga-eme ma akwusi iji akpa wakiri wakiri ekechi ihe? Gịnị ga-eme ma akwụsị iji akpa wakịrị wakịrị ekechi ihe? Nigeria Vs Ukraine: Flying Eagles ejirila ibu 'ikpeazu ka mma' gafee Nigeria Vs Ukraine: Flying Eagles ejirila ịbụ 'ikpeazụ ka mma' gafee Umu Naijiria ji ogboigwe saa Tijani Mohammed ahu dika Naijira gbara onyupa n'asompi ha na Ukraine gbara n'abali Tozde. Ụmụ Naijiria ji ogboigwe saa Tijani Mohammed ahụ dịka Naijira gbara ọnyụpa n'asompi ha na Ukraine gbara n'abalị Tọzde. Ademola Olajire Ademola Olajire Ndi egwu Flying Eagle gbara onyuba n'asompi ha na mba Ukraine Ndị egwu Flying Eagle gbara ọnyụba n'asompi ha na mba Ukraine Naijiria na Ukraine nyere onwe ha otu okpu otu okpu n'asompi U20 World Cup nke Nigeria na mba Ukraine soro n'abali Tozde. Naijiria na Ukraine nyere onwe ha otu ọkpụ otu ọkpụ n'asompi U20 World Cup nke Nigeria na mba Ukraine sọrọ n'abalị Tọzde. Mana obi adighi umu Naijiria mma dika ndi egwu boolu Flying Eagle siri akpula 'band' azu n'asompi ahu dika ha gbara ka ehi azosiri nsi n'afo. Mana obi adịghị ụmụ Naijiria mma dịka ndị egwu bọọlụ Flying Eagle siri akpụla 'band' azụ n'asompị ahụ dịka ha gbara ka ehi azọsịrị nsị n'afọ. Umu Naijjiria ji iwe na onuma gwee Tijani Mohammed nke Flying Eagle ka ose dika Nigeria na-agba onyupa n'asompi Ụmụ Naijjiria ji iwe na ọnụma gwee Tijani Mohammed nke Flying Eagle ka ose dịka Nigeria na-agba ọnyụpa n'asompi Tijani gbara penariti, oche goolu Ukraine echeta ya ka o foro ntabi anya ole na ole tupu okara oge asompi ahu. Tijani gbara penariti, oche goolu Ukraine echeta ya ka ọ fọrọ ntabi anya ole na ole tupu ọkara oge asompi ahụ. Nke mere dika Danylo Sikan nke Ukraine nyere goolu mbu ha. Nke mere dịka Danylo Sikan nke Ukraine nyere goolu mbu ha. Mana Tijani zotara onwe ya oge ka o jiri penariti ozo nye goolu na nkeji 47 nke asompi ahu. Mana Tijani zọtara onwe ya oge ka o jiri penarịti ọzọ nye goolu na nkeji 47 nke asompi ahụ. Otutu umu Naijiria zisara iwe ha n'ahu Tijani. Ọtụtụ ụmụ Naijiria zisara iwe ha n'ahụ Tijani. Lee ihe ufodu kwuru: Lee ihe ụfọdụ kwuru: @10Qmedia kwuru na Tijani Muhammed bu onye boolu kachasi njo na ndi na-agbara Naijiria boolu. @10Qmedia kwuru na Tijani Muhammed bụ onye bọọlụ kachasị njo na ndị na-agbara Naijiria bọọlụ. @vic_MLS tuu arii na Tijani tufuru ohere penariti ahu. @vic_MLS tụụ arịị na Tijani tufuru ohere penarịti ahụ. @rappatek kwuru na onye nchiko Flying Eagles kara iwdepu Tijani n'oge. @rappatek kwuru na onye nchịkọ Flying Eagles kara iwdepu Tijani n'oge. @SSnetwork kwuru na ha ejighi otu obi gbaa boolu. @SSnetwork kwuru na ha ejighị otu obi gbaa bọọlụ. Jane Ada: Eji m ikpu arusi Ndigbo egosi uwa njirimara Ndigbo Jane Ada: Eji m ịkpụ arụsị Ndigbo egosi ụwa njirimara Ndigbo Jane Ada bu nwafo Igbo bi n'Amerika ji aka oru ya kowaa etu o ji huta ufodu chi di n'ala Igbo. Jane Ada bụ nwafọ Igbo bi n'Amerịka ji aka ọrụ ya kọwaa etu o ji hụta ụfọdụ chi dị n'ala Igbo. Jane Ada bu onye e ji ihe osise na okpukpu mara kwuru na o bu site n'ikpu ihe ka o ji akowaputa ufodu chi eji mara ndi Igbo. Jane Ada bụ onye e ji ihe osise na ọkpụkpụ mara kwuru na ọ bụ site n'ikpụ ihe ka o ji akọwapụta ụfọdụ chi eji mara ndị Igbo. Jane guru akwukwo Sekondiri n'Enugwu tupu o gaa mba Amerika na-aru oru kwuru na o maghi mgbe nke ji malite kama na o bu Chineke nyere ya onyinye puruiche a. Jane gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị n'Enugwu tupu ọ gaa mba Amerịka na-arụ ọrụ kwuru na ọ maghi mgbe nke ji malite kama na ọ bụ Chineke nyere ya onyinye pụrụiche a. Arusi ndi o kpurula gunyere Amadioha na Ala,arusi abuo a ma ama n'ala Igbo. Arụsị ndị ọ kpụrụla gụnyere Amadioha na Ala,arụsị abụọ a ma ama n'ala Igbo. Gee nti nuru ma etu o siri mee nke nakwa ebumnuche ya gbasara omenaala na asusu Igbo. Gee ntị nụrụ ma etu o siri mee nke nakwa ebumnuche ya gbasara omenaala na asụsụ Igbo. Ndi mere akuko a: Chioma Nkemdilim na Nnamdi Agbanelo. Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim na Nnamdi Agbanelo. Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na boolu Women's World Cup 2019: Super Falcons ka Super Eagles agbata ihe na bọọlụ Ufodu umunwaanyi ndi ntaakuko n'egwuregwu akowala ufodu nsogbu egwuregwu boolu umunwaanyi na-enwe na Naijiria. Ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị ntaakụkọ n'egwuregwu akọwala ụfọdụ nsogbu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị na-enwe na Naịjirịa. Ndi ntaakuko n'egwurgwu boolu bukwa umunwaanyi ekwuola na Super Falcons nke Naijiria ka agbata ihe na boolu karia ndi ogbo ha ndi nwoke. Ndị ntaakụkọ n'egwurgwu bọọlụ bụkwa ụmụnwaanyị ekwuola na Super Falcons nke Naịjirịa ka agbata ihe na bọọlụ karịa ndị ogbo ha ndị nwoke. Ha kwuru n'agbanyeghi nke a na ndi mmadu karisia umunwoke a naghi etinye uche na boolu umunwaanyi na Najiria nakwa Afrika. Ha kwuru n'agbanyeghi nke a na ndị mmadụ karịsịa ụmụnwoke a naghị etinye uche na bọọlụ ụmụnwaanyị na Najirịa nakwa Afrịka. Ha gara n'ihu kwuo na goomenti a naghi etinye uche nakwa ego n'egwuregwu boolu umunwaanyi dika ha si eme na nke umunwoke agbanyeghi na umunwaanyi na-ebute Iko karia ndi nwoke. Ha gara n'ihu kwuo na gọọmentị a naghị etinye uche nakwa ego n'egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka ha si eme na nke ụmụnwoke agbanyeghi na ụmụnwaanyị na-ebute Iko karịa ndị nwoke. Na o bu ihe ndi a mere anaghi anu akuko banyere asompi di iche iche umunwaanyi na-agba na Naijria. Na ọ bụ ihe ndị a mere anaghị anụ akụkọ banyere asọmpi dị iche iche ụmụnwaanyị na-agba na Naịjrịa. Nigeria vs Norway: Akpochuola Naijiria ihu ahi France taa. Nigeria vs Norway: Akpọchuola Naijirịa ihu ahị France taa. Norway ewerela okpu ato kpochuo Super Falcons ihu ahia n'asompi iko mbauwa umunwaanyi na France. Norway ewerela ọkpụ atọ kpọchuo Super Falcons ihu ahịa n'asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị na France. Norway na Naijiria n'asompi iko mbauwa umunwaanyi na France Norway na Naíjiría n'asómpí iko mbaúwa úmúnwaanyi na France Norway ejirila okpu goolu ato si Naijiria ndewo n'asompi iko mbauwa umunwaanyi bu nke amalitere an France taa. Norway ejirila ọkpụ goolu atọ sị Naịjirịa ndewo n'asọmpị iko mbaụwa ụmụnwaanyi bụ nke amalitere an France taa. Umunwaanyi Norway gbara boolu ka nwoke ebe ndi Naijiria mere ka nwaanyi ha bu ruo mgbe a lotara ezumike ha malitere ikpo gani gani nke amitaghi mkpuru ma oli. Ụmụnwaanyị Norway gbara bọọlụ ka nwoke ebe ndị Naịjịrịa mere ka nwaanyị ha bụ ruo mgbe a lọtara ezumike ha malitere ịkpọ ganị ganị nke amịtaghị mkpụrụ ma ọlị. France mere Super Falcon iwa France mere Super Falcon ịwa Gini mere boolu umunwaanyi anaghi amasi gi? Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị amasị gi? Goolu Norway mbu nke si n'ukwu Reiten banyere an nkeji iri na asaa (17') ebe nke abuo banyere na nkeji iri ato na ano (34') site n'ukwu Utland Goolu Norway mbụ nke sị n'ụkwụ Reiten banyere an nkeji iri na asaa (17') ebe nke abụọ banyere na nkeji iri atọ na anọ (34') site n'ụkwụ Utland Egwu bara Naijiria ahu bu nke gosiri n'ahu Ohale bu nke mere ka onye Naijiria goolu nke ato na nkeji iri ato na asaa (37'). Egwu bara Naịjirịa ahụ bụ nke gosiri n'ahụ Ohale bụ nke mere ka onye Naịjirịa goolu nke atọ na nkeji iri atọ na asaa (37'). Ka a na-eme nke a, Naijiria jizi mpekere akwukwo edo edo site n'aka Francisca Ordega na Desire Oparanozie bu onye bu uzo rite ya bu akwukwo idoaka na nti na nkeji iri na ato (13'). Ka a na-eme nke a, Naịjirịa jizi mpekere akwụkwọ edo edo site n'aka Francisca Ordega na Desire Oparanozie bụ onye bu ụzọ rite ya bụ akwụkwọ ịdọaka na ntị na nkeji iri na atọ (13'). Norway ji okpu ato merie Naijiria mgbe alara ezu m ike bu nke Naijiria enwetaghi usa ya ruo mgbe egbuchiri ya bu asompi. Norway ji ọkpụ atọ merie Naịjirịa mgbe alara ezu m ike bụ nke Naịjirịa enwetaghị ụsa ya rụọ mgbe egbuchiri ya bụ asọmpi. Na abali Satode a ka Iko mbauwa umunwaanyi biiri oku na mba France bu nke Naijiria na mba 24 ndi ozo so na ya. Na abalị Satọde a ka Iko mbaụwa ụmụnwaanyị biiri ọkụ na mba France bụ nke Naịjịrịa na mba 24 ndị ọzọ so na ya. Naijiria so na ikpo nke A bu ndi bidoro ya bu asompi na Stade Auguste Delaune di na France. Naịjirịa sọ na ikpo nke A bụ ndị bidoro ya bụ asọmpị na Stade Auguste Delaune dị na France. Naijiria na South Koria ga-ezuta na Wenezde n'elekere abuo nke ihihie na Stade des Alpes, Grenoble. Naịjirịa na South Koria ga-ezuta na Wenezde n'elekere abụọ nke ihihie na Stade des Alpes, Grenoble. Spain ejirilari okpu ato asatara oti kpochuo South Africa ihu ahia. Spain ejirilarị ọkpụ atọ asatara oti kpọchuo South Africa ihu ahịa. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị Uloikpe ukwu n'Abuja emepeela AIT ozo Ụlọikpe ukwu n'Abụja emepeela AIT ọzọ NBC anapula AIT, Ray Power ikike mgbasaozi NBC anapụla AIT, Ray Power ikike mgbasaozi Gini mere boolu umunwaanyi anaghi amasi gi? Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị amasị gi? Nigeria vs South Korea: Falcons achakeela ka ugo Nigeria vs South Korea: Falcons achakeela ka ugo Otu Falcons Naijiria ejirila okpu goolu abuo merie ogbo ha nke mba Sawut Koria. Otu Falcons Naịjirịa ejirila ọkpụ goolu abụọ merie ogbo ha nke mba Sawụt Koria. Oshaola nke Naijria Oshaola nke Naịjrịa Ogbo egwuregwu Fransi enwurula oku ugbua dika Falcons nke Naijiria tuuru ugo. Ọgbọ egwuregwu Fransị enwurula ọkụ ugbua dịka Falcons nke Naịjirịa tuuru ugo. Goolu mbu Naijiria si n'aka ndi Sawut Korea mgbe Kim Do-yeon gbabara boolu na neeti ha na nkeji 29. Goolu mbụ Naịjirịa si n'aka ndị Sawụt Korea mgbe Kim Do-yeon gbabara bọọlụ na neetị ha na nkeji 29. Nke a mere na amalitere nyocha site na Teknuzu VAR tupu anabata goolu ahu. Nke a mere na amalitere nyocha site na Teknụzụ VAR tupu anabata goolu ahụ. Asisat Oshoala gosiri ndi Sawut Koria na Naijiria abiaghi egwuregwu umuaka na nkeji 75. Asisat Oshoala gosiri ndị Sawụt Koria na Naịjirịa abịaghị egwuregwu ụmụaka na nkeji 75. Nigeria vs Norway: Norway akpochuola Naijiria ihu Nigeria vs Norway: Norway akpọchuola Naijirịa ihu O ji otu okpu goolu saa ha anya nke mere na Naijiria meriri asompi ahu. O ji otu ọkpụ goolu saa ha anya nke mere na Naịjirịa meriri asọmpị ahụ. N'ikpeazu, Naijiria ji mmeri a gbara isi onwe dika Norway merichara ha n'asompi nke mbu ha. N'ikpeazụ, Naịjirịa ji mmeri a gbara isi onwe dịka Norway merichara ha n'asọmpị nke mbụ ha. George Weah ezutela Buhari n'Abuja George Weah ezutela Buhari n'Abuja Onyeisiala mba Liberia bu George Weah biara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ubochi Toozde n'obi goomenti di n'Abuja. Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah bịara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị Tọọzde n'obi gọọmenti dị n'Abuja. Weah biara zute Buhari Weah bịara zute Buhari George Weah na Muhammadu Buhari George Weah na Muhammadu Buhari Onyeisiala mba Liberia bu George Weah biara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ubochi Toozde n'obi goomenti di n'Abuja. Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah bịara zute onyeisiala Muhammadu Buhari ụbọchị Tọọzde n'obi gọọmenti dị n'Abuja. Dika onye nnyemaka na okwu gbasara soshal midia nke onye isiala siri kwuputa n'igwe Twitter, onyeisiala mba abuo ahu nwere mkparitauka n'okwu gbasara mmekoita mba abuo ahu dika o siri gbasa nchekwa na akunauba. Dịka onye nnyemaka na okwu gbasara soshal midia nke onye isiala siri kwụpụta n'igwe Twitter, onyeisiala mba abụọ ahụ nwere mkparịtaụka n'okwu gbasara mmekọịta mba abụọ ahụ dịka o siri gbasa nchekwa na akụnaụba. A hoputala Chiji Collins dika onyeisi uloomeiwu Imo steeti A họpụtala Chiji Collins dịka onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti Ndiomeiwu ohuru na steeti Imo ahoputala Maazi Chiji Collins dika olu na-ekwuru ha. Ndịomeiwu ọhụrụ na steeti Imo ahoputala Maazi Chiji Collins dịka olu na-ekwuru ha. Nwa amadi a, bu onye na-anochite anya okpuruochichi Isiala Mbano nke steeti ahu. Nwa amadi a, bụ onye na-anọchite anya okpuruọchịchị Isiala Mbano nke steeti ahụ. A hoputara ya na-enweghi onye mara ya aka n'ihu. A họpụtara ya na-enweghị onye mara ya aka n'ihu. Nke a bu nke ugboro abuo o na-aga n'uloomeiwu ahu dika ahoputachara ya nke mbu n'afo 2015. Nke a bụ nke ugboro abụọ ọ na-aga n'ụlọomeiwu ahụ dịka ahọpụtachara ya nke mbụ n'afọ 2015. Uloomeiwu a hoputakwara Okechukwu Onyekanma, bu onye na-anochite anya Mbaitoli nke steeti ahu dika osote ya. Uloomeiwu a họpụtakwara Okechukwu Onyekanma, bụ onye na-anọchite anya Mbaitoli nke steeti ahụ dịka osote ya. Onye ochiehi ebepula isi nwaagbogho n'Ekiti Onye ọchịehi ebepụla isi nwaagbọghọ n'Ekiti Obodo Ilasa Ekiti di n'Ekiti Steeti no n'ogbaghara ugbua n'ihi onwu otu nwaagbogho onye ochiehi bepuru isi maka na o juru ilu ya. Obodo Ilasa Ekiti dị n'Ekiti Steeti nọ n'ọgbaghara ugbua n'ihi ọnwụ otu nwaagbọghọ onye ọchịehi bepuru isi maka na ọ jụrụ ịlụ ya. Onye ochiehi a a na-akpobeghi aha ya chechiri nwaaghogho ahu n'uzo ebe o gara ikute mmiri ma bepu ya isi na Tuzde. Onye ọchịehi a a na-akpọbeghi aha ya chechiri nwaaghọghọ ahụ n'ụzọ ebe ọ gara ịkụte mmiri ma bepu ya isi na Tuzde. Nwoke agbaala nwaanyi na ezinaulo ya oku maka iju ya enyi Nwoke agbaala nwaanyị na ezinaụlọ ya ọkụ maka ịjụ ya enyi Nwoke egbuola nwunye ya maka ekworo Nwoke egbuola nwunye ya maka ekworo Onyeisi obodo ahu bu Ajayi Omolagba si na onye ochiehi ahu di na mbu kuchie nwaghogho site n'aka ezinaulo ya dika iwu ndi Fulani si di. Onyeisi obodo ahụ bụ Ajayi Omolagba sị na onye ọchịehi ahụ dị na mbụ kụchie nwaghọghọ site n'aka ezinaụlọ ya dịka iwu ndị Fulani si dị. Mana ndi ezinaulo nwagbogho ahu juru ilunye ya nwoke ochiehi ahu nke mere o ji gbuo nwaagbogho ahu. Mana ndị ezinaụlọ nwagbọghọ ahụ jụrụ ịlụnye ya nwoke ọchịehi ahụ nke mere o ji gbuo nwaagbọghọ ahụ. Ndi uweojii Ekiti Steeti kwuru na nke a mere eme, na ha anwuchiela nwoke ahu site na kepukepu ha nwetere. Ndị uweojii Ekiti Steeti kwuru na nke a mere eme, na ha anwụchiela nwoke ahụ site na kepukepu ha nwetere. Oku gbara uloahia na Port Harcourt Ọkụ gbara ụlọahịa na Port Harcourt Gomenti River steti etinyela onu na ya bu oku mgbara n'uloahia Port Harcourt Shopping Mall. Gọmentị River steti etịnyela ọnụ na ya bụ ọkụ mgbara n'ụlọahịa Port Harcourt Shopping Mall. Odeakwukwo steeti ahu bu Tammy Danagogo gwara ometutara dere juu na ha ga-emezi ya bu uloahia ka ndi mmadu malite azumahia taa bu tozde. Odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Tammy Danagogo gwara ometutara dere jụụ na ha ga-emezị ya bụ ụlọahịa ka ndị mmadụ malite azụmahịa taa bụ tọzde. Atooro onyeisi obodo na Katsina Atọọrọ onyeisi obodo na Katsina Ndi ochiehi egbuola otutu mmadu na Benue na steeti ndi ozo di na Naijiria Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue na steeti ndị ọzọ dị na Naịjirịa Akuko na-eru anyi nti na-ekwu na ndi nto atorola otu onyeeze na Garin Labo di Kastina steeti. Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị ntọ atọrọla otu onyeeze na Garin Labo dị Kastina steeti. onyeeze ahu no na ugbo ya mgbe ndi nto ahu ji ogbatumtum bia ogu. onyeeze ahụ nọ na ugbo ya mgbe ndị ntọ ahụ jị ọgbatumtum bịa ọgụ. N'ofesi N'ofesi Unu anula nee na onyeisiala mba Mexico bu Andres Obrador ekwusiela ike na ya ga- ere ugboelu onyeisiala were buo agha gbasara ndi obodo ya igbafe mba Amerika n'nzuzo. Ụnụ anụla nee na onyeisiala mba Mexico bụ Andres Obrador ekwusiela ike na ya ga- ere ụgbọelu onyeisiala were buo agha gbasara ndị obodo ya ịgbafe mba Amerika n'nzuzo. Obrador si na ya ga na-agbazi ugboelu oha iji hu na ya mejuputara nkwa ya kwere maka nha mba America choro ida ndi be ha. Obrador sị na ya ga na-agbazị ụgbọelu ọha iji hụ na ya mejuputara nkwa ya kwere maka nha mba America chọrọ ịda ndị be ha. N'egwuregwu, Enyimba FC nwetara ihe nrite dika 'otu kachasi agba' na mpaghara Afrika n'afo 2003 N'egwuregwu, Enyimba FC nwetara ihe nrite dịka 'otu kachasị agba' na mpaghara Afrịka n'afọ 2003 N'egwuruegwu, Enyimba eburula iko Nigeria Premier league nke ugboro asato ha site n' iji okpu goolo ato meri Akwa United unyaahu. N'egwuruegwu, Enyimba eburula iko Nigeria Premier league nke ụgbọrọ asatọ ha site n' iji ọkpụ goolo atọ meri Akwa United ụnyaahụ. Enyimba ji akara iri na abuo n'egwuregwu ise ha gbara, ebe Reuben Bala, Stanley Dimgba na Abdulrahman Bashir nyeere Enyimba goolu. Enyimba ji akara iri na abụọ n'egwuregwu ise ha gbara, ebe Reuben Bala, Stanley Dimgba na Abdulrahman Bashir nyeere Enyimba goolu. Gee akuko ndi a ebe a: Gee akụkọ ndị a ebe a: Child trafficking: Aka ndi uweojii akparala ndi ntori umuaka n'Imo Steeti Child trafficking: Aka ndị uweojii akparala ndị ntọrị ụmụaka n'Imo Steeti Ndi uweojii n'Imo si na Immaculata Edward tooro ma ree umuaka 5 si otu ezinaulo na Ngor Akpala di steeti ahu. Ndị uweojii n'Imo sị na Immaculata Edward tọọrọ ma ree ụmụaka 5 si otu ezinaụlọ na Ngọr Akpala dị steeti ahụ. Ndi a na-enyo enyo tooro umuaka ndi ahu Ndị a na-enyo enyo tọọrọ ụmụaka ndị ahụ Ndi ngalaba 'Operation Puff Adder' nke uweojii Imo Steeti anwuchiela mmadu isi oru ha bu itori umuaka. Ndị ngalaba 'Operation Puff Adder' nke uweojii Imo Steeti anwụchiela mmadụ isi ọrụ ha bụ ịtọrị ụmụaka. N'ubochi 24 nke onwa Epurel, 2019, nwaanyi aha ya bu Immaculata Edward si na ya di afo 31 si obodo Okondo di na Cros Riva Steeti tooro umuaka ise bi na be enye ya nwoke a kporo Ifara Isong bi na Ngor Okpala di n'Imo Steeti. N'ụbọchi 24 nke ọnwa Epurel, 2019, nwaanyị aha ya bụ Immaculata Edward sị na ya dị afọ 31 si obodo Okondo dị na Cros Riva Steeti tọọrọ umụaka ise bi na be enye ya nwoke a kpọrọ Ifara Isong bi na Ngor Okpala dị n'Imo Steeti. NAPTIP anwuchiela ndi na-atu mgbere umuaka NAPTIP anwụchiela ndị na-atụ mgbere ụmụaka Aka akparala dibia na-atu mgbere ahia umuaka Aka akparala dibia na-atụ mgbere ahia ụmụaka Immaculata zuru umuaka ise ndi agbataobi enyi ya nwoke ahu bu ndi nne na nna ha siri ya lekota ha anya. Immaculata zuru ụmụaka ise ndị agbataobi enyi ya nwoke ahụ bụ ndị nne na nna ha sịrị ya lekọta ha anya. Umuaka a bu ndi otu nne muru gunyere; Somto Eke, nwaanyi di afo isii, Kelechi Ekeh, nwoke di afo ise. Ụmụaka a bụ ndị otu nne mụrụ gụnyere; Somto Eke, nwaanyị dị afọ isii, Kelechi Ekeh, nwoke dị afọ ise. Ndi ozo bu Chisom Ekeh, nwaanyi di afo ato, Ebuka Enwerem, nwoke di afo ato, Chioma Enwerem, nwaanyi di afo ise na Lucky Ida, nwoke di afo isii. Ndị ọzọ bụ Chisom Ekeh, nwaanyị dị afọ atọ, Ebuka Enwerem, nwoke dị afọ atọ, Chioma Enwerem, nwaanyị dị afọ ise na Lucky Ida, nwoke dị afọ isii. Umuaka azoputara na ezinaulo ha Ụmụaka azọpụtara na ezinaụlọ ha Immaculata kpogara ha n'aka onye ama ama n'itu mgbere umuaka bu Perpetual Iwuji si n'Obokwu Ulakwo, Imo Steeti. Immaculata kpọgara ha n'aka onye ama ama n'ịtụ mgbere ụmụaka bụ Perpetual Iwuji si n'Obokwu Ulakwo, Imo Steeti. Perpetual kporo umuaka abuo n'ime ndi a ma ree ha n'aka Grace Nwachukwu si Aboh Mbaise ma biri na Mpape Abuja. Perpetual kpọrọ ụmụaka abụọ n'ime ndị a ma ree ha n'aka Grace Nwachukwu si Aboh Mbaise ma biri na Mpape Abuja. Immaculata zukwara umuaka abuo bu umu nwanne nna ya si na Cross River Steeti ma ree ha n'aka Ifeoma Ndubuisi si na Lokpanta Abia Steeti. Immaculata zukwara ụmụaka abụọ bụ ụmụ nwanne nna ya si na Cross River Steeti ma ree ha n'aka Ifeoma Ndubuisi si na Lokpanta Abia Steeti. Nwata azoputara na nne na nna ya Nwata azọpụtara na nne na nna ya Site na nyocha tara ochichi ndi uweojii, a chotala umuaka niile ahu a tooro ma tinye ha n'aka ezinaulo ha. Site na nyocha tara ọchịchị ndị uweojii, a chọtala ụmụaka niile ahụ a tọọrọ ma tinye ha n'aka ezinaụlọ ha. N'ime nyocha ahu, azoputara umuaka ise ozo n'aka Perpetual Iwuji ma ziga ha n'ulo ebe a na-elekota umuaka. N'ime nyocha ahụ, azọpụtara ụmụaka ise ọzọ n'aka Perpetual Iwuji ma ziga ha n'ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka. Ndi a na-enyo enyo n'aka ha di na nke a gunyere Perpetual Iwuji, Isong Ifara, Immaculata Edward, Grace Nwachukwu, Ifeoma Ndubuisi na Stephen Ezenwa. Ndị a na-enyo enyo n'aka ha dị na nke a gụnyere Perpetual Iwuji, Isong Ifara, Immaculata Edward, Grace Nwachukwu, Ifeoma Ndubuisi na Stephen Ezenwa. Itu mgbere umuaka abughi ihe amaghi maka na mpaghara Owuwa Anyanwu Naijiria. Ịtụ mgbere ụmụaka abụghị ihe amaghị maka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Onweghi ihe dika Onyeisiala Igbo - Okorocha Onweghị ihe dịka Onyeisiala Igbo - Okorocha Nwaanyi luru di aka ogbo alughi di enwe anuri? Nwaanyị lụrụ dị aka ogbo alụghị di enwe aṅụrị? Rochas Okorocha anuola iyi oru dika Onyeomeiwu Naijiria Rochas Okorocha aṅụọla iyi ọrụ dịka Onyeomeiwu Naịjirịa AFCON 2019: Usoro Asompi na Mputara AFCON 2019: Usoro Asọmpi na Mpụtara Usoro a ga-esi gbaa asompi Iko Mba Afirika nke ga-amalite na ubochi iri abuo na otu nke onwa Juun n'Ijipt. Usoro a ga-esi gbaa asọmpi Iko Mba Afịrịka nke ga-amalite na ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun n'Ijipt. Iko mba Afrika Iko mba Afrịka Inec Server: 'Anyi achikotala onuogugu 'card reader' niile otu ebe na komputa' Inec Server: 'Anyị achịkọtala ọnụọgụgụ 'card reader' niile otu ebe na kọmputa' Inec si na aha ndi niile debere aha na ntuliaka 2019 di na komputa ha. Inec sị na aha ndị niile debere aha na ntuliaka 2019 dị na kọmputa ha. Festus Okoye na Emeka Unachukwu Festus Okoye na Emeka Unachukwu Onyeozi Inec bu Festus Okoye ka an-ekwusi ike na ndi ulooru ahu enweghi 'Server' bu nke nyere ha ohere izipu mputara ntuliaka 2019. Onyeozi Inec bụ Festus Okoye ka an-ekwusi ike na ndị ụlọọrụ ahụ enweghị 'Server' bụ nke nyere ha ohere izipụ mpụtara ntuliaka 2019. Okoye si na iwu Naijiria enyeghi ha ohere ime otu ahu. Okoye si na iwu Naịjirịa enyeghị ha ohere ime otu ahụ. Okaikpe Garba eburula oche n'ikpe Atiku na Buhari Ọkaikpe Garba eburula oche n'ikpe Atiku na Buhari Uloomeiwu ekwuola gaa n'ihu maka bojeti afo 2019 Ụlọomeiwu ekwuola gaa n'ihu maka bọjetị afọ 2019 N'olu ya, 'iwu Naijria nyere ikike iburu mputara ntuliaka niile nke di na 'fom EC8A' n'aka buga ebe a ga-egbokoba ha na wodu.' N'olu ya, 'iwu Naịjrịa nyere ikike iburu mpụtara ntuliaka niile nke dị na 'fọm̀ EC8A' n'aka buga ebe a ga-egbokọba ha na wọdụ.' Iwu Naijiria anyi ji mee ya bu ntuliaka amaghi iji igwe komputa zipu ozi obula. Iwu Naịjirịa anyị ji mee ya bụ ntuliaka amaghị iji igwe kọmpụta zipu ozi ọbụla. Ndi 'Collation Officer' ka o bu oru ha iburu akwukwo ndi a n'aka buga ebe a choro ya. Ndị 'Collation Officer' ka ọ bụ ọrụ ha iburu akwụkwọ ndị a n'aka buga ebe a chọrọ ya. O nweghi mgbe anyi jiri igwe komputa zipu mputara ntuliaka. O nweghị mgbe anyị jiri igwe kọmpụta zipụ mpụtara ntuliaka. Okoye kwetara na ndi debere aha ha n'akwukwo maka ntuliaka 2019 niile di na igwe komputa, na enyere ndi otu pati niile aha ndi a. Okoye kwetara na ndị debere aha ha n'akwụkwọ maka ntuliaka 2019 niile dị na igwe kọmputa, na enyere ndị otu pati niile aha ndị a. Ejighi 'Incident Form' ga-akwusi nruruaka na-aga na ntuliaka Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka O kwusiri ike na 'o bu naani mgbe eji igwe komuta tuo vootu ka a ga-asi na ihe di na sava'. O kwusiri ike na 'ọ bụ naanị mgbe eji igwe kọmuta tụọ vootu ka a ga-asi na ihe dị na sava'. O si na ya amaghi maka mputara ntulika 2019 i di na sava obula. Ọ sị na ya amaghị maka mpụtara ntulika 2019 ị dị na sava ọbụla. N'otu aka ahu BBC jukwara onye oru komputa ama ama bu Emeka Unachukwu gini bu 'server'? N'otu aka ahụ BBC jụkwara onye ọrụ kọmpụta ama ama bụ Emeka Unachukwu gịnị bụ 'server'? Unachukwu si na 'Server' bu komputa na-ejiko komputa ndi ozo onu eji edewe mkpuruozi di iche iche'. Unachukwu sị na 'Server' bụ kọmpụta na-ejikọ kọmpụta ndị ọzọ ọnụ eji edewe mkpụrụozi dị iche iche'. O kwuru na Inec nwere ike ikwu na ha enweghi 'server' maka na o nwere ulooru ozo na e jidere ha mkpuruozi mana o bughi eziokwu na ha enweghi server' ebe e nwere mkpuruozi. O kwuru na Inec nwere ike ikwu na ha enweghị 'server' maka na o nwere ụlọọrụ ọzọ na e jidere ha mkpụrụozi mana ọ bụghị eziokwu na ha enweghị server' ebe e nwere mkpụrụozi. O si na Intanet nwere 'server' nke ya ebe otutu mmadu na-edowe ozi ha. Ọ sị na Intanet nwere 'server' nke ya ebe ọtụtụ mmadụ na-edowe ozi ha. Unachukwu si na 'Inec agaghi asi na ha enweghi sava maka na ha nwere ebe ha na edowe mkpuruozi bu data. Unachukwu sị na 'Inec agaghị asị na ha enweghị sava maka na ha nwere ebe ha na edowe mkpụrụozi bụ data. Ha nwere ike kpo nke a 'data base' mana ihe o bu bu sava maka na komputa ahu jikoro ndi ozo onu bu ndi nke nwere ike idoro ozi maobu zite ozi na ya'. Ha nwere ike kpọ nke a 'data base' mana ihe ọ bụ bụ sava maka na kọmpụta ahụ jikoro ndị ọzọ ọnụ bụ ndị nke nwere ike ịdọro ọzi maọbụ zite ọzi na ya'. O si na ohiara ahu Inec isi na ha enweghi server'. Ọ sị na ọhịara ahụ Inec isi na ha enweghị server'. Ha na-akpo ndi mmadu bia were PVC ha diri njikere maka ntuliaka Ha na-akpọ ndị mmadụ bịa were PVC ha dịrị njikere maka ntuliaka Unachukwu kwuru na o burugodi na a turu vootu n'aka buru ya n'aka buga ebe a guru ya, na Inec ga-etinyekwa ya na ya bu 'server'. Unachukwu kwuru na ọ bụrụgodi na a tụrụ vootu n'aka buru ya n'aka buga ebe a gụrụ ya, na Inec ga-etinyekwa ya na ya bụ 'server'. Mana ha nwere ike ikwu na ha etinyebeghi mputara 2019 na ya bu 'server' nke gosiri na ha aruchabeghi oru ha. Mana ha nwere ike ikwu na ha etinyebeghị mpụtara 2019 na ya bụ 'server' nke gosiri na ha arụchabeghị ọrụ ha. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị Uzo i ga-esi gbalahu ibufe nwa ohuru gi HIV Ụzọ ị ga-esi gbalahụ ibufe nwa ọhụrụ gị HIV Ndigbo agbazi aka n'ochichi Naijria? Ndigbo agbazị aka n'ọchịchị Naịjrịa? Ikwu ugwo onwa abuo n'ime onwa iri ezughi chacha - Ndi nkuzi Abia Ịkwụ ụgwọ ọnwa abụọ n'ime ọnwa iri ezughi chacha - Ndị nkuzi Abia Lee ihe nkiri anyi Lee ihe nkiri anyị World Blood Donor Day 2019: Ihe ndi mmadu na-eche maka inye obara World Blood Donor Day 2019: Ihe ndị mmadụ na-eche maka inye ọbara Dika taa bu oge a na-echeta inye obara BBC Igbo gara juo ndi mmadu ihe ha ma maka inye obara. Dịka taa bụ oge a na-echeta inye ọbara BBC Igbo gara jụọ ndị mmadụ ihe ha ma maka inye ọbara. Taa ka a na-echete inye obara bu nke Bekee kporo 'World Blood Donor Day 2019'. Taa ka a na-echete inye ọbara bụ nke Bekee kpọrọ 'World Blood Donor Day 2019'. BBC Igbo Juru ndi mmadu ihe ha ma maka inye obara nakwa udiri asi na-asi ha na-anu maka ya. BBC Igbo Jụrụ ndị mmadụ ihe ha ma maka inye ọbara nakwa ụdịrị asị na-asị ha na-anụ maka ya. Gee ha nti. Gee ha ntị. Diet and Dementia: Etu i ga-esi jiri chocolate na-akwukwo nri chuo nsogbu uburuisi Diet and Dementia: Etu ị ga-esi jiri chocolate na-akwụkwọ nri chụọ nsogbu ụbụrụisi Guo edemede a ka i muta etu i ga-esi jiri ezigbo nri mee ka uburu gi kaa aka ma gbasie ike. Gụọ edemede a ka i muta etu ị ga-esi jiri ezigbo nri mee ka ụbụru gị kaa aka ma gbasie ike. Mkpuru osisi na akwukwo nri ahaziri ka ha yie uburu isi. Mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ahaziri ka ha yie ụbụrụ isi. Muta maka nri na-edozi uburuisi ka enye kwa gi ogologo ndu na ahuisiike. Mụta maka nri na-edozi ụbụrụisi ka enye kwa gị ogologo ndụ na ahụisiike. I ma nri asaa nwere ike inyere gi aka ichu nsogbu uburuisi oso ukwu eru ala? Ị ma nri asaa nwere ike ịnyere gị aka ịchu nsogbu ụbụrụisi ọsọ ụkwụ eru ala? Mmadu ijeri iri na ise n'uwa nile gburugburu na aria oria nsogbu uburuisi nke na-ebute oke nchefu na nsogbu omumu ihe, tinyekwara ihe ruru mmadu ijeri iri na enweta oria a kwa afo (WHO). Mmadụ ijeri iri na ise n'ụwa nile gburugburu na aria ọria nsogbu ubụruisi nke na-ebute oke nchefu na nsogbu ọmụmụ ihe, tinyekwara ihe ruru mmadu ijeri iri na enweta oria a kwa afọ (WHO). N'agbanyehi na a choputala na erimeri sonyere n'ihe na-edozi uburuisi, mana enweghi omumu ihe ama na akwado ya. N'agbanyehi na a chọpụtala na erimeri sonyere n'ihe na-edozi ubụrụisi, mana enweghi ọmụmụ ihe ama na akwado ya. Mmanya 'Red Wine', Kofii, na Chokolet nakwa mmanya 'Champagne' ewuola ewu dika nri ebube maka ihe gbasara nsogbu uburuisi. Mmanya 'Red Wine', Kọfịị, na Chọkọlet nakwa mmanya 'Champagne' ewuola ewu dịka nri ebube maka ihe gbasara nsogbu ụbụrụisi. Mana, enwere eziokwu di n'okwu ndi a? Mana, enwere eziokwu dị n'okwu ndị a? Ngwa guo ihe Sheila Dillon bu onye oru BBC choputara mgbe o gbara ndi okammuta ajuju onu maka n'ihe gbasatara okwu a . Ngwa gụọ ihe Sheila Dillon bụ onye ọrụ BBC chọpụtara mgbe ọ gbara ndị ọkammụta ajụjụ ọnụ maka n'ihe gbasatara okwu a . Dika i ga-achoputa, nri ndi a na-enyere aka maka odimma uburuisi gi: Dịka ị ga-achọputa, nri ndị a na-enyere aka maka ọdịmma ụbụrụisi gị: Nri sitere n'mmiri Nri sitere n'mmiri Ezigbote protein, gbara obere abuba ma juputakwa na 'Omega Fatty Acids' . Ezigbote protein, gbara obere abuba ma juputakwa na 'Omega Fatty Acids' . Iri nri azu juputara na ya otu mgbe maobu karia n'izuka na-enyere uburuisi aka nke ukwu. Iri nri azụ juputara na ya otu mgbe maọbụ karia n'izuka na-enyere ụbụrụisi aka nke ukwu. Mkpuru osisi 'vine' na mkpuru ndi ozo yiri ya. Mkpụrụ osisi 'vine' na mkpụrụ ndị ọzọ yiri ya. Were Mkpuru osisi vine leta Uburuisi n'ahu gi mma Were Mkpụrụ osisi vine leta Ụbụrụisi n'ahụ gị mma Mkpuru osisi di ka 'Strawberries' na 'blueberries' nwere ihe na-egbochi mbido nsogbo omumu nke uburuisi. Mkpụrụ osisi dị ka 'Strawberries' na 'blueberries' nwere ihe na-egbochi mbido nsogbo ọmụmụ nke ụbụrụisi. Opupa na aki di iche iche Ọpupa na akị dị iche iche Aki na mkpuru di iche iche n'enye ahu-ike ma na edozi kwa uburuisi Aki na mkpuru di iche iche n'enye ahu-ike ma na edozi kwa ụbụrụisi Onye n'eri nani 30mg nke aki di iche iche, oka,'rye', osikapa nke n'acha ncharanchara, oka milet, oka 'oats' ma na-eri kwa 'protein', 'minerlas' na kwa 'fibre' ka ahuta na nsobgu uburuisi ga agbara ya oso. Onye n'eri nani 30mg nke akị dị iche iche, ọka,'rye', osikapa nke n'acha ncharanchara, ọka milet, ọka 'oats' ma na-eri kwa 'protein', 'minerlas' na kwa 'fibre' ka ahụta na nsobgu ụbụrụisi ga agbara ya ọsọ. Ugu Ụgụ Ugu na-enye obara ma na edozi kwa uburuisi Ụgụ na-enye ọbara ma na edozi kwa ụbụrụisi Onye kwuru na ugu na akwukwo nri ndi ozo na-edozi uburuisi, onye ahu mara ihe o na-ekwu. Ọnye kwuru na ụgụ na akwụkwọ nri ndị ozo na-edozi ụbụrụisi, onye ahụ mara ihe ọ na-ekwu. Vitamin B Vịtamịn B Vitamin B : e ji la ya gwuo egwu Vịtamịn B : e ji la ya gwuo egwu Mkpuru mmadu ole nwere obele nsogbu uburu isi enyere Vitamin B kosiri ezigbote mgbake nke uburuisi. Mkpụrụ mmadụ ole nwere ọbele nsogbu ụbụrụ isi enyere Vịtamịn B kosiri ezigbote mgbake nke ụbụrụisi. I na anu kwa ihe onunu mmiri koko? I na aṅu kwa ihe ọṅuṅụ mmiri koko? Ka anyi kelee ndi gboo nke 'Olmec-Mexico' maka i gosi uwa niile ihe onunu mmiri koko. Ka anyi kelee ndi gboo nke 'Olmec-Mexico' maka i gosi ụwa niile ihe ọṅụṅụ mmiri koko. Koko na-adi mma maka akwara-ozi ma na-edozi kwa mkpuru-ndu. Koko na-adị mma maka akwara-ozi ma na-edozi kwa mkpụrụ-ndụ. Mana cheta kwa ka i na-anu mmiri koko nke nwere obere shuga. Mana cheta kwa ka i na-aṅu mmiri koko nke nwere ọbere shuga. Ubebekee Ubebekee I nwere ike inweta Ubebekee uwa nile gburugburu I nwere ike inweta Ubebekee uwa nile gburugburu Ihe sonyere mee ka ube Bekee na-ewu ewu n'uwa niile bu maka na o na-enyere aka maka o di mma uburuisi. Ihe sonyere mee ka ube Bekee na-ewu ewu n'ụwa niile bụ maka na ọ na-enyere aka maka ọ dị mma ụbụrụisi. Ugbua odoola gi anya? Ugbua odoola gị anya? Nri ndi a niile araghi ahu i nweta ma enwe kwara ndi ozo enwereike iji gbanwe nke i na-achotaghi n'ogbe gi. Nri ndị a niile araghị ahụ ị nweta ma enwe kwara ndị ọzọ enwereike iji gbanwe nke ị na-achọtaghi n'ogbe gị. Ma cheta kwa, nri ndi a abughi nani maka uburuisi gi, ha na-edozi ahu gi were mee ka i kwuru chim! Ma cheta kwa, nri ndị a abụghị nani maka ụbụrụisi gị, ha na-edozi ahụ gị were mee ka ị kwụrụ chịm! Edemede a bu mgbanwe edemede 'Diet and Dementia', nke puruiche nke ndi 'BBC's The Food Programme' . Edemede a bụ mgbanwe edemede 'Diet and Dementia', nke pụrụiche nke ndị 'BBC's The Food Programme' . Mikel Obi: Kedu ihe m biara ime ma obughi ibu Iko AFCON Mikel Obi: Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON Onye ndu ndi na-agbara otu Super Eagles boolu ekwechirila si na o bu mmeri ka ha biara ime na Iko AFCON 2019. Onye ndu ndị na-agbara otu Super Eagles bọọlụ ekwechirila sị na ọ bụ mmeri ka ha bịara ime na Iko AFCON 2019. Mikel Obi Mikel Obi Onyeisi Ndi otu Boolu Naijiria - Mikel Obi Ọnyeisi Ndị otu Bọọlụ Naịjirịa - Mikel Obi Mikel Obi ga-edu ndi otu Super Eagles nke Naijiria gaa mba Ijipt maka asompi Iko mba Afirika akporo AFCON 2019 ekwuola na o biaghi igwu egwu n'ihi na imeri ma buru kwa iko AFCON na-agusi ya ike. Mikel Obi ga-edu ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gaa mba Ijipt maka asọmpi Iko mba Afịrịka akpọrọ AFCON 2019 ekwuola na ọ bịaghi igwu egwu n'ihi na imeri ma buru kwa iko AFCON na-agusi ya ike. O ruola afo isii Mikel Obi meturu Iko Mba Afirika aka. O ruola afọ isii Mikel Obi metụrụ Iko Mba Afịrịka aka. Mgbe ahu bu mgbe Naijiria meriri na mba Saut Afirika. Mgbe ahu bụ mgbe Naịjirịa meriri na mba Saụt Afịrịka. Mikel agaghi eso soo mpi na Poland Mikel agaghị eso sọọ mpi na Poland Obi adighi Mikel Obi mma Obi adịghị Mikel Obi mma A gbaputala nna Mikel Obi n'aka ndi nto ozokwa A gbapụtala nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ ọzọkwa Mgbe ozo Mikel gbata ihe n'Afirika bu n'afo 2006 na 2010 bu mgbe otu Super Eagles gbatara ndi nke ato. Mgbe ọzọ Mikel gbata ihe n'Afịrịka bụ n'afọ 2006 na 2010 bụ mgbe otu Super Eagles gbatara ndị nke atọ. N'oge AFCON a, Mikel ga-edu ndi umu okorobia obara ha di oku were soo asumupi nke afo a na Ijipt. N'oge AFCON a, Mikel ga-edu ndị ụmụ okorobia ọbara ha dị ọkụ were sọọ asụmụpị nke afọ a na Ijipt. Mikel kwuru: 'N'agbanyeghi na ndi otu Eagles nke ugbua abughi ndi aka ochie n'izute mba Afirika ndi ozo ka ya, asumpi a ga-enye ndi di ka Samuel (chukwueze) na Paul (Onuachu) ohere igosiputa nka ha. Mikel kwuru: 'N'agbanyeghi na ndị otu Eagles nke ugbua abụghị ndị aka ochie n'izute mba Afịrịka ndị ọzọ ka ya, asụmpị a ga-enye ndị dị ka Samuel (chukwueze) na Paul (Onuachu) ohere igosiputa nka ha. Enwekwara m olileanya na anyi ga aga ijiptu ma turu ugo lota.' Enwekwara m olileanya na anyị ga aga ijiptu ma tụrụ ugo lọta.' Ndi otu Super Eagles Ndị otu Super Eagles O kwukwara n'obi di ya uto etu ndi Super Eagles siri agba mbo n'agbanyeghi onyupa ha dara n'asumpi Iko Mba Uwa. O kwukwara n'obi dị ya ụtọ etu ndị Super Eagles siri agba mbọ n'agbanyeghi ọnyụpa ha dara n'asụmpị Iko Mba Uwa. Mikel kwetere na asumpi a ga-esi ike mana o kwenyere na nka na nkwado umu Super Eagles ga enyere ha aka imeri asumpi a. Mikel kwetere na asụmpị a ga-esi ike mana o kwenyere na nka na nkwado ụmụ Super Eagles ga enyere ha aka imeri asụmpi a. Chetakwa na Mikel Obi gbaara Naijiria boolu nke mbu n'afo 2005 mgbe Super Eagles na otu egwuregwu mba Libya zutere. Chetakwa na Mikel Obi gbaara Naịjịria bọọlụ nke mbụ n'afọ 2005 mgbe Super Eagles na otu egwuregwu mba Libya zutere. Mikel kwuru n'asompi a nwere ike i bu nke ikpeazu ya n'uwe Super Eagles. Mikel kwuru n'asọmpị a nwere ike ị bụ nke ikpeazu ya n'uwe Super Eagles. O si; 'otu obula o di aga m agbali ka o di nma.' Ọ sị; 'otu ọbula ọ dị aga m agbalị ka ọ di nma.' Ukraine and U20 world cup: South Korea eburula ihe na-esi n'iko mbauwa U20 Ukraine and U20 world cup: South Korea eburula ihe na-esi n'iko mbaụwa U20 Ukraine efeela South Korea aka n'isi were okpu goolu ato maburu iko mbauwa ndi ntorobia. Ukraine efeela South Korea aka n'isi were ọkpụ goolu atọ maburu iko mbaụwa ndị ntorobịa. Ukraine vs South Korea Ukraine vs South Korea Ndi egwu boolu mba Ukraine ewerela okpu goolu ato asatara otu merie Saut Korea were maburu iko mbauwa ndi erubeghi afo iri abuo agbara na mba Poland taa bu Satode. Ndị egwu bọọlụ mba Ukraine ewerela ọkpụ goolụ atọ asatara otu merie Saụt Korea were maburu iko mbaụwa ndị erubeghị afọ iri abụọ agbara na mba Poland taa bụ Satọde. Mmeri a biara ka ndi Saut Korea nwetechara penariti n'uzo ututu ya bu egwuregwu na nkeji ise bu nke Lee Kang-in tinyere ha na goolu. Mmeri a bịara ka ndị Saụt Korea nwetechara penariti n'ụzọ ụtụtụ ya bụ egwuregwu na nkeji ise bụ nke Lee Kang-in tinyere ha na goolu. Flying Eagles ejirila ikiriki eze gafee Flying Eagles ejirila ikiriki eze gafee Otu Naijiria alaferela n'asompi AFCON U20 Otu Naịjirịa alaferela n'asọmpi AFCON U20 Mana Ukraine gwara Saut Korea na ha aputaghi egwu onwa mgbe Vladyslav Supriaga sara ya bu goolu na nkeji iri ato na ano. Mana Ukraine gwara Saụt Korea na ha apụtaghị egwu ọnwa mgbe Vladyslav Supriaga sara ya bụ goolu na nkeji iri atọ na anọ. Vladyslav Supriaga kwuru n'ezie na-ejighi ututu ama njo ahia na nkeji iri ise na ato bu mgbe o tinyere goolu nke abuo ya n'onu mpio ndi Saut Korea. Vladyslav Supriaga kwuru n'ezie na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa na nkeji iri ise na atọ bụ mgbe o tinyere goolu nke abụọ ya n'ọnụ mpiọ ndị Saụt Korea. Ndi Korea kpokwara ganigani otutu mgbe mana Ukraine gwara ha na ogologo abughi na nwa m etoola mgbe ha mezuru ya okpu ato site n'aka Giorgi Tsitaishvili na nkeji iri asato na itoolu. Ndị Korea kpọkwara ganịganị ọtụtụ mgbe mana Ukraine gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola mgbe ha mezuru ya ọkpụ atọ site n'aka Giorgi Tsitaishvili na nkeji iri asatọ na itoolu. Uwa a gbaa Saut Korea ghari Uwa a gbaa Saút Korea gharí Uwa gbara Saut Korea ghari mgbe opi ike daara na ngwucha ya bu egwuruegwu. Ụwa gbara Saụt Korea gharị mgbe opi ike daara na ngwụcha ya bụ egwuruegwu. Nke a bu mbu Ukraine na-emetu ya bu iko mbauwa aka ka England buchere ya afo abuo gara aga. Nke a bụ mbụ Ukraine na-emetu ya bụ iko mbaụwa aka ka England buchere ya afọ abụọ gara aga. Akuko ga-amasi gi Akụkọ ga-amasị gị Kedu ihe m biara ime ma obughi ibu Iko AFCON' - Mikel Obi Kedụ ihe m bịara ime ma ọbụghị ibu Iko AFCON' - Mikel Obi "Uloikpe mkpeghari eweliela Chimaroke aka elu ozoAhu choro nhicha' umunwaanyi adighi acho mmekpa ahu. " "Uloikpe mkpegharị eweliela Chimaroke aka elu ọzọAhụ chọrọ nhicha' ụmụnwaanyị adịghị achọ mmekpa ahụ. " "Ha choro ka ha kee ekike di mma " "Ha chọrọ ka ha kee ekike dị mma " "Umunwaanyi Igbo na-eji ejiji di mma oge obula. " "Ụmụnwaanyị Igbo na-eji ejiji dị mma ọge ọbụla. " "Umunwaanyi ala Igbo na-acho umunwoke na-agba mbo " "Ụmụnwaanyị ala Igbo na-achọ ụmụnwoke na-agba mbọ " "Ihe obula nwoke tinyere aka na ya, nwaanyi Igbo ga-akwado ya. " "Ihe ọbụla nwoke tinyere aka na ya, nwaanyị Igbo ga-akwado ya. " "Ha na-acho itinye aka n'oru ogeobula, ha anaghi acho ino nkiti " "Ha na-achọ itinye aka n'ọrụ ogeọbụla, ha anaghị achọ ịnọ nkịtị " "Ihe niile nwaanyi chotara ime, o ga-eme ya ofuma. " "Ihe niile nwaanyị chọtara ime, ọ ga-eme ya ọfụma. " "Akuko ndi ga-amasi gi: " "Akụkọ ndị ga-amasị gị: " "INEC kwenyere n'igwe 'card reader' " "INEC kwenyere n'igwe 'card reader' " "China emela Xi onyeisiala ruo n'onwu " "China emela Xi onyeisiala ruo n'ọnwụ " "Rwanda: Amumaigwe egbuola ndi ulouka " "Rwanda: Amụmaigwe egbuola ndị ụlọụka " "Umuaka Dapchi: Ogu adaala n'etiti Buhari na Jonathan " "Ụmụaka Dapchi: Ọgụ adaala n'etiti Buhari na Jonathan " "Ogu onu adaala n'etiti ndi nke Buhari na Jonathan maka ntoro umuakwukwo Dapchi na mpaghara ugwu nke Naijiria. " "Ọgụ ọnụ adaala n'etiti ndị nke Buhari na Jonathan maka ntọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi na mpaghara ugwu nke Naịjirịa. " "Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndi nwere ogbaghara na Naijiria nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu o gawa Yobe. " "Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. " "Onyeisiala Mohammadu Buhari kwuru na o ka onye buburu onyeisiala n'oge gara aga bu Goodluck Jonathan mma na-ileba anya na ntoro umuaka akwukwo. " "Onyeisiala Mohammadu Buhari kwuru na ọ ka onye bụburu onyeisiala n'oge gara aga bụ Goodluck Jonathan mma na-ileba anya na ntọrọ ụmụaka akwụkwọ. " "O kwuru nke a unyaahu mgbe o mere njem nleta n'obodo Dapchi nke Yobe Steeti, bu ebe atoro umuaka ahu n'onwa gara aga. " "O kwuru nke a ụnyaahụ mgbe o mere njem nleta n'obodo Dapchi nke Yobe Steeti, bụ ebe atọrọ ụmụaka ahụ n'ọnwa gara aga. " "O katoro ochichi Jonathan na nleghara anya umuakwukwo Chibok mgbe atoro ha n'afo 2014,ma kwuo na o bu enweghi uche. " "Ọ katọrọ ọchịchị Jonathan na nleghara anya ụmụakwụkwọ Chibok mgbe atọrọ ha n'afọ 2014,ma kwuo na ọ bụ enweghị uche. " "Ufodu umuakwukwo a bu ndi atoro " "Ụfọdụ ụmụakwụkwọ a bụ ndị atọrọ " "Mana Okwu Buhari a ebutela osisa di icheiche site n'aka otutu ndi mmadu. " "Mana Okwu Buhari a ebutela ọsịsa dị icheiche site n'aka ọtụtụ ndị mmadụ. " "Onye na-ekwuchite onu ndi otu 'Bring Back Our Girls' bu Sesugh Akume ekwuola na onyeisiala agbalighi. " "Onye na-ekwuchite ọnụ ndị otu 'Bring Back Our Girls' bụ Sesugh Akume ekwuola na onyeisiala agbalịghị. " Akume kwuru, 'Obi adighi anyi uto, ihe a bu afo ano atoro umuaka Chibok, ugbua o meela n'obodo Dapchi dika ochichi Buhari na-eme otu njehe Jonathan mere n'oge nke ya. Akume kwuru, 'Obi adịghị anyị ụtọ, ihe a bụ afọ anọ atọrọ ụmụaka Chibok, ugbua o meela n'obodo Dapchi dịka ọchịchị Buhari na-eme otu njehe Jonathan mere n'oge nke ya. O ruola otu onwa atoro umuaka ahu, mana ugbu a ka Goomenti na-aga ebe ahu. O ruola otu ọnwa atọrọ ụmụaka ahụ, mana ugbu a ka Gọọmenti na-aga ebe ahụ. Agbanyighi asi niile ha turu na ha-agbaputala umuaka Dapchi. Agbanyighị asị niile ha tụrụ na ha-agbapụtala ụmụaka Dapchi. Onyeisiala kwere ndi nne na nna umuaka Dapchi na o ga-agbaputa umuaka ahu atoro Onyeisiala kwere ndị nne na nna ụmụaka Dapchi na ọ ga-agbapụta ụmụaka ahụ atọrọ Onye enyemaka puruiche nke Jonathan bu Reno Omokiri kwuru na nwa Buhari bu Yusuf Buhari nwere mgbuchi karia umuaka Dapchi. Onye enyemaka pụrụiche nke Jonathan bụ Reno Omokiri kwuru na nwa Buhari bụ Yusuf Buhari nwere mgbuchi karịa ụmụaka Dapchi. O kwuru na oge atoro umuaka Chibok, Jonathan kporo oku nzuko ndi nchekwa, ebe Buhari kagburu nzuko ndi nchekwa n'oge atoro umuaka Dapchi. O kwuru na oge atọrọ ụmụaka Chibok, Jonathan kpọrọ oku nzukọ ndị nchekwa, ebe Buhari kagburu nzukọ ndị nchekwa n'oge atọrọ ụmụaka Dapchi. O kwukwara n'oge Yusuf Buhari nwere ihe mberede okprouzo na Buhari kagburu njem niile onwere, ma gawa ileta nwa ya n'uloogwu. O kwukwara n'oge Yusuf Buhari nwere ihe mberede okproụzọ na Buhari kagburu njem niile onwere, ma gawa ileta nwa ya n'ụlọọgwụ. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ndi muru umuakwukwo Dapchi wuchiri Abuja Ndị mụrụ ụmụakwụkwọ Dapchi wuchiri Abuja Onye ozo kwuru uche ya bu Femi Fani-Koyede na tuwita ya; Onye ọzọ kwuru uche ya bụ Femi Fani-Koyede na tuwita ya; Onye na-ekwuchitere Jonathan onu bu Reuben Abati kwuru nke ya na tuwita; Onye na-ekwuchitere Jonathan ọnụ bụ Reuben Abati kwuru nke ya na tuwita; Umuafo Naijiria ndi ozo kwuru uche na tuwita; Ụmụafọ Naịjirịa ndị ọzọ kwuru uche na tuwita; Omugwo o bu omenala ga-akwusi n'ala Igbo? Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo? A muo nwa ohuru, e jiri azu, ji mmiri oku, uda na utazi gaa leta nne muru ya. Ya bu ihe a kporo omugwo. A mụọ nwa ọhụrụ, e jiri azụ, ji mmiri ọkụ, ụda na ụtazị gaa leta nne mụrụ ya. Ya bụ ihe a kpọrọ ọmụgwọ. Nwa ohuru na nne ya Nwa ọhụrụ na nne ya Omugwo bu omenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua Ọmụgwọ bụ ọmenaala Igbo bidoro kemgbe gboo nke ka na-eme ruo ugbua Ile omugwo n'omenala Igbo bu oge nne na-abia ileta nwa ya nwaanyi na nwa o muru (nke bu nwa nwa ya). Ile ọmụgwọ n'omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya). Ufodu oge, o buru na nwaanyi enweghizi nne (o buru na nne muru ya anwuola), nwunye nna ya maobu nne di ya ga-abi noro n'ulo ya lee ya omugwo. Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ. Ihe ise masiri umunwaanyi Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Umunwaanyi ewechighala isiowu n'udi ohuru Ụmụnwaanyị ewechighala isiowu n'ụdị ọhụrụ Uru nwaanyi abughi so n'usoekwu Uru nwaanyị abụghị sọ n'ụsọekwu Ihe mere o ji buru nwaanyi na-ele omugwo kama nwoke, bu maka na a na-ewe ya na o bu nwaanyi kacha mara ihe gbasara ya maka na o gabigala onodu ahu n'onwe ya. Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya. Oge omugwo bu oge nne na-akuziri nwa ya nwaanyi ihe niile o ma maka ilekota nwa a muru ohuru. Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ. Ufodu oge, o na-abu nne muru nwa laa, nne di ya abia bido lewe ya omugwo nke ya. Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya. Nwaanyi muru nwa ohuru na-eji ohere omugwo zuru ike ma nne ya na-elekota nwa ya. Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya. Ihe nne na-eme n'omugwo Ihe nne na-eme n'ọmụgwọ Nne ga na-enye nwa ya nwaanyi ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ofuma Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma Nne ga na-esiri ya nri ndi ga-eme ka ahu ya gbakee ofuma Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma Nne ga na-ama ya mmiri oku n'afo na ebe ndi ozo o choro, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahu oku (robb, aboniki) Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n'afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki) Nne ga na-enye nwata ohuru nri, saa akwa ya ma saa ya ahu Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ O ga-adotikwa nwa ohuru ahu, ma hia ya aka n'ahu ofuma Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n'ahụ ọfụma O ga na-ahu na nwa ya no ala n'elu boketi awunyere mmiri oku na nnu na ogwu eji achu nje, nke ga-eme ka obara ojoo nwee ike gbaputa Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n'elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje, nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta O ga na-ekekpa ya afo ka o nwee ike taa ma hara etu ohabu tupu o di ime Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime Nne ga na-agba nwa ya nwaanyi ume maka na ya na onwe ya anoola n'onodu ahu mbu Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n'ọnọdụ ahụ mbụ O ga na-arukwa oru ndi ozo di n'ulo dika ihazi ulo na isi nri ezinaulo na-eri Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n'ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri Uru omugwo bara Uru ọmụgwọ bara Omugwo bu oge nne, nwa ya na nwa nwa ohuru ya na-eji enwe ezigbo mmekorita nke bekee kporo 'bonding'. Maka nke a ka otutu ndi nne na-eji aga ebe obula nwa ha no muo nwa, ma n'ulo maobu na mba ofesi, iga nokoo ihe ruru onwa ato maobu karia. Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa. O ga-akuzikiri nwa ya nwaanyi ihe ubeakwa nwa ya putara, maobu akwa aguru maobu akwa mmekpa ahu. Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ. Nri ekwesiri iri n'omugwo Nri ekwesịrị iri n'ọmụgwọ Nwaanyi a na-ele omugwo nwere nri ndi o na-eri. Ufodu bu iji asuchapu obara kpukoro ya n'afo oge nwa no ya n'ime. Nri ndi a bu ma mkporogwu ma ngwanri di icheiche. Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche. Ofe mmiri uda Ofe mmiri ụda Ji mmiri oku Ji mmiri ọkụ Ofe nsala Ofe nsala Mmiri ogwu etere ete Mmiri ọgwụ etere ete Tii di oku na akamu Tii dị ọkụ na akamụ Nri asuru asu Nri asụrụ asụ Azu okpoo na okporoko Azụ ọkpọọ na okporoko Anu okuko Anụ ọkụkọ Ehuru na ehu Ehuru na ehu Uziza Ụzịza Utazi Ụtazị Nri obula ga-enwe ezigbote ose Nri ọbụla ga-enwe ezigbote ose A na-ekwu na uda na-egbochi afo ime na oria ndi ozo dika agbaikpere A na-ekwu na ụda na-egbochi afọ ime na ọrịa ndị ọzọ dịka agbaikpere Nri nwaanyi ekwesighi iri n'omugwo Nri nwaanyị ekwesịghị iri n'ọmụgwọ Ihe juru oke oyi Ihe juru oke oyi Egwusi, ogbono na ofe obula e ji mmanu e si Egwusi, ọgbọnọ na ofe ọbụla e ji mmanụ e si Ahuekere Ahuekere Nri obula nwere abuba (nwaanyi anaghi eri ya maka na a na-ewe ya na abuba ga-akpuko ya n'afo maobu n'ahu) Nri ọbụla nwere abụba (nwaanyị anaghị eri ya maka na a na-ewe ya na abụba ga-akpụkọ ya n'afọ maọbụ n'ahụ) Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ugwo isi nwaanyi o di mkpa taa? Ụgwọ isi nwaanyị ọ dị mkpa taa? Ihutula nwaanyi gbara aji ka nwoke? Ihụtụla nwaanyị gbara ajị ka nwoke? Ihe ise masiri umunwaanyi Ihe ise masịrị ụmụnwaanyị Kedu ihe bu ebumnuche gi maka igba mkpe? Kedụ ihe bụ ebumnuche gị maka ịgba mkpe? Ngwucha omugwo Ngwụcha ọmụgwọ Omugwo gwu, nne biara omugwo ga-enweta ihe buru ibu. Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu. Ndi o biara ileta ga-azutara ya ihe onyinye di icheiche dika ego, akwa omuma, akpukpoukwu, akpa, ihe nri di icheiche, wee diri gawazie. Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie. A ga-azutara ya akpa nnu na akpa ncha nke o ga-eke ndi agbataobi ya ma o laruo ebe o bi. A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi. Umunwaanyi Ozubulu emeela ngosiputa Ụmụnwaanyị Ozubulu emeela ngosiputa Akuko kwuru na umunwaanyi Ozubulu jiri ejiji ka ndi mkpe gara n'isi ulo ndi uweoji na Amawbia i rio mkpuchi. Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị Ozubulu jiri ejiji ka ndị mkpe gara n'isi ụlọ ndị uweoji na Amawbia ị rịọ mkpuchi. Ndi mmadu bu egbe wakporo ndi uka St. Phillips n'afo gara aga Ndị mmadụ bu egbe wakporo ndị ụka St. Phillips n'afọ gara aga Umu nwaanyi Ozubulu no n'okpuru Ekwusigo na Anambra steeti gara n'ulooru ndi uweojii nke di n'Amawbia i rio ha mkpuchi unya ahu. Ụmụ nwaanyị Ozubulu nọ n'okpuru Ekwusigo na Anambra steeti gara n'ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Amawbia ị rịọ ha mkpuchi ụnya ahụ. Ha mere nke a maka ikpe di n'etiti ndi echere na ha-wakporo ulouka di n'obodo ha n'ubochi 6 ogostu afo gara aga. Ha mere nke a maka ịkpe dị n'etiti ndị echere na ha-wakporo ụlọụka dị n'obodo ha n'ụbọchị 6 ọgọstụ afọ gara aga. Ha si na ndi a na-eyi ndu ha egwu na o bukwa n'ihi nke a ka ha na-acho mkpuchi ndi ga-enye akaebe megide ndi wakporo ha n'ulo ikpe. Ha sị na ndị a na-eyi ndụ ha egwu na ọ bụkwa n'ihi nke a ka ha na-achọ mkpuchi ndị ga-enye akaebe megide ndị wakporo ha n'ụlọ ikpe. Ha bu akwukwo nnukwu gaa-ebe ahu edere 'anyi choro ikpe zuruoke' 'anyi choro mkpuchi ndi uweoji n'uloikpe' Ha bu akwụkwọ nnukwu gaa-ebe ahụ edere 'anyị chọrọ ịkpe zuruoke' 'anyị chọrọ mkpuchi ndị uweoji n'ụlọikpe' Ihe onye akaebe kwuru maka ochu Ozubulu Ihe onye akaebe kwuru maka ọchụ Ozubulu Onu na-ekwuchitere ndi uweoji na Anambra bu Nkiruka Nwode gwara BBC Igbo na-ekwe nti na ihe di umunwaanyi a mkpa bu ka udo were onodu n'obodo ha. Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji na Anambra bụ Nkiruka Nwode gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ihe dị ụmụnwaanyị a mkpa bụ ka udo were ọnọdụ n'obodo ha. Nwode si na umunwaanyi a na-eme ihe a rioro ndi uweoji mkpuchi ka ha na-akwado iga uloikpe maka uchu e gburu n'obodo ha. Nwode sị na ụmụnwaanyị a na-eme ihe a rịọrọ ndị uweoji mkpuchi ka ha na-akwado ịga ụlọikpe maka ụchụ e gburu n'obodo ha. Onyeisi ndi uweoji na Anambra steeti bu Garba Baba Umaru nyere umunwaanyi a nkwado, si ha gaa n'iru. Onyeisi ndị uweoji na Anambra steeti bụ Garba Baba Umaru nyere ụmụnwaanyị a nkwado, sị ha gaa n'iru. Umaru gwara umunwaanyi ahu na 'ebe o bu na m no ebe a, onweghi ihe ga-eme unu, m ga-ahu na unu nwetara ikpe zuruoke'. Umaru gwara ụmụnwaanyị ahụ na 'ebe ọ bụ na m nọ ebe a, ọnweghị ihe ga-eme unu, m ga-ahụ na unu nwetara ikpe zuruoke'. Ihe mere n'Ozubulu Ihe mere n'Ozubulu Ndi bu egbe gara n'ulouka St. Phillips nke usoro Katolik were gbagbuo ndi mmadu ebe ha na-aka uka Ndị bu egbe gara n'ụlọụka St. Phillips nke ụsoro Katolik were gbagbuo ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka Mwakpo a mere chiri ndu mmadu 11 n'ututu Ogostu 6 afo 2017 Mwakpo a mere chịrị ndụ mmadụ 11 n'ụtụtụ Ọgọstụ 6 afọ 2017 Akuko si na o bu esemokwu n'etiti mmadu abuo bi na Mba Saut Afirika butere ihe a. Akụkọ sị na ọ bụ esemokwu n'etiti mmadụ abụọ bi na Mba Saut Afịrịka butere ihe a. Nke a mere ka ndi uweooji nke Mba Naijiria na Saut Afrika bido nyocha n'ime okwu a Nke a mere ka ndị uweooji nke Mba Naịjirịa na Saut Afrịka bido nyocha n'ime okwu a Ndi eboro ebubo na o bu ha kpara nkata ghoro ngiga n'okwu mkpamkpa ahu mere bu: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44 Ndị eboro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44 Okwu a ka no n'uloikpe ebe ndi akaebe jisike na-aputa kwa ubochi Okwu a ka nọ n'ụlọikpe ebe ndị akaebe jisike na-apụta kwa ụbọchị Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Aruziwela ahia Timbershade gbara oku Aruziwela ahịa Timbershade gbara ọkụ Uru omugwo bara n'omenala Igbo Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Egbuola ndiagha Naijiria abuo na Plateau Egbuola ndịagha Naịjirịa abụọ na Plateau Agwa ndi mmadu na-akpasa m maka alughi di na-ewute m' Agwa ndị mmadụ na-akpasa m maka alụghị di na-ewute m' N'ala Igbo, agbogho rue afo iri ato alubeghi di na-enweta mkpali, ikpa oke na nsogbu ndi ozo di iche iche. N'ala Igbo, agbọghọ rue afọ iri atọ alụbeghị di na-enweta mkpalị, ikpa oke na nsogbu ndị ọzọ dị iche iche. Umuagbogho na-eso nwaanyi na-agba akwukwo Ụmụagbọghọ na-eso nwaanyi na-agba akwụkwọ A na-emekpa umuagbogho na-alubeghi di ahu A na-emekpa ụmụagbọghọ na-alụbeghị di ahụ Nkiru (anyi etinyeghi aha nna ya dika anyi siri kwe ya nkwa) di ihe kariri afo iri ato na-aru oru dika onye na-anabata mmadu n'ulooru ha di na Lagos mana o lubeghi di. Nkiru (anyị etinyeghị aha nna ya dịka anyị siri kwe ya nkwa) dị ihe karịrị afọ iri atọ na-arụ ọrụ dịka onye na-anabata mmadụ n'ụlọọrụ ha dị na Lagos mana ọ lubeghị di. Nkiru gwara onye ntaakuko BBC na onodu ya na-ebutere ya mkpari, mmegbu, ikpa oke na ihe obi ojoo n'aka ndi ezinaulo ya na ndiozo. Nkiru gwara onye ntaakụkọ BBC na ọnọdụ ya na-ebutere ya mkparị, mmegbu, ịkpa oke na ihe obi ọjọọ n'aka ndị ezinaụlọ ya na ndịọzọ. Oge ikpeazu m gara ulo, ndi ulo anyi gwara m na m alotazina ulo ma o buru na onweghi nwoke m ji aka lota. Oge ikpeazụ m gara ụlọ, ndị ụlọ anyị gwara m na m alọtazina ụlọ ma o buru na onweghị nwoke m ji aka lọta. O turukwara ariri na nwanne nna ya (nna ya anwuola) anaghi enye ya na nwanne ya nwaanyi oke ruru ha n'ihi na ha alubeghi di. Ọ tụrụkwara arịrị na nwanne nna ya (nna ya anwụọla) anaghị enye ya na nwanne ya nwaanyị oke ruru ha n'ihi na ha alubeghị di. Gee ihe Nkiru kwuru: Gee ihe Nkiru kwuru: Ndi ulo anyi si m ma alotazina ulo ozo ma m ahughi di' Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' N'ala Igbo, ilu di bu ihe e ji agu onye tozuru okenye N'ala Igbo, ịlụ di bụ ihe e ji agụ onye tozuru okenye Dika nchoputa nke onuogugu na ahuike nke a kporo 'National Demographic and Health Survey' na bekee e mere n'afo 2013 siri gosiputa, n'ala Naijiria, umunwaanyi di bido afo 15 rue afo 19 luru di di pasenti 28.2, ebe ndi di afo 35 rue afo 39 luru di di pasenti 89.4. Dịka nchọpụta nke ọnụọgụgụ na ahụike nke a kpọrọ 'National Demographic and Health Survey' na bekee e mere n'afọ 2013 siri gosipụta, n'ala Naijiria, ụmụnwaanyị dị bido afọ 15 rue afọ 19 lụrụ di dị pasentị 28.2, ebe ndị dị afọ 35 rue afọ 39 lụrụ di dị pasentị 89.4. Uru omugwo bara n'omenala Igbo Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Osu a ga-akwusi n'ala Igbo? Osu a ga-akwụsị n'ala Igbo? Nke a na-egosi na ilu di bu omenaala zuru agburu onu n'ala Naijiria. Nke a na-egọsị na ịlụ di bụ omenaala zụrụ agbụrụ ọnụ n'ala Naijiria. Mana o buru na nwaanyi etoruo ogo ilu di ma o lughi, okachasi na mpaghara owuwa-anyanwu Naijiria, a na-elede ya anya, na-emekpakwa ufodu ahu, otumadi ihe ha meputarala na ndu. Mana ọ bụrụ na nwaanyị etoruo ogo ịlụ di ma ọ lughị, ọkachasị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naijiria, a na-elede ya anya, na-emekpakwa ụfọdụ ahụ, ọtụmadị ihe ha mepụtarala na ndụ. Gini na akpata ya? Ginị na akpata ya? Dika ndi okammuta n'ihe gbasara mmekorita mmadu na ibe ya nke a kporo 'sociologists' na bekee siri kowa, ihe na-akpatakari mmegbu maobu mkpagbu umunwaanyi alughi di bu omenaala na enweghi ezi nghota. Dika ndị ọkammụta n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke a kpọrọ 'sociologists' na bekee siri kọwa, ihe na-akpatakarị mmegbu maọbụ mkpagbu ụmụnwaanyị alụghị di bụ omenaala na enweghị ezi nghọta. N'okwu ya, Dr Adedeji Oyenuga bu onye na-akuzi 'Sociology' na Lagos State University, kowara na o bu omenaala nakwa na ufodu ndi nne na nna na-ahu alughi di nwa ha dika ihe na-egosi na ha azughi nwa ha nke oma. N'okwu ya, Dr Adedeji Oyenuga bụ onye na-akụzi 'Sociology' na Lagos State University, kọwara na ọ bụ omenaala nakwa na ụfọdụ ndị nne na nna na-ahụ alụghị di nwa ha dika ihe na-egosi na ha azụghị nwa ha nke ọma. O si na omenaala. O nwere oge nwata na-elekwasi nne na nna ya anya, mana mgbe nwata toro buru okenya noro onwe ya, a na-ele nwanwoke anya ilu nwaanyi ,na-ele nwanwaanyi anya ilu di. o buru na o meghi otu a, o kachasi na o buru nwaanyi, nne na nna ya ga-ewe ya dika na ha akuola afo n'ala n'izulite ya. O si na omenaala. O nwere oge nwata na-elekwasị nne na nna ya anya, mana mgbe nwata toro bụrụ okenya nọrọ onwe ya, a na-ele nwanwoke anya ịlụ nwaanyị ,na-ele nwanwaanyị anya ịlụ dị. ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ kachasị na ọ bụrụ nwaanyị, nne na nna ya ga-ewe ya dịka na ha akụọla afọ n'ala n'ịzụlite ya. Dr Nkechi Emma-Echiegu bu onye nkuzi na Ebonyi State University kwukwara na o bu omenaala. Dr Nkechi Emma-Echiegu bụ onye nkuzi na Ebonyi State University kwukwara na ọ bụ omenaala. N'ala Igbo, o na-abu ajukata onye muru, a juwa onye na-alu. N'ala Igbo, ọ na-abụ ajụkata onye mụrụ, a jụwa onye na-alụ. O gara n'ihu kwuo na o bu omenaala ojoo na a na-akpari maobu emegbu nwagbogho n'ihi alughi di. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ omenaala ọjọọ na a na-akparị maọbụ emegbu nwagbọghọ n'ihi alụghị di. Gee ihe o kwuru n' uju: Gee ihe o kwuru n' uju: Gini na-ebute alughi di n'oge: Gịnị na-ebute alughị di n'oge: Dr Adedeji Oyenuga kwuru na ihe so akpata alughi di n'oge bu nwaanyi igu oke akwukwo nke nwere ike ime ka umunwoke gara ilu ya na-atu ya egwu. Dr Adedeji Oyenuga kwuru na ihe so akpata alụghị di n'oge bụ nwaanyị ịgụ oke akwụkwọ nke nwere ike ime ka ụmụnwoke gara ịlụ ya na-atu ya egwu. Ozo bu na umunwaanyi kariri umunwoke n'onuogugu. O kwukwara na umunwoke na-ahapukari ebe a muru ha ga mba tere aka karia umunwaanyi nke mere na ilu onye ya na ya tokoro na-ara ahu. Ọzọ bụ na umunwaanyi kariri ụmụnwoke n'ọnụọgụgụ. O kwukwara na ụmụnwoke na-ahapụkarị ebe a mụrụ ha ga mba tere aka karịa ụmụnwaanyị nke mere na ịlụ onye ya na ya tokọrọ na-ara ahụ. Ihe ikpagbu agbogho alubeghi di na-ebute Ihe ịkpagbu agbọghọ alụbeghị di na-ebute Dika okachamara Oyenuga siri kwuo, oke megide nwaanyi alubeghi di na-ebute otutu ihe dika oke mmanya, inu anwuruike, onwu ike , oke nchekasi nke ndi bekee kporo,'depression', nke nwere ike ibute onwu ike, ikwu udo. Dịka ọkachamara Oyenuga siri kwuo, oke megide nwaanyi alubeghị di na-ebute otutu ihe dịka oke mmanya, ịṅụ anwụrụike, ọnwụ ike , oke nchekasị nke ndị bekee kpọrọ,'depression', nke nwere ike ibute ọnwụ ike, ịkwụ ụdọ. Echiegu kwuru na o nwere ike ibute odachi di iche iche gunyere oke echiche, agwa ojoo, ilu ajo di, mkpafu na onwu ike. Echiegu kwuru na o nwere ike ibute ọdachi dị iche iche gunyere oke echiche, agwa ọjọọ, ịlụ ajọ di, mkpafu na ọnwụ ike. Ha kwuru na inwe nghota ga-enye aka i kwusi omenaala ojoo nke na-eme ka a na-ahuta nwaanyi alubeghi di dika onye enweghi iru o bara. Ha kwuru na ịnwe nghọta ga-enye aka ị kwụsị omenaala ọjọọ nke na-eme ka a na-ahụta nwaanyị alụbeghị di dịka onye enweghị iru ọ bara. N'Oklahoma, otu nwaanyi ga-aga mkporo maka ilu nwa ya N'Oklahoma, otu nwaanyị ga-aga mkpọrọ maka ịlụ nwa ya A tuola otu nne nwaanyi mkporo afo abuo maka ilu nwa ya nwaanyi n' Oklahoma di na mba Amerika. A tụọla otu nne nwaanyị mkpọrọ afọ abụọ maka ịlụ nwa ya nwaanyị n' Oklahoma dị na mba Amerịka. Patricia Ann Spann na nwa ya,Misty Dawn Spann Patricia Ann Spann na nwa ya,Misty Dawn Spann Nwaanyi a luburu nwa ya nwoke Nwaanyị a lụbụrụ nwa ya nwoke Patricia Ann Spann, onye gbara afo iri ano na ise kwetara na ya na nwa ya nwaanyi bu Misty Velvet Dawn Spann di afo iri abuo na isii, gbara akwukwo ma nwe mmekorita ndi bu obara ya. Patricia Ann Spann, onye gbara afọ iri anọ na ise kwetara na ya na nwa ya nwaanyị bụ Misty Velvet Dawn Spann dị afọ iri abuo na isii, gbara akwụkwọ ma nwe mmekọrịta ndị bụ ọbara ya. A nara nwaanyi a umu ya ma ha biakoritara onu ozo n'afo 2014. A nara nwaanyị a ụmụ ya ma ha bịakọrịtara ọnụ ọzọ n'afọ 2014. Ha luru onwe ha oge anabatara n'iwu nwaanyi ilu nwanyi maobu nwoke ilu nwoke ibe ya na mpaghara ahu. Ha lụrụ onwe ha oge anabatara n'iwu nwaanyị ịlụ nwanyị maọbụ nwoke ịlụ nwoke ibe ya na mpaghara ahụ. Ndi nyocha choputara na Patricia Ann Spann luburu nwa ya nwoke mgbe nke ahu di afo iri na asato, ebe nwata nwoke agbu bibiri njiko ahu n'afo 2010. Ndị nyocha chọpụtara na Patricia Ann Spann lụburu nwa ya nwoke mgbe nke ahụ dị afọ iri na asatọ, ebe nwata nwoke agbụ bibiri njikọ ahụ n'afọ 2010. Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: Onye bubu ukochukwu Katolic agbala akwukwo Onye bụbu ụkọchụkwụ Katolic agbala akwụkwọ Ndi ulo anyi si m ma alotazina ulo ozo ma m ahughi di' Ndị ụlọ anyị sị m ma alọtazina ụlọ ọzọ ma m ahụghị di' Nwa Dangote agbala akwukwo na Kano Nwa Dangote agbala akwụkwọ na Kanọ O bu ngalaba na-ahu maka nleta choputara maka nwaanyi ahu na nwa ya oge ha jere nleta n'ulo ha. Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka nleta chọpụtara maka nwaanyị ahụ na nwa ya oge ha jere nleta n'ụlọ ha. Dika akwukwo akuko siri kwuo, Misty Spann bibiri njiko ya na nne ya n'onwa Octoba afo gara aga ka nwechara ndorita uka na nne ya jiri aghugho duba ya na njiko ahu. Dịka akwụkwọ akụkọ siri kwuo, Misty Spann bibiri njikọ ya na nne ya n'ọnwa Ọctoba afọ gara aga ka nwechara ndọrịta ụka na nne ya jịrị aghụghọ duba ya na njikọ ahụ. Misty Spann kwuru na nne ya turu ya asi na ya na 'okaiwu ato kpara ndi nyere ya ndumodu ya ga n'ihu na nsogbu adighi na njiko ahu'. Misty Spann kwuru na nne ya tụrụ ya asị na ya na 'ọkaiwu atọ kpara ndị nyere ya ndụmọdụ ya ga n'ihu na nsọgbụ adịghị na njịkọ ahụ'. Patricia Ann Spann kwuru na ya kwenyere na njiko ha emegideghi iwu n'ihi na edebaghi aha ya n'akwukwo omumu nwa ya nwaanyi dika nne muru ya ebe ha zutere onwe ha afo abuo tupu ha ejiko aka. Patricia Ann Spann kwuru na ya kwenyere na njikọ ha emegideghị iwu n'ihi na edebaghị aha ya n'akwụkwọ ọmụmụ nwa ya nwaanyị dịka nne mụrụ ya ebe ha zutere onwe ha afọ abụọ tupu ha ejikọ aka. Misty Spann kwetara na ya mebiri iwu megidere mmekorita ndi bu obara. E nyere ya afo iri maka nyocha na nleta na aka ochamara ihe gbasara ako na uche. Misty Spann kwetara na ya mebiri iwu megidere mmekọrịta ndị bụ ọbara. E nyere ya afọ iri maka nyocha na nleta na aka ọchamara ihe gbasara akọ na uche. Ebe nne ya bu Patricia ga-atukwasi nyocha afo asato n'elu mkporo a turu ya. A ga tinyekwa aha ya n'akwukwu dika onye metoro mmadu ma o puta na nga. Ebe nne ya bụ Patricia ga-atukwasị nyocha afọ asatọ n'elu mkpọrọ a tụrụ ya. A ga tinyekwa aha ya n'akwụkwụ dịka onye metọrọ mmadụ ma ọ pụta na nga. N' iwu di na mpaghara Oklahoma, mmadu ilu obara ya bu mmeto obara ma ha enwere maobu na ha enweghi mmekorita ahu obula. N' iwu dị na mpaghara Oklahoma, mmadụ ịlụ ọbara ya bụ mmetọ ọbara ma ha enwere maọbụ na ha enweghị mmekọrịta ahụ ọbụla. Nri ndi Igbo: Ihe i na-amaghi maka ukwa i na-eri Nri ndị Igbo: Ihe ị na-amaghị maka ụkwa ị na-eri Ukwa bu otu nri a na-ejighi egwu egwu n’ala Igbo, o bukwa otu njirimara ndi Igbo. Ụkwa bụ otu nri a na-ejighị egwu egwu n’ala Igbo, ọ bụkwa otu njirimara ndị Igbo. Ukwa Ụkwa A na-ahapu ukwa ka o ree ure tupu ewere mkpuru ya A na-ahapụ ụkwa ka o ree ure tupu ewere mkpụrụ ya Otutu ndi Igbo ma ukwa ma na ha amaghi etu esi emeputa ukwa tupu o buru ihe a na-eri eri. Ọtụtụ ndị Igbo ma ụkwa ma na ha amaghị etu esi emepụta ụkwa tupu ọ bụrụ ihe a na-eri eri. Ukwa nwere osisi nke na-amiputa mkpuru uyoko buru ibu nke Bekee na-akpo 'breadfruit'. Azu mkpuru uyoko ya na-acha akwukwondu akwukwondu, ebe mkpuru mkpuru di ya n'ime na-emeputa ihe anyi na-akpo ukwa. Ụkwa nwere osisi nke na-amịpụta mkpụrụ ụyọkọ buru ibu nke Bekee na-akpọ 'breadfruit'. Azụ mkpụrụ ụyọkọ ya na-acha akwụkwọndụ akwụkwọndụ, ebe mkpụrụ mkpụrụ dị ya n'ime na-emepụta ihe anyị na-akpọ ụkwa. Uyoko ukwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapu ya ka o ree ure tupu a kuwaa ya ma weputa ukwa nke a na-esi esi. Ya mere ndi Igbo ji asi na 'ukwa ruo oge ya o daa'. Ụyọkọ ụkwa chaa, o si n'elu osisi ya daa n'ala, a hapụ ya ka ọ ree ure tupu a kụwaa ya ma wepụta ụkwa nke a na-esi esi. Ya mere ndị Igbo ji asị na 'ụkwa ruo oge ya ọ daa'. Tupu e rie ukwa, o ga-agabiga uzo di icheiche dika: Tupu e rie ụkwa, ọ ga-agabiga ụzọ dị icheiche dịka: Isi ya esi Isi ya esi Ighe ya eghe Ighe ya eghe Maobu ihu ya n'oku Maọbụ ịhụ ya n'ọkụ Ngwa nri eji esi ya Ngwa nri eji esi ya Ukwa Ụkwa Mmanu nri Mmanụ nri Ufodu na-etinyekwa yabasi, maggi nakwa isha Ụfọdụ na-etinyekwa yabasị, maggị nakwa ịsha Ufodu na-etinye azu okpoo ebe ufodu na-etinye akwukwo nri Ụfọdụ na-etinye azụ ọkpọọ ebe ụfọdụ na-etinye akwụkwọ nri Ufodu na-etinyekwa mkpuru oka Ụfọdụ na-etinyekwa mkpụrụ ọka Ufodu na-etinyekwa ogiri Ụfọdụ na-etinyekwa ogiri Ukwa ruo oge ya o daa Ụkwa ruo oge ya ọ daa Etu esi esi ya Etu esi esi ya Ihe ndi a ka i ga-eme tupu isie ukwa gi: Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu isie ụkwa gị: Saa ukwa gi mmiri ofuma iji hu na aja maobu kirikiri okwute adighi ya n'ime. Saa ụkwa gị mmiri ọfụma iji hụ na aja maọbụ kịrịkịrị okwute adịghị ya n'ime. Wunye ya n'ime ite tumadu nke bekee kporo 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ofuma Wunye ya n'ime ite tụmadụ nke bekee kpọrọ 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ọfụma Ufodu na-etinye akanwu maobu ngo iji mee ka o dee ma ghee osiso Ụfọdụ na-etinye akanwụ maọbụ ngọ iji mee ka o dee ma ghee ọsịsọ O ghewe nakwa mmiri di n'ime ya tawa, tinye ya ose akworo akwo, mmanu nri na nnu O ghewe nakwa mmiri dị n'ime ya tawa, tinye ya ose akwọrọ akwọ, mmanụ nri na nnu Hapu ya ka ya na ngwa nri ndi i tinyere n'ime ya sukota onu Hapụ ya ka ya na ngwa nri ndị ị tinyere n'ime ya sụkọta ọnụ Kpagharia ya ma hapuzia ya ka o noro n'oku dee ede ma ghee ofuma Kpagharịa ya ma hapụzịa ya ka ọ nọrọ n'ọkụ dee ede ma ghee ọfụma Ukwa bu otu nri nwere uto nke ya i ga-erinwu ma i tinyere maobu itinyeghi ngwanri obula Ụkwa bụ otu nri nwere ụtọ nke ya ị ga-erinwu ma ị tinyere maọbụ itinyeghị ngwanri ọbụla Etu esi eri ya Etu esi eri ya A bia n'ufodu obodo dika Urualla di n'Imo steeti, ha anaghi azapu mmiri e ji sie ukwa ha. Ha na-anu mmiri ya iche ma riekwa ukwa ha iche. A bịa n'ụfọdụ obodo dịka Urualla dị n'Imo steeti, ha anaghị azapụ mmiri e ji sie ụkwa ha. Ha na-aṅụ mmiri ya iche ma riekwa ụkwa ha iche. Ufodu anaghi etinye mmanu nri n'ime n'ukwa ha, ebe ufodu na-ahapu mmiri ukwa n'ime ya nke bu na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri. Ụfọdụ anaghị etinye mmanụ nri n'ime n'ụkwa ha, ebe ụfọdụ na-ahapụ mmiri ụkwa n'ime ya nke bụ na ha kuru ya ha ekuru ya na mmiri. A na-eghekwa mkpuru ukwa eghe, jiri aki etiri eti maobu aki bekee taa ya. A na-eghekwa mkpụrụ ụkwa eghe, jiri akị etiri eti maọbụ akị bekee taa ya. Otutu ndi mmadu na-eji ukwa eghere eghe ataghari onu Ọtụtụ ndị mmadụ na-eji ụkwa eghere eghe atagharị ọnụ Etu esi echekwa ukwa Etu esi echekwa ụkwa A na-agba ukwa n'anwu ka o kpoo tupu a gbaa ya n'akpa maka ndi ga-azuta ya iji aga ala bekee. A na-agba ụkwa n'anwụ ka ọ kpọọ tupu a gbaa ya n'akpa maka ndị ga-azụta ya iji aga ala bekee. Tupu i sie nke kporo akpo, banye ya na mmiri site n'abali ruo mgbe chi foro n'ututu. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ofuma ma ghee osiso mgbe i ga-esi ya. Tupu ị sie nke kpọrọ akpọ, banye ya na mmiri site n'abalị ruo mgbe chi foro n'ụtụtụ. Nke a ga-eme ka o nwee ike dee ọfụma ma ghee ọsịsọ mgbe ị ga-esi ya. Ihe o na-enye n'ahu Ihe ọ na-enye n'ahụ Nchoputa ndi okachamara sayensi choputara gosiri na ukwa nwere otutu ihe ndi di mma n'ahu, dika riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforus. O nwekwara potassiom, kopa, iron, magniziom, kalshiom, zinki, manganeezi, selenium nakwa fosforus na vitamin C. Nchọpụta ndị ọkachamara sayensị chọpụtara gosiri na ụkwa nwere ọtụtụ ihe ndị dị mma n'ahụ, dịka riboflavin, iron, niacin, thiamin, iron na fosforụs. O nwekwara potassịọm, kọpa, iron, magnizịọm, kalshịọm, zịnkị, manganeezi, selenịụm nakwa fosforụs na vitamin C. O di mma maka mkpuru obi mmadu. Ufodu na-eji akwukwo osisi ya asacha isi maka o na-egbu igu isi nke bekee kporo dandruff, na-akwusikwa ndapusi ntutu. Ọ dị mma maka mkpụrụ obi mmadụ. Ụfọdụ na-eji akwụkwọ osisi ya asacha isi maka ọ na-egbu igu isi nke bekee kpọrọ dandruff, na-akwụsịkwa ndapụsị ntutu. O nwekwara obere abuba kpukoro onu nke bekee kporo saturated fats, kolesterol nakwa sodiom. O nwekwara obere abụba kpụkọrọ ọnụ nke bekee kpọrọ saturated fats, kọlesterọl nakwa sodịọm. Ufodu na-anu mmiri ukwa iche ebe ufodu na-eri ya na mmiri ya Ụfọdụ na-aṅụ mmiri ụkwa iche ebe ụfọdụ na-eri ya na mmiri ya Ihe ndi ozo eji ya eme i na-amaghi Ihe ndị ọzọ eji ya eme ị na-amaghị A na-etinye ukwa n'ime ufodu mmanu na-aba n'anya iji nye ya uto (flavour) A na-etinye ụkwa n'ime ụfọdụ mmanụ na-aba n'anya iji nye ya ụtọ (flavour) A na-akwo mkpuru ukwa akwo jiri ya mee ihe bekee kporo flour A na-akwọ mkpụrụ ụkwa akwọ jiri ya mee ihe bekee kpọrọ flour A na-apiputakwa ya mmanu A na-apịpụtakwa ya mmanụ Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: O na-akpotu n'Enugwu maka nleta Fayose mere ebe ahu Ọ na-akpotu n'Enugwu maka nleta Fayose mere ebe ahụ Anyi ga-akpupu goomenti n'ulo ikpe - ICSC Anyị ga-akpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe - ICSC Uru omugwo bara n'omenala Igbo Uru ọmụgwọ bara n'omenala Igbo Anwulu na oke isi achuola ndi mmadu oso Anwụlụ na oke isi achụọla ndị mmadụ ọsọ Onye bibu nso ebe a na-ekpofu ahihia na otu dokita kwuru na udi ebe ahu na-amuputa oria di iche iche. Onye bibu nsọ ebe a na-ekpofu ahịhịa na otu dọkịta kwuru na ụdị ebe ahụ na-amụpụta ọrịa dị iche iche. Ebe ha na-etufu ahihia Ebe ha na-etufu ahịhịa Awulu si ebe a ana-etufu ahihia na-ebute nnukwu oria Awụlụ si ebe a ana-etufu ahịhịa na-ebute nnukwu ọrịa Ndi biri na mpaghara Ikosi, Isheri ma o bu Ketu na Lagos steeti na-anu ajo isi si n'ebe ndi goomenti na-aga itufu ahihia a kporo Olososun dumpsite n'Ojota. Ndị bịrị na mpaghara Ikosi, Isheri ma ọ bụ Ketu na Lagos steetị na-aṅụ ajọ ịsị si n'ebe ndị gọọmentị na-aga itufu ahịhịa a kpọrọ Olososun dumpsite n'Ojota. Enugu Steeti nwere nke a ha n'okpokoro uzo awara awara si Enugwu ga Port Harcourt. Enugu Steeti nwere nke a ha n'okpokoro ụzọ awara awara si Enugwu ga Port Harcourt. Ajo isi n'aputa n'ebe ndi a ka nku nke nke na Lagos, ufodu ndi bi n'ebe a akwapugo n'ihi oke isi. Ajọ isi n'apụta n'ebe ndị a ka nkụ nke nke na Lagos, ụfọdụ ndị bị n'ebe a akwapugo n'ihi oke isi. Na Lagos, akuko kwuru na otu nwata nwuru makana onweghi ike iku ume n'ihi na anwulu si ebe a juputara ebe niile. Na Lagos, akụkọ kwuru na otu nwata nwụrụ makana onweghị ike iku ume n'ihi na anwụlụ sị ebe a juputara ebe niile. Maka ihe a, Govano Lagos bu Akinwunmi Ambode emechiela ebe a ana-atufu ahihia. Maka ihe a, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode emechiela ebe a ana-atufu ahịhịa. Goomenti na ndi obodo na-agba ebe ahihia oku oge obula Gọọmentị na ndị obodo na-agba ebe ahịhịa okụ oge ọbụla Ihe ndi mmadu na-ekwu Ihe ndị mmadụ na-ekwu Mana oke isi ahu ka dikwa nakwa ndi mmadu biri na-ebe a. Mana oke isi ahụ ka dịkwa nakwa ndị mmadụ biri na-ebe a. BBC Igbo kporo otu nwoke akporo Samuel Osaze bi bu ebe a n'elu ekwenti. BBC Igbo kpọrọ otu nwoke akpọrọ Samuel Osaze bị bụ ebe a n'elu ekwentị. O kwuru na awulu na-esi ebe a na-aputa bu ihe na-bute nnukwu oria. O kwuru na awụlụ na-esi ebe a na-apụta bụ ihe na-bute nnukwu ọrịa. Awulu a na-aputa makana goomenti na-agba ebe a oku oge obula. Unyahu mgbe m nsi okporo uzo ikosi na-aga be m, nnukwu awulu juputara ebe niile n'ebe ahihia a Awụlụ a na-apụta makana gọọmentị na-agba ebe a ọkụ oge ọbụla. Ụnyahụ mgbe m nsị okporo ụzọ ịkọsị na-aga be m, nnukwu awụlụ juputara ebe niile n'ebe ahịhịa a N'afo 2013 otu na-ahu maka itufu ahihia na Lagos bu Lagos Waste Management Agency LAWMA kwuru na ahihia Lagos ruru tonnes puku iri na ato N'afọ 2013 otu na-ahu maka ịtufu ahịhịa na Lagos bụ Lagos Waste Management Agency LAWMA kwuru na ahịhịa Lagos ruru tonnes puku iri na atọ Otu dibia bekee, Dkta Ikechukwu Mgbolu kwuru na anwulu si ebe a na-etufu ahihia na-ebute oria di iche iche dika onyunyu na ogbugbo (Cholera), Taifod, iba(malaria) na lasa fiva. Otu dibia bekee, Dkta Ikechukwu Mgbolu kwuru na anwụlụ si ebe a na-etufu ahịhịa na-ebute ọrịa dị iche iche dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (Cholera), Taifọd, ịba(malaria) na lasa fiva. O kwukwara na ndi nwere oria ashima(asthma) anaghi enwe ike ibi nso udi ebe a. O kwukwara na ndị nwere ọrịa ashịma(asthma) anaghị enwe ike ibi nso ụdị ebe a. Mgbolu kwuru:'Nnukwu anwuru a na-ebute oria ngugu elu nke a kporo 'upper respiratory infection' na bekee nihi ajo ikuku kabon monozide di n'ime anwulu.' Mgbolu kwuru:'Nnukwu anwụrụ a na-ebụte ọrịa ngụgụ elu nke a kpọrọ 'upper respiratory infection' na bekee nihi ajọ ikuku kabọn monozide dị n'ime anwụlụ.' Osaze kwuru na isi a a na-ekweghizi edi n'etiti onwa Maachi na Ogusutu afo niile maka oge a bu oge udummiri. Osaze kwuru na isi a a na-ekweghizi edi n'etiti ọnwa Maachị na Ọgụsụtụ afọ niile maka oge a bụ oge udummiri. Ndi biri na Lagos na-etufu ahihia oge obula n'okporo uzo na Lagos Ndị biri na Lagos na-etufu ahịhịa oge ọbụla n'okporo ụzọ na Lagos Osaze kwuru, 'Onweghi obodo ndi mepere anya na-agba ebe a na-etufu ahihia oku ugbua makana ha mara na omume di otu a na-ebute nnukwu oria. Osaze kwuru, 'Onweghị obodo ndị mepere anya na-agba ebe a na-etufu ahịhịa ọkụ ugbua makana ha mara na omume dị otu a na-ebute nnukwu orịa. Goomenti kwesiri izu ihe a akporo incinerator na bekee bu igwe eji agba ahihia oku. Gọọmentị kwesịrị ịzụ ihe a akpọrọ incinerator na bekee bụ igwe eji agba ahịhịa ọkụ. Govano Ambode ekwuola na agaghi na-atufu ahihia obula ebe ahu ozo maka oria di iche iche o na-ebuta. Gọvanọ Ambode ekwuola na agaghị na-atụfu ahịhịa ọbụla ebe ahụ ọzọ maka ọrịa di iche iche ọ na-ebuta. O di zi ndi steeti ndi ozo n'aka ikwu ihe ha ga-eme ebe ntufu ahihia di n'etiti obodo ha. Ọ dị zị ndị steetị ndị ọzọ n'aka ikwu ihe ha ga-eme ebe ntufu ahịhịa dị n'etiti obodo ha. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Ihe Buhari ji kagbuo njem Rwanda Ihe Buhari ji kagbuo njem Rwanda Ndi uloaku a na-ezu umu Naijiria ohi? Ndị ụlọakụ a na-ezu ụmụ Naịjirịa ohi? Ugboala Uber na-akwo onwe ya gburu mmadu na Amerika Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ na Amerịka Otu ugboala Uber na-anya onwe ya kugbulu otu nwaanyi na obodo Tempe di na Arizona, na mba Amerika Otu ụgbọala Uber na-anya onwe ya kụgbulu otu nwaanyị na obodo Tempe dị na Arizona, na mba Amerika Uber Uber Ulooru Uber egosila obi mwute maka nwaanyi ugboala ha gburu Ụlọọrụ Uber egosila obi mwute maka nwaanyị ụgboala ha gburu Uber bu ndi so na emeputa ugboala na anya onwe ya ekwuola na ha akwusila ntule ugbo na-anya onwe ya ka otu ugboala ha kugburu otu nwaanyi di afo 49 na-agbafe okporouzo n'obodo Tempe di na Arizona. Uber bụ ndị so na emepụta ugbọala na anya onwe ya ekwuola na ha akwụsila ntule ụgbọ na-anya onwe ya ka otu ụgbọala ha kụgbụrụ otu nwaanyị dị afọ 49 na-agbafe okporoụzọ n'obodo Tempe dị na Arizona. Dika akuko si were kwuo, ihe odachi a mere ka ulooru Uber kwusi ntule ugbo na-anya onwe ya ahu ha bidoro. Dịka akụkọ si were kwuo, ihe ọdachị a mere ka ụlọọrụ Uber kwụsị ntule ụgbọ na-anya onwe ya ahụ ha bidoro. Onyeisi Uber bu Dara Khosrowshahi kwuru na Twitter na onwu ahu bu ihe 'oke obi mgbawa'. Onyeisi Uber bụ Dara Khosrowshahi kwuru na Twitter na ọnwụ ahụ bụ ihe 'oke obi mgbawa'. Anyi na-eche maka ezinaulo o dachi metutara ma anyi na ndi uweojii na-arukorita iji ghota ka ihe siri mee. Anyị na-eche maka ezinaụlọ ọ dachi metụtara ma anyị na ndị ụweọjịị na-arụkọrịta iji ghọta ka ihe siri mee. Ihe mberede a abughi so so Uber ka o metutara, o ga emetuta mbo a na-agba iji ruputa ugboala na-agba onwe ya maka njem ora mmadu. Ihe mberede a abụghị sọ sọ Uber ka o metụtara, ọ ga emetụta mbọ a na-agba iji rụpụta ụgbọala na-agba onwe ya maka njem ọra mmadụ. Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Anyi ga-akpupu goomenti n'ulo ikpe - ICSC Anyị ga-akpụpụ gọọmentị n'ụlọ ịkpe - ICSC Ndi uloaku a na-ezu umu Naijiria ohi? Ndị ụlọakụ a na-ezu ụmụ Naịjirịa ohi? Putin ga-achi Roshia afo isii ozo Putin ga-achị Rọshịa afọ isii ọzọ Mana ha go ya n'onu otu mgbanwe ego, o ga-eme ka otutu ego a na-etinye n'aguakwukwo na Naijiria jenite.' Mana ha go ya n'ọnụ otu mgbanwe ego, ọ ga-eme ka ọtụtụ ego a na-etinye n'aguakwụkwọ na Naijiria jenite.' N'afo ole na ole gara aga, Naijiria nwere nsogbu mgbanwe ego dika akunauba ya kpuru afo n'ala n'ihi odida onu ahia mmanu agbidi n'ahia mba uwa. N'afọ ole na ole gara aga, Naijiria nwere nsogbu mgbanwe ego dịka akụnaụba ya kpụrụ afọ n'ala n'ihi ọdịda ọnụ ahịa mmanụ agbidi n'ahịa mba ụwa. O bu onodu a mere na, dika Uwaleke siri kwuo, o gaghi adabara Naijiria iso ndummodu IMF nyere. Ọ bụ ọnọdụ a mere na, dịka Uwaleke siri kwuo, ọ gaghị adabara Naijiria iso ndụmmọdụ IMF nyere. Uwaleke kwuru na o buru na Naijiria nwe ya ugbua, na o ga aria ya ahu ikwu ugwo o ji na mba ofesi n'ihi n'o ga a diri ya oke onu. Uwaleke kwuru na ọ bụrụ na Naijiria nwe ya ugbua, na ọ ga arịa ya ahụ ịkwụ ụgwọ o ji na mba ofesi n'ihi n'ọ ga a dịrị ya oke ọnụ. Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: Kedu ihe Naijiria na-erite na CHOGM? Kedu ihe Naịjirịa na-erite na CHOGM? Ndi Naijiria agaghi nzuko n'Amerika? Ndị Naịjirịa agaghị nzụkọ n'Amerịka? Ndi uweojii egbochiela ulo Dino Melaye Ndị uweojii egbochiela ụlọ Dino Melaye World Cancer Day: Etu m si nweta ogwugwo oria kansa - Onye meriri Kansa ara World Cancer Day: Etu m si nweta ọgwụgwọ ọrịa kansa - Onye meriri Kansa ara Gloria Orji bu nwaada Igbo meriri kansa ma di mma, o na-ekwu na ebe o meriri kansa, onyeozo ga-emeri kansa. Gloria Orji bụ nwaada Igbo meriri kansa ma dị mma, o na-ekwu na ebe o meriri kansa, onyeọzọ ga-emeri kansa. Oria kansa bu oria na-eyi uwa niile egwu maka etu o si egbu ndi mmadu. Ọrịa kansa bụ ọrịa na-eyi ụwa niile egwu maka etu o si egbu ndị mmadụ. Nke ka njo bu ndi na-acho ogwugwo na-acho ya mana onwebeghi ogwu eweputara na ya bu ogwugwo ya. Nke ka njọ bụ ndị na-achọ ọgwụgwọ na-achọ ya mana onwebeghi ọgwụ ewepụtara na ya bụ ọgwụgwọ ya. Isiokwu emume ncheta oria Kansa nke afo 2019 bu 'Enwere m ike , i nwere ike' nke putara na anyi niile nwereike iwakpo oria Kansa. Isiokwu emume ncheta ọrịa Kansa nke afọ 2019 bụ 'Enwere m ike , ị nwere ike' nke pụtara na anyị niile nwereike ịwakpo ọrịa Kansa. Mana nwaada Gloria bu onye choputara akpu kansa n'ara ya n'afo 2010, a waa ya ahu, o mee kimo na ihe ndi ozo niile wee merie ya bu oria. Mana nwaada Gloria bụ onye chọpụtara akpụ kansa n'ara ya n'afọ 2010, a waa ya ahụ, o mee kimo na ihe ndị ọzọ niile wee merie ya bụ ọrịa. N'okwu ya , 'Kansa abughi ikpe onwu', ugbua, o na-etinye onu na okwu gbasara umunwaanyi kansa na-aria. N'okwu ya , 'Kansa abụghị ikpe ọnwụ', ugbua, ọ na-etinye ọnụ na okwu gbasara ụmụnwaanyị kansa na-arịa. O gwara BBC Igbo etu o siri merie ya bu oria na-atu uwa niile egwu. Ọ gwara BBC Igbo etu o siri merịe ya bụ ọrịa na-atụ ụwa niile egwu. Ikpe amaala Bill Cosby n'ebubo mwakpo nwaanyi Ikpe amaala Bill Cosby n'ebubo mwakpo nwaanyị Bill Cosby nwere ike i ga mkporo ruru iri ato maka mwakpo nwaanyi n'ike. Bill Cosby nwere ike ị ga mkpọrọ ruru iri atọ maka mwakpo nwaanyị n'ike. Bill Cosby Bill Cosby Bill Cosby bu onye ama ama dika onye okpaochi Bill Cosby bụ onye ama ama dika onye ọkpaọchị Uloikpe n'Amerika ekpebiela na ikpe mara onye okpaochi bu Bill Cosby n'ebubo ato eboro ya dika onye na-awakpo umunwanyi n'ike. Ụlọikpe n'Amerika ekpebiela na ikpe mara onye ọkpaọchị bụ Bill Cosby n'ebubo atọ eboro ya dika onye na-awakpo ụmụnwanyị n'ike. O bu Andrea Constand bubu onye egwuregwu basketboolu na-ekpe Cosby n'uloikpe ka mgbe afo 2004. Ọ bụ Andrea Constand bụbu onye egwuregwu basketbọọlụ na-ekpe Cosby n'ụlọikpe ka mgbe afọ 2004. Kpoputa Nnamdi Kanu ubochi ikpe ya Kpọpụta Nnamdi Kanu ụbọchị ikpe ya Uloikpe enyela iwu ka anwuchie Innoson Ụlọikpe enyela iwu ka anwụchie Innoson Cosby di afo 80, ka na-ago ebubo a, mana mkpebia nwere ike i tinye ya na mkporo ruo afo iri ato. Cosby dị afọ 80, ka na-agọ ebubo a, mana mkpebia nwere ike ị tinye ya na mkpọrọ ruo afọ iri atọ. Nke a bu ugboro abuo Cosby na-azo isi ya n'uloikpe maka ebubo mwakpo umunwaanyi. Nke a bụ ugboro abụọ Cosby na-azọ isi ya n'ulọikpe maka ebụbọ mwakpo ụmụnwaanyị. Bill Cosby bu onye ama ama na ihe onyonyo akporo 'The Cosby Show' na bekee. Bill Cosby bụ onye ama ama na ihe onyonyo akpọrọ 'The Cosby Show' na bekee. Otutu umunwaanyi ka na-ebo Cosby ebubo mwakpo n'ike mana Cosby kwuru na ha niile bu asi. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka na-ebo Cosby ebubo mwakpo n'ike mana Cosby kwuru na ha niile bụ asị. Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: MASSOB - Ebere Buhari na-eme enweghi isi MASSOB - Ebere Buhari na-eme enweghị isi Lee nri di iche iche esi n'akpu emeputa Lee nri di iche iche esi n'akpụ emepụta Codeine, otomegbum Codeine, ọtọmegbum Codeine, otomegbum' bu akuko etu oke inu ogwu ukwara si na-ala ndu ndi na-eto eto na Naijiria n'iyi nke BBC nyochaputara. Codeine, ọtọmegbum' bụ akụkọ etu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara sị na-ala ndụ ndị na-eto eto na Naijiria n'iyi nke BBC nyochapụtara. Codeine, otomegbum' bu akuko etu oke inu ogwu ukwara si na-ala ndu ndi na-eto eto na Naijiria n'iyi. Codeine, ọtọmegbum' bụ akụkọ etu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara sị na-ala ndụ ndị na-eto eto na Naijiria n'iyi. Ndi ntaakuko BBC mere nyocha nzuzo were gbaa n'anwu etu ndi na-emeputa ogwu, ndi na-ere ya siri na-eresi umuaka ogwu n'uzo megidere iwu ala Naijiria. Ndị ntaakụkọ BBC mere nyocha nzuzo were gbaa n'anwụ etu ndị na-emepụta ọgwụ, ndị na-ere ya siri na-eresị ụmụaka ọgwụ n'ụzọ megidere iwu ala Naijiria. Codeine otomegbum: Emzor achuola ndioru Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ Emzor Pharmaceuticals achuola otu onye oru ha maka akuko nchoputa, Codeine Otomegbu' nke BBC mere. Emzor Pharmaceuticals achụọla otu onye ọrụ ha maka akụkọ nchọpụta, Codeine Ọtọmegbu' nke BBC mere. Nwata nwoke na anu ogwu ogwu ukwara,copdeine Nwata nwoke na aṅụ ọgwụ ọgwụ ụkwara,copdeine Akuko na-ekwu na ufodi ndi ndorondoro ochichi na-eke ndi ntorobia ogwu dika ihe onyinye Akụkọ na-ekwu na ụfọdị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye Ulooru na-emeputa ogwu na Naijiria bu, Emzor Pharmaceuticals,achuola otu onyeoru, ma kwusikwa abuo oru n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire okwu ukwara codeine, n'uzo megidere iwu, dika akuko nchoputa nke BBC mere nke gosiri ka ogwu ukwara ahu si ala ndu ndi ntorobia Naijiria n'iyi. Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa bụ, Emzor Pharmaceuticals,achụọla otu onyeọrụ, ma kwụsịkwa abụọ ọrụ n'ike n'ihi aka ha tinyere n'ire ọkwụ ụkwara codeine, n'ụzọ megidere iwu, dịka akụkọ nchọpụta nke BBC mere nke gosiri ka ọgwụ ụkwara ahụ sị ala ndụ ndị ntorobịa Naịjirịa n'iyi. Emzor churu onye otu onye oree ahia ha nke resiri onye ntaakuko BBC ogwu, Emzolyn syrup. Emzor chụrụ onye otu onye ọree ahịa ha nke resiri onye ntaakụkọ BBC ọgwụ, Emzolyn syrup. Ha kwuru nke a na igwe okwu soshal midia ka BBC weputachara ihe onyonyo ha mere n' ubochi Monde abali 30 nke onwa Epreelu. Ha kwuru nke a na igwe okwu soshal midia ka BBC wepụtachara ihe onyonyo ha mere n' ụbọchị Monde abali 30 nke ọnwa Epreelu. N'ime ihe onyonyo ahu zuru otu elekere, e gosiri otu ndi ahia ogwu ndi gunyere otu onye oru Emzor ji uzo azulo na-eresi ndi mmadu ogwu ukwara. N'ime ihe onyonyo ahụ zuru otu elekere, e gosịrị otu ndị ahịa ọgwụ ndị gụnyere otu onye ọrụ Emzor ji ụzọ azụlọ na-eresi ndị mmadụ ọgwụ ụkwara. Iwe na onuma juru ndi biara nkiri ihe onyonyo ahu nke egosiri na Legos unyaahu Iwe na ọnụma juru ndị bịara nkiri ihe onyonyo ahụ nke egosiri na Legos ụnyaahụ Otu onye kwuru na o bu ndi ndorondoro ochichi na-etinye mmanu n'oku a na-agba na Kano dika o kwuru na ha na-eke ndi ntoroobia ogwu a dika ihe onyinye. Otu onye kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-etinye mmanụ n'ọkụ a na-agba na Kano dịka o kwuru na ha na-eke ndị ntoroọbịa ọgwụ a dịka ihe onyinye. Mana ulooru Emzor agoola na ha anaghi ere ogwu n'uzo n'ezighi ezi. Mana ụlọọrụ Emzor agọọla na ha anaghị ere ọgwụ n'ụzọ n'ezighi ezi. Ha kwukwara na ha akwusila ire Emzolyn nwere Codeine rue mgbe ha ga-emecha nyocha n'ime ebubo na ha na-ere ogwu ukwara ha n'uzo akwughi oto. Ha kwukwara na ha akwụsịla ire Emzolyn nwere Codeine rue mgbe ha ga-emecha nyocha n'ime ebubo na ha na-ere ọgwụ ụkwara ha n'ụzọ akwụghị ọtọ. Emzor kwusiburu one oreeahia ha ma meecha chuo ya n'oru. Emzor kwụsịburu one oreeahịa ha ma meecha chụọ ya n'ọrụ. "Emzor Pharmaceuticals bu ulooru na-akwanyere onwe ya ugwu ma na akwuwa aka ya oto. " "Emzor Pharmaceuticals bụ ụlọọrụ na-akwanyere onwe ya ugwu ma na akwụwa aka ya ọtọ. " Ha nwere akwukwo ikike ire ogwu kariri otu nari na iri abuo nke gunyere Emzolyn Codeine n'aka NAFDAC. Ha nwere akwụkwọ ikike ire ọgwụ karịrị otu narị na iri abụọ nke gụnyere Emzolyn Codeine n'aka NAFDAC. Ha gara n'ihu si: A kwusila nkesa Emzolyn Codeine yue mgbe a ga-emecha nyocha zuru oke.' Ha gara n'ihu sị: A kwụsịla nkesa Emzolyn Codeine yue mgbe a ga-emecha nyocha zuru oke.' Na mkparitauka BBC na onyeisi ngalaba n'ahu maka nhazi ozuzu na oru ndi omeeogwu (pharmacists) na Naijiria na mpaghara owuwa-anyanwu bu J.C Okafor nwere, o kwuru si na e nwere iwu na-echekwa ka esi ekesa ogwu ukwara nwere codeine, ma kwuwa n'ulooru obula achoputara na ha na-ekesa ya n'uzo ezighi ezi, a ga-emechi ya. Na mkparịtaụka BBC na onyeisi ngalaba n'ahụ maka nhazi ọzụzụ na ọrụ ndị omeeọgwụ (pharmacists) na Naịjirịa na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ J.C Okafor nwere, o kwuru sị na e nwere iwu na-echekwa ka esi ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine, ma kwụwa n'ụlọọrụ ọbụla achọpụtara na ha na-ekesa ya n'ụzọ ezighị ezi, a ga-emechi ya. Okafor si,'Anyi nwere atumatu etu e ji ekesa ogwu ukwara nwere codeine na Naijiria nke meere na mmadu enweghi ike izu ya na-ejighi akwu onye dokita. Okafor sị,'Anyị nwere atụmatụ etu e ji ekesa ọgwụ ụkwara nwere codeine na Naijiria nke meere na mmadụ enweghị ike ịzụ ya na-ejighị akwụ onye dọkịta. Ulooru obula a choputara dara iwu ahu, anyi na-emechi ya.' Ụlọọrụ ọbụla a chọpụtara dara iwu ahụ, anyị na-emechi ya.' Otutu ndi Najiria no na choal midia na-ata Emzor uta maka aka ha ndi na nsogbu oke inu ogwu ukwara di n'etiti ndi na-eto eto. Otụtụ ndị Najiria nọ na choal midịa na-ata Emzor ụta maka aka ha ndị na nsogbu oke ịṅụ ọgwụ ụkwara dị n'etiti ndị na-eto eto. Otu onye juru ulooru ahu si : Ya mere, o buru na ulooru BBC egosighi nchoputa ahu, ulooru unu agaghi eme ihe o bula iji kwusi oke inu ogwu a n'etiti ndi ntoroobia? Otu onye jụrụ ụlọọrụ ahụ sị : Ya mere, ọ bụrụ na ụlọọrụ BBC egosighị nchopụta ahụ, ụlọọrụ unu agaghị eme ihe ọ bụla iji kwụsị oke ịṅụ ọgwụ a n'etiti ndị ntoroọbịa? O bu na ndi oru unu amaghi ihe ha na-eme? Ọ bụ na ndị ọrụ ụnụ amaghị ihe ha na-eme? Onye ozo, Mairo Mandara, kporo oku ka goomenti machie orire ogwu ukwara nwere codeine. Onye ọzọ, Mairo Mandara, kpọrọ oku ka gọọmenti machie orire ọgwụ ụkwara nwere codeine. Codeine: NAFDAC awakpoola ulooru ano ma kpachie otutu ogwu Codeine: NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ ma kpachie ọtụtụ ọgwụ NAFDAC kwuru na ha ga-agba mbo kwusi ulooru niile na-akwado mmebi ogwu codeine na Naijiria. NAFDAC kwuru na ha ga-agba mbọ kwụsị ụlọọrụ niile na-akwado mmebi ọgwụ codeine na Naịjirịa. Ndi ulooru NAFDAC Ndị ụlọọrụ NAFDAC Oge niile ka NAFDAC na-awakpo ulooru na-emeputa ogwu na Naijiria Oge niile ka NAFDAC na-awakpo ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ na Naịjirịa Ngalaba na-ahu maka nchekwa nri na ogwu na Naijiria nke akporo NAFDAC n'aha ichafu wakporo ulooru ano na-emeputa ogwu na Lagos, Ilorin na Kano. Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ na Naịjirịa nke akpọrọ NAFDAC n'aha ịchafụ wakporo ụlọọrụ anọ na-emepụta ọgwụ na Lagos, Ilorin na Kano. Mwakpo a, na-eso nchoputa BBC mere nke gosiri etu ndi mmadu si emebi ogwu ukwara nwere codeine. Mwakpo a, na-eso nchọpụta BBC mere nke gosiri etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine. NAFDAC kwuru na mwakpo a ha mere, gosiri na ulooru ndi a ka na-emeputa ogwu ukwara nwere codeine kariri onuogugu iwu ala nyere ha ohere imeputa. NAFDAC kwuru na mwakpo a ha mere, gosiri na ụlọọrụ ndị a ka na-emepụta ọgwụ ụkwara nwere codeine karịrị ọnụọgụgụ iwu ala nyere ha ohere imepụta. Mmachi Codeine: Dextromethorphan aga-ebe okwu? Mmachi Codeine: Dextromethorphan aga-ebe okwu? Goomenti amachiela ogwu codeine Gọọmenti amachiela ọgwụ codeine Codeine otomegbum: Emzor achuola ndioru Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ Nwunye onyeisiala etiela mkpu maka codeine Nwunye onyeisiala etiela mkpu maka codeine Onyeisi ulooru NAFDAC bu Mojisola Adeyeye, gwara ndi ntaakuko na ugbua, ha na-enyocha oruaka ndi ulooru ano ahu BBC gosiri n'ihe nkiri ha. Onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Mojisola Adeyeye, gwara ndị ntaakụkọ na ugbua, ha na-enyocha ọrụaka ndị ụlọọrụ anọ ahụ BBC gosiri n'ihe nkiri ha. N'onu okwu ya: 'anyi akpachiela otutu ogwu nwere codeine n'ulooru na-emeputa ogwu n'Ilorin. N'ọnụ okwu ya: 'anyị akpachiela ọtụtụ ọgwụ nwere codeine n'ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ n'Ilorin. Ulooru Bioraj Pharmaceuticals kwuru na ha akwusila onye oru ha bu Junaid Hassan oru n'ike, Emzor kwukwara na ha achuola onye oru ha bu Chukwunonye Madubuike n'oru. Ụlọọrụ Bioraj Pharmaceuticals kwuru na ha akwụsịla ọnye ọrụ ha bụ Junaid Hassan ọrụ n'ike, Emzor kwukwara na ha achụọla onye ọrụ ha bụ Chukwunonye Madubuike n'ọrụ. Ha abuo putara n'ihe onyonyo BBC dika ndi na-eji azu aka na-ere ogwu codeine. Ha abụọ pụtara n'ihe onyonyo BBC dika ndị na-eji azụ aka na-ere ọgwụ codeine. Mana ndi onu na-eru n'okwu na-ekwu na goomenti kwesiri ita ndi ulooru a ahuhu karia nyocha a na-enyocha ha. Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na gọọmenti kwesịrị ịta ndị ụlọọrụ a ahụhụ karịa nyocha a na-enyocha ha. Akuko ndi ozo ga-amasi gi: Akụkọ ndị ọzọ ga-amasi gị: Uzo ano ndi oru ntaakuko si ahushi anya n'oru. Ụzọ anọ ndị ọrụ ntaakụkọ sị ahụshị anya n'ọrụ. Uloikpe ajula ihapu Dino Melaye rue Juunu 11 Ụlọikpe ajụla ịhapụ Dino Melaye rue Juunu 11 Buhari esila njem US ya wuchie Naijiria Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa Onyeisiala Naijiria bu Muhammadu Buhari esila Mba Amerika wuchie Naijiria ka o kwusichara na London. Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari esila Mba Amerika wụchie Naịjirịa ka ọ kwụsịchara na London. Muhammadu Buhari Muhammadu Buhari Buhari na Trump kpara maka ibuso ndi oyi egwu agha Buhari na Trump kpara maka ibuso ndị oyi egwu agha Onyeisiala Naijiria bu Muhammadu Buhari esila njem o gara na mba Amerika i leta onyeisiala Donald Trump nata Naijiria. Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari esila njem ọ gara na mba Amerika ị leta onyeisiala Donald Trump nata Naịjirịa. Ugboelu bu ya turu na ulougboelu onyeisiala nke Nnamdi Azikiwe International Airport,Abuja n'elekere 10 nke abali. Ụgbọelu bụ ya tụrụ na ụlọụgbọelu onyeisiala nke Nnamdi Azikiwe International Airport,Abuja n'elekere 10 nke abali. Ufodu ndi oru goomenti gara i nabata ya. Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gara ị nabata ya. O bu onye na-ekwuchitere onyeisiala onu bu Femi Adesina gwara ndi nta akuko nke a ka ugboelu ahu tuchara n'ala. Ọ bụ onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ bụ Femi Adesina gwara ndị nta akụkọ nke a ka ụgbọelụ ahụ tụchara n'ala. Onyeisiala Buhari ga-aga Amerika echi Onyeisiala Buhari ga-aga Amerịka echi Lee ihe ndi Buhari na Trump kpara Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara Uzo ano Buhari jiri yie Trump Ụzọ anọ Buhari jiri yie Trump Buhari onye hapuru Washington DC ubochi Tuusdee ka ya na Trump nwechara nzuko kwusiri na London. Buhari onye hapụrụ Washington DC ụbọchị Tuusdee ka ya na Trump nwechara nzụkọ kwusiri na London. Onye na-ekwuchitere onyeisiala onu nke ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi bu Garba Shehu,boro ya bu nkwusi nke mberede iji nyocha ugboelu kwuru na o bu maka na ugboelu ndi ukwuu nke onyeisi ji eme njem ka na gabiga ndozi. Onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ nke ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu,boro ya bụ nkwụsị nke mberede iji nyocha ụgbọelu kwuru na ọ bụ maka na ugbọelu ndị ukwuu nke onyeisi ji eme njem ka na gabiga ndozi. O kwukwara na Buhari ji obere ugboelu na-enwechaghi ume i fe ogogo di anya eme ya bu njem, kpatara o jiri kwusi na ala Britain. O kwukwara na Buhari ji obere ugbọelu na-enwechaghi ume ị fe ogogo dị anya eme ya bụ njem, kpatara o jiri kwụsị na ala Britain. Shehu kwuru na nkwusi ahu bu maka igbanye mmanu n'ugboelu ya ma nyocha ugboelu tupu o natawa Naijiria. Shehu kwuru na nkwụsị ahụ bụ maka ịgbanye mmanụ n'ụgbọelụ ya ma nyocha ụgboelu tupu ọ natawa Naịjirịa. O kwuru na o nweghi ihe rijuru afo na bu nkwusi maka na onyeisiala anatawala Naijiria. O kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ na bụ nkwụsị maka na onyeisiala anatawala Naịjiria. Mana lee ihe ndi mmadu na-ekwu na Soshal midia: Mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia: Akuko ndi ga-amasi gi: Akụkọ ndị ga-amasị gị: Naani onuku ga-ekweta na Buhari emela ofuma Naanị onuku ga-ekweta na Buhari emela ọfụma NAFDAC awakpoola ulooru ano maka ogwu codeine NAFDAC awakpoola ụlọọrụ anọ maka ọgwụ codeine I ma na igbu onye choro onwu bu njo na Naijiria? Ị ma na igbu onye chọrọ ọnwụ bụ njọ na Naịjirịa? Onyeisiala Buhari agala London ozo maka njem ahuike Onyeisiala Buhari agala London ọzọ maka njem ahụike Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga ihu dokinta ya onye gwara ya bia maka nleta na ogwugwo ya. Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga ịhụ dọkịnta ya onye gwara ya bịa maka nleta na ọgwụgwọ ya. Buhari Buhari O mebeghi otu izuuka Buhari si Amerika ebe ya na Donald Trump nwere ogbako lota. O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apu taa gawa London ebe o na-anata ogwugwo maka ahu na-aria ya. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-apụ taa gawa London ebe ọ na-anata ọgwụgwọ maka ahụ na-arịa ya. Akwukwo onyenkwuchiteonu onyeisiala bu Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-ano mkpuru ubochi ano na ya bu njem. Akwụkwọ onyenkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu dere kwuru na onyeisiala ga-anọ mkpụrụ ụbọchị anọ na ya bụ njem. O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na igbanye mmanu n'ugboelu ya oge o si mba Amerika alota, ya na dokinta ya mere nzuko. O kwuru na oge onyeisiala gara London maka mmezi na ịgbanye mmanụ n'ụgbọelu ya oge o si mba Amerịka alọta, ya na dọkịnta ya mere nzụkọ. Buhari esila njem US ya wuchie Naijiria Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa Buhari ga-aga njem oru na UK taa Buhari ga-aga njem ọrụ na UK taa Kedu ihe mere Buhari ji bia Legos? Kedụ ihe mere Buhari ji bịa Legọs? O kwuru na dokinta ya gwara ya ka o biaghachi nke onyeisiala kwere ya nkwa na o ga-abia. O kwuru na dọkịnta ya gwara ya ka ọ bịaghachi nke onyeisiala kwere ya nkwa na ọ ga-abịa. Onyeisiala ga-alota ubochi Satode abali iri na abuo onwa a bu Mee. Onyeisiala ga-alọta ụbọchị Satọde abalị iri na abụọ ọnwa a bụ Mee. Shehu kwuru na o lota, o ga-aga leta Jigawa steeti, njem e bughariri maka nzuko ndi APC na wodu. Shehu kwuru na ọ lọta, ọ ga-aga leta Jigawa steeti, njem e bugharịrị maka nzụkọ ndị APC na wọdụ. Njem ahu ga-emezi ubochi Monde 14 na Tuzde 15 onwa a bu Mee. Njem ahụ ga-emezi ụbọchị Monde 14 na Tuzde 15 ọnwa a bụ Mee. Cheta na onyeisiala na-anata ogwugwo na London mana o gwaghi Naijiria aha ihe na-aria ya. Cheta na onyeisiala na-anata ọgwụgwọ na London mana ọ gwaghị Naịjirịa aha ihe na-arịa ya. Akuko ga-amasi gi: Akụkọ ga-amasị gị: Legos: Umunwaanyi di ime 2131 na-aria HIV Legos: Ụmụnwaanyị dị ime 2131 na-arịa HIV Achotala ozu 45 na Gwaska Achọtala ozu 45 na Gwaska Ndigbo agaghi alu agha nwereonwe ozo' Ndigbo agaghị alụ agha nwereonwe ọzọ' Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ulooru ogwu ato na-aru codeine Sweet sweet codeine: Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ atọ na-arụ codeine Nafdac emechiela ulooru ogwu Bioraj, Peace na Emzor maka nkesa ogwu ukwara nwere codeine n'uzo na-akwughi oto. Nafdac emechiela ụlọọrụ ọgwụ Bioraj, Peace na Emzor maka nkesa ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ na-akwụghị ọtọ. Codeine, otomegbum Codeine, ọtọmegbum Otutu ndi ntorobia na-aria isimgbaka na oria di icheiche n'ihi oke inu ogwu ukwara Ọtụtụ ndị ntorobịa na-arịa isimgbaka na ọrịa dị icheiche n'ihi oke ịṅụ ọgwụ ụkwara Ngalaba na-ahazi nlekota nri na mmeputa ogwu bu Nafdac n'aha ichafu emechiela uloru ogwu ato; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ bụ Nafdac n'aha ịchafụ emechiela ụlọrụ ọgwụ atọ; Bioraj Pharmaceutical Limited , Emzor Pharmaceuticals Ind. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bu ulooru a ruru aka n'ihe gbasara ire ogwu ukwara nwere codeine n'uzo megidere iwu. Ltd na Peace Standard Pharmaceutical Limited bụ ụlọọrụ a rụrụ aka n'ihe gbasara ire ọgwụ ụkwara nwere codeine n'ụzọ megidere iwu. BBC weputara akuko so nchoputa nzuzo ha meere nke gbara n'anwu ka ulooru ato a si jiri uzo azu ulo na-eresi ogwu a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dokita nyere akwukwo, nye ndi ntorobia agharaaghara. BBC wepụtara akụkọ so nchọpụta nzuzo ha meere nke gbara n'anwụ ka ụlọọrụ atọ a si jiri ụzọ azụ ụlọ na-eresi ọgwụ a nke e mere n'iwu ka a na-ere naani oge dọkịta nyere akwụkwọ, nye ndị ntorobịa agharaaghara. Codeine,otomegbum Codeine,ọtọmegbum Codeine otomegbum: Emzor achuola ndioru Codeine ọtọmegbum: Emzor achụọla ndịọrụ Goomenti amachiela ogwu codeine Gọọmenti amachiela ọgwụ codeine N'akwukwo ozi onyeisi Nafdac bu Mojisola Adeyeye weputara, mmechi a sotara nchoputa ha mere dika ha gachara n'ulooru ndi ahu. N'akwụkwọ ozi onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye wepụtara, mmechi a sotara nchọpụta ha mere dịka ha gachara n'ụlọọrụ ndị ahụ. "N'ihi e nwetaghi ihe akaebe zuru oke na mbo igbochi iweputa akwukwo kwesiri oge anyi mere nyocha anyi n'ubochi 2 nke onwa Mee, n'ulooru ha di n'Ilorin na Lagos, o di mkpa ka e mechie ulooru mmeputa ahia ulooru ato ndi a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind Ltd . " "N'ihi e nwetaghị ihe akaebe zuru oke na mbọ igbochi iwepụta akwụkwọ kwesịrị oge anyị mere nyocha anyị n'ụbọchị 2 nke ọnwa Mee, n'ụlọọrụ ha dị n'Ịlorin na Lagos, ọ dị mkpa ka e mechie ụlọọrụ mmepụta ahịa ụlọọrụ atọ ndị a - Peace Standard Pharmaceutical Limited ; Bioraj Pharmaceutical Limited na Emzor Pharmaceuticals Ind Ltd . " Nke a bu iji nye ohere maka nchoputa zuru oke. Nke a bụ iji nye ohere maka nchọpụta zuru oke. Nafdac na-eme nyocha ndia maka nchoputa BBC mere gbasara ogwu ahu Nafdac na-eme nyocha ndịa maka nchọpụta BBC mere gbasara ọgwụ ahụ